Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 21
IZU NA-AMALITE NA MACH 21
Abụ nke 47 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 1 ¶10-15, chaatị dị na p. 12 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Job 6-10 (Nkeji 10)
Nke 1: Job 8:1-22 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Mere Chineke Achọghị Ka Anyị Na-efe Ndị Nna Ochie Ofufe —td 15A (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Otú Anyị Ga-esi Eme Ihe Ahụ A Dụrụ Anyị Ọdụ na Matiu 10:16? (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 15: Jiri Baịbụl Na-azaghachi. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 143-144. Mee ihe ngosi abụọ ebe onye nwe ụlọ na-ajụ onye nkwusa ajụjụ mmadụ nwere ike ịjụ n’ókèala unu. N’ihe ngosi nke mbụ, onye nkwusa ahụ ga-aza ihe a jụrụ ya ma ọ gaghị ekwu ebe ihe ọ zara dị na Baịbụl. N’ihe ngosi nke abụọ, ọ ga-ejizi Baịbụl zaa ihe a jụrụ ya. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe mere ihe ngosi nke abụọ ji ka mma.
Nkeji 15: “A Ga-ebido n’Eprel 2 Kesawa Akwụkwọ Ịkpọ Òkù Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs.” Ajụjụ na azịza. Nye onye nkwusa ọ bụla otu akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ ma kwuo ihe ndị dị n’ime ya. Kwuo ndokwa e mere maka ikesa ya n’ókèala unu. Mee ihe ngosi otú a ga-esi nyefee ya.
Abụ nke 109 na Ekpere