Iji Obi Ụtọ Echeta Ihe Mgbapụta Ahụ
1, 2. Olee ihe ndị mere anyị kwesịrị iji jiri obi ụtọ cheta ihe mgbapụta ahụ?
1 Gburugburu ụwa, Ndị Kraịst ga-ezukọ mgbe anyanwụ dasịrị na Saturday, March 22, 2008, iji cheta ọnwụ Jizọs Kraịst n’ihi na Jizọs nyere ha iwu ime otú ahụ. (Luk 22:19; 1 Kọr. 11:23-26) Ihe ga-akpali anyị ime ya bụ na obi dị anyị nnọọ ụtọ maka ihe a rụzuru n’ụbọchị ahụ otu puku afọ na narị afọ itoolu na iri asaa na ise gara aga. Jizọs doro aha Nna ya nsọ ma zaa nnọọ Setan okwu maka ụta ọ tara Jehova site n’ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo mgbe a kpọgburu ya n’elu osisi ịta ahụhụ.—Job 1:11; Ilu 27:11.
2 Ọbara Jizọs wụfuru mere ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị irè, bụ́ nke mere ka o kwe omume ụmụ mmadụ na-ezughị okè ịghọ ụmụ Chineke ma nwee olileanya iso Kraịst chịa n’Alaeze eluigwe. (Jer. 31:31-34; Mak 14:24) Ọzọkwa, Chineke gosiri otú ọ hụruru ụmụ mmadụ n’anya mgbe o nyere Ọkpara ọ hụrụ n’anya ka ọ bụrụ àjà, dị ka Jizọs n’onwe ya kọwaara Nikọdimọs.—Jọn 3:16.
3. Olee uru ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ga-erite?
3 Kpọọ Ndị Ọzọ: Ozi Alaeze Anyị nke January tụrụ aro ka anyị depụta aha ndị anyị ga-akpọ ma jiri ọnụ anyị kpọọ ha. Ị̀ malitela ịkpọ ndị i depụtara aha ha? Ì mewela ndokwa ikere òkè zuru ezu ná mkpọsa ahụ a ga-eme malite na March 1 iji kpọọ ndị mmadụ òkù ịbịa Ncheta Ọnwụ Jizọs? Ndị bịaranụ ga-anụ okwu ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị ga-eme ka ha nwee okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ, bụ́kwa ndị ga-eduga ha ná ndụ ebighị ebi.—Rom 10:17.
4. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs n’oge?
4 Ndị niile ọ ga-ekwe mee kwesịrị ime ndokwa ịbịa n’oge ma nabata ndị zara òkù a pụrụ iche. N’ihi ọtụtụ mmadụ na-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, ọ dị mkpa ka anya ruo anyị ala iji nyere ndị nwere mmasị na ndị na-abịa ọmụmụ ihe mgbe ụfọdụ aka.
5. Olee otú i nwere ike isi kwadebe obi gị maka ncheta ahụ?
5 Kwadebe Obi Gị: Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2008 na 2008 Calendar nwere ndokwa ọgụgụ Baịbụl pụrụ iche maka oge Ncheta Ọnwụ Jizọs malite na March 17. Ịtụle ihe ndị dị mkpa mere n’ụbọchị ndị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa ga-enyere gị aka ịkwadebe obi gị maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. (Ezra 7:10) Iji ekpere tụgharịa uche n’amaokwu Baịbụl ndị a ga-eme ka ị ghọtakwuo ịhụnanya Jehova na Ọkpara ya gosiri n’inye ihe mgbapụta ahụ.—Ọma 143:5.
6. Olee otú anyị ikele Chineke maka ihe mgbapụta ahụ ga-esi emetụta ndị ọzọ?
6 Ka oge Ncheta Ọnwụ Jizọs na-eru nso, ka anyị jiri nlezianya kwadebe onwe anyị na ndị ọzọ maka oge a pụrụ iche. Iji obi ụtọ na-echeta ihe mgbapụta ahụ ga-ewusi mmekọrịta anyị na Jehova na Ọkpara ya ike. (2 Kọr. 5:14, 15) Ọ ga-akpalikwa anyị iṅomi ha n’inwe ịhụnanya sitere n’obi maka ndị ọzọ.—1 Jọn 4:11.