Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Febụwarị: Ndị nkwusa nwere ike inye ndị mmadụ nke ọ bụla n’ime broshọ ndị a dị peeji 32: Gee Chineke Ntị, Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ma ọ bụ İ Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! Gbalịakwa malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na otu n’ime broshọ ndị a ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Mach na Eprel: Ụlọ Nche na Teta! Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Mee: Jiri traktị ọ bụla unu nwere gaa ozi ọma. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ achọọ ka a mụwara ya Baịbụl, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi gosi ya otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị ejiri broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi.
◼ Anyị ewepụtala ihe ndepụta ọhụrụ a ga-eji na-ekwuzi okwu Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ndị niile ga-ekwu okwu Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ 2013 ga-eji ya kwuo ya. Isiokwu ya bụ: “Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ihe Kraịst Meere Gị.”
◼ Isiokwu okwu ihu ọha pụrụ iche a ga-ekwu n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ 2013 bụ “Onye Nwụọ, nke Ya Ọ̀ Gaala?”