Akwụkwọ Ịkpọ Òkù A Ga-ekesa n’Ụwa Niile Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs!
1. Olee mkpọsa pụrụ iche a ga-eme tupu oge Ncheta Ọnwụ Jizọs eruo?
1 “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19) Iji rube isi n’iwu a Jizọs nyere, ndị na-efe Jehova na ndị nwere mmasị ife ya ga-ezukọta n’abalị iri atọ nke ọnwa Mach afọ 2010 maka icheta ọnwụ Jizọs. Malite n’abalị iri na atọ ruo abalị iri atọ nke ọnwa Mach, a ga-ekesa akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ iche n’ụwa niile maka icheta ọnwụ Jizọs.
2. Olee otú anyị nwere ike isi nyefee akwụkwọ ịkpọ òkù a?
2 Otú A Ga-esi Ekesa Ya: I nwere ike inye onye nwe ụlọ akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ ka o lee ihe e sere n’ihu ya, ma gwazie ya, sị: “N’abalị iri atọ nke ọnwa Mach, ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa ga-ezukọ n’uhuruchi maka icheta ọnwụ Jizọs. Abịara m inye gị na ezinụlọ gị akwụkwọ ịkpọ òkù a ka unu bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. Unu nwekwara ike kpọrọ ndị enyi unu bịa. Biko lekwa oge a ga-amalite ime ya na ebe a ga-anọ eme ya.” Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, i nwere ike gụọrọ ya Luk 22:19, bụ́ ebe Akwụkwọ Nsọ nyere iwu ka anyị na-echeta ọnwụ Jizọs. Ma, buru n’uche na ebe ọ bụ na oge e nyere maka ikesa akwụkwọ ịkpọ òkù a ehighị nne, ọ kacha mma igbu okwu gị nkenke.
3. Olee ndị anyị nwere ike ịkpọ?
3 Ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere ókèala buru ibu, ndị okenye nwere ike ịgwa unu ka unu fanye akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ n’ụlọ ndị na-anọghị n’ụlọ mgbe unu gara na nke ha. Nyefekọta ya na magazin mgbe ọ bụla ọ dabara. Hụkwa na ị kpọrọ ndị ị na-agara nletaghachi, ndị ị na-eduziri ọmụmụ Baịbụl, ndị ọrụ ibe gị, ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị ikwu gị, ndị agbata obi gị, na ndị ọzọ ị maara.
4. Obi ụtọ anyị nwere na Jehova ziteere anyị onye mgbapụta ga-akpali anyị ime gịnị?
4 Jikere Iwepụta Ezigbo Oge Soro Kesaa Ya: Oge icheta ọnwụ Jizọs bụ oge magburu onwe ya iji gakwuo ozi ọma. Ì nwere ike ịhazigharị ihe ndị ị na-eme ka i nwee ike rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka? Ì nwere ụmụaka ma ọ bụ ndị ị na-amụrụ Baịbụl, ndị na-eme nke ọma n’ọgbakọ? Ya bụrụ otú ahụ, gwa ndị okenye ka ha lee ma ndị ọhụrụ a hà ruru eru ịbụ ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim, ka ha nwee ike iso kesaa akwụkwọ ịkpọ òkù a pụrụ iche. Obi ụtọ anyị nwere na Jehova ziteere anyị onye mgbapụta, n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya, ga-akpali anyị ịnọ ya n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, kpaliekwa anyị ime ike anyị niile ịkpọ ọtụtụ ndị òkù.—Jọn 3:16.