Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 4
IZU NA-AMALITE NA MACH 4
Abụ nke 62 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 6 ¶7-12, igbe dị na peeji nke 73 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Mak 9-12 (Nkeji 10)
Nke 1: Mak 11:19–12:11 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Bụ Mkpụrụ Osisi ahụ A Machibidoro Iwu?—td 26CH (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Onye Raara Onwe Ya Nye Chineke Ji Enwe Obi Ụtọ—Ọrụ 20:35 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Mach. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị a: Anyị gaa inye ndị mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù, olee ihe anyị ga-eji mara ma ànyị ga-enyekwu ha Ụlọ Nche na Teta!? Olee ihe ị ga-ekwu ma inyechaa mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù ma chọọ inye ya Ụlọ Nche na Teta!? N’agbanyeghị na e dere ajụjụ i nwere ike ịjụ onye ị gara na nke ya na amaokwu Baịbụl i nwere ike ịgụrụ ya ma ị chọọ inye ya Ụlọ Nche na Teta!, olee otú i nwere ike isi gbuo okwu gị nkenke? Ị jụchaa ha ajụjụ ndị a, mee ihe ngosi abụọ. Otu ga-abụ otú e nwere ike isi nyekọta mmadụ Ụlọ Nche na akwụkwọ ịkpọ òkù, nke ọzọ abụrụ otú e nwere ike isi nyekọta mmadụ Teta! na akwụkwọ ịkpọ òkù.
Nkeji 10: Rite Uru n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri nkeji ole na ole tụlee isiokwu afọ 2013, bụ́ nke dị na peeji nke 3-4, ya na isiokwu bụ́ “Otú E Si Amụ Akwụkwọ A,” nke dị na peeji nke 5. Gwazie ndị na-ege ntị ka ha kwuo oge ha ji atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị nakwa uru ha riterela. Ná mmechi okwu gị, gwa mmadụ niile ka ha gbaa mbọ na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị kwa ụbọchị.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Abụ nke 119 na Ekpere