Anyị Ga-amalite Ịkpọ Ndị Mmadụ Òkù na Mach 22
N’afọ a, anyị ga-amalite na Satọdee Mach 22 kpọwa ndị mmadụ ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. Ọ ga-adị mma ka ndị nkwusa niile na-apụta ozi ọma n’oge ahụ. Anyị ga na-enyekwa ndị mmadụ magazin ma anyị nyewe ha akwụkwọ ịkpọ òkù na Satọdee ma ọ bụ na Sọnde. Kama ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Eprel, ihe anyị ga-eme bụ ịkpọ ndị mmadụ òkù. Ma, ọ bụrụ na anyị ahụ onye chọrọ ka anyị na ya mụwa ihe, anyị nwere ike malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Onye nlekọta ije ozi nwere ike ikpebi ma otú a ga-esi akpọ ọtụtụ ndị n’ókèala unu ọ̀ bụ ịga n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, ma n’ahịa ma n’ọdụ ụgbọala ma ọ bụkwanụ n’ebe ndị ọzọ. Dee aha ndị ị ga-achọ ịkpọ òkù a n’akwụkwọ ugbu a, ma ndị ikwu gị ma ndị ọrụ unu, ma ụmụ akwụkwọ ibe gị ma ndị ị na-amụrụ ihe. Mach 22 ruo, gaa nye ha akwụkwọ ịkpọ òkù. Anyị nwere nchekwube na ọtụtụ ndị ga-eso anyị cheta ọnwụ Jizọs, bụ́ ihe gosiri na Jehova na Jizọs hụrụ ụmụ mmadụ n’anya.—Jọn 3:16; 15:13.