Ị̀ Ga-ekwo na Ndị Ọzọ Alawala Gị Alawa?
Ụfọdụ ndị nkwusa nwere oge ha na-eji alakarị ozi. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-ala ma ọ kụọ ihe dị ka elekere iri na abụọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ niile abụghị otu. Otú ihe si dịrị ụfọdụ ndị nkwusa nwere ike ime ka ha na-alakarị ozi ọma n’oge. Ma, ị̀ ga-ekwo na ndị gị na ha so gaa ozi alawala gịnwa alawa? Ọ bụrụkwanụ na ọ bụ ihe ndị nọ n’ọgbakọ unu na-emekarị, ị̀ ga-eso ha? I nwere ike ịnọtụkwu n’ozi ọma ma ndị ọzọ lawa. Ha lawa, i nwere ike iji nkeji ole na ole zie ndị ị hụrụ n’ahịa, n’ọdụ ụgbọala, ma ọ bụkwanụ n’ebe ọzọ ozi ọma. I nwekwara ike ịgara otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ nletaghachi mgbe ị na-ala. Cheta na ọ ga-aba ezigbo uru ma ọ bụrụ na i jiri oge ahụ gaa nletaghachi ma ọ bụkwanụ jiri ya nye ndị mmadụ Ụlọ Nche na Teta! Ọ bụrụ na anyị na-anọtụkwu nkeji ole na ole n’ozi ọma ma ndị ọzọ lawa, anyị ga-eji ohere ahụ na-achụkwuru Chineke “àjà otuto.”—Hib. 13:15.