Kpọọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs
1. Olee mgbe anyị ga-ebido kpọwa ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs? Oleekwa ihe mere oge anyị ga-eji kpọọ ndị mmadụ n’afọ a ji kara oge anyị ji kpọọ ha n’afọ ndị gara aga?
1 Ị manụ na anyị na-akpọ ndị mmadụ kwa afọ ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. N’afọ a, anyị ga-ebido na Fraịdee, Mach 1 kpọwa ha. Anyị ga-echeta ọnwụ Jizọs na Mach 26. Ọ pụtara na oge anyị ga-eji kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ a ga-aka oge anyị ji kpọọ ha n’afọ ndị gara aga. Ọ bụrụ na ọgbakọ anyị nwere ókèala hiri nne, nke a ga-enyere anyị aka ịkpọ ọtụtụ ndị ka ha bịa ya.
2. Olee otú ndị nkwusa ga-esi nweta akwụkwọ ha ga-eji kpọọ ndị mmadụ òkù? Oleekwa otú a ga-esi hụ na e kere akwụkwọ ịkpọ òkù n’ókèala niile ọgbakọ nwere?
2 Ihe Ndị Okenye Ga-eme: Ndị okenye ga-ekwu ihe a ga-eme iji hụ na ndị nkwusa gazuru n’ókèala niile ọgbakọ nwere kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa cheta ọnwụ Jizọs. Ha ga-ekwukwa ma à ga-ahapụ akwụkwọ ịkpọ òkù n’ụlọ ndị a na-ahụghị n’ụlọ. Ọ bụrụ na akwụkwọ ịkpọ òkù ka fọrọ unu n’aka mgbe unu gazurula ókèala ndị unu na-aga ozi ọma ụlọ n’ụlọ, unu nwere ike inye ha ndị unu hụrụ n’ụzọ, n’ahịa, ma ọ bụ n’ọdụ ụgbọala. Onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịhụ na e doweere ndị nkwusa akwụkwọ ịkpọ òkù n’ebe a na-ewere akwụkwọ. Ma, e kwesịghị iwepụta ha niile otu mgbe. A ga-ede ha oge na ebe a ga-anọ eme Ncheta Ọnwụ Jizọs. Anyị bịa ọmụmụ ihe, anyị kwesịrị ịga were naanị ole anyị ga-eji aga ozi ọma n’izu ahụ.
3. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ime mgbe anyị na-agwa ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs?
3 Gịnị Ka Anyị Ga-ekwu? Ọ ga-aka mma ka anyị gbuo okwu anyị nkenke, n’ihi na ọ ga-eme ka anyị kpọọ ọtụtụ ndị ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ị gaa na peeji nke anọ n’Ozi Alaeze a, ị ga-ahụ otú i nwere ike isi nye mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù. Ma, ọ bụghị iwu na ị ga-ekwu ya otú e si dee ya ebe ahụ. Ọ bụrụ na onye anyị gara na nke ya ajụọ anyị ajụjụ, anyị kwesịrị imeda obi zaa ya ajụjụ ahụ, o kwesịghị ịdị anyị oké ngwa ngwa. Anyị gaa ike akwụkwọ ịkpọ òkù ná ngwụcha izu, anyị nwekwara ike inye ndị mmadụ Ụlọ Nche na Teta! Ị manụ na anyị na-amalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa ọ bụla. Ma, ọ bụghị ihe anyị ga-eme na Mach 2. Ihe anyị ga-eke n’ụbọchị ahụ bụ akwụkwọ ịkpọ òkù.
4. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji soro kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs?
4 Anyị na-atụ anya na ọtụtụ ndị ga-eso anyị cheta ọnwụ Jizọs n’afọ a. Okwu a ga-ekwu n’ụbọchị ahụ ga-akọwa onye Jizọs bụ. (1 Kọr. 11:26) Ọ ga-emekwa ka anyị mata uru ọnwụ ya baara anyị. (Rom 6:23) Anyị ga-amatakwa ihe mere anyị kwesịrị iji na-echeta Jizọs. (Jọn 17:3) Ka anyị jiri obi anyị niile soro kee ndị mmadụ akwụkwọ a a ga-eji kpọọ ha ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs.