Ihe I Nwere Ike Ikwu
Otú I Nwere Ike Isi Nye Mmadụ Akwụkwọ Ịkpọ Òkù
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Anyị bịara ịgwa unu maka Ncheta Ọnwụ Jizọs anyị na-enwe kwa afọ n’ụwa niile. Nke afọ a ga-abụ na Mach 26. N’ụbọchị ahụ, a ga-eji Baịbụl kọwaa uru ọnwụ Jizọs nwụrụ baara anyị. O nweghị ụtụ a ga-ana ndị bịara ya. E dere ebe anyị ga-anọ eme ya na oge anyị ga-eme ya ná mpempe akwụkwọ a. Biko, gbalịa ka ị bịa ya.”
Ụlọ Nche Mach 1
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya, “Ụfọdụ ndị na-ajụ anyị otú anỵị si mara na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ n’eziokwu. Ò nwetụla mgbe ị jụrụ ụdị ajụjụ a? [Chere ka ọ zaa. Ya kwuchaa, gị asị ya] O nwere ihe Baịbụl kwuru, nke mere anyị kwesịrị iji mara azịza ajụjụ a. [Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:14.] Ụlọ Nche a kwuru ihe mere anyị ji kwere na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ n’eziokwu.”
Teta! Mach–Eprel
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Taa, ndị mmadụ na-ekwokarị ego akwaga obodo ọzọ. Ma, ì chere na ihe na-adịkarị otú ha si tụọ anya ya ma ha ruo ebe ahụ? [Chere ka ọ zaa. Ya kwuchaa, gị asị] O teela ndị mmadụ gawara biri n’obodo ọzọ. Dị ka ihe atụ, o nwere otu onye Baịbụl gwara anyị na ọ gara biri n’obodo ọzọ. [Gụọ Jenesis 46:5, 6.] O nwere ajụjụ ndị a zara na Teta! a gbasara ịga biri n’obodo ọzọ.” Gosi ya ajụjụ ndị dị ná ngwụcha peeji nke isii.