Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/97 p. 3-6
  • Kwusaa Ozi Ọma ahụ Ebe Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kwusaa Ozi Ọma ahụ Ebe Nile
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Magazin Anyị Mee Ihe n’Ụzọ Kasị Mma
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ụzọ Ọhụrụ E Si Ekwusa Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Otú E Si Eme Nkwusa n’Ógbè Azụmahịa
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Ị Ga-agbali Àmà n’Oge Ị Na-anọghị n’Ozi!
    Ozi Alaeze Anyi—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 6/97 p. 3-6

Kwusaa Ozi Ọma ahụ Ebe Nile

1 Ndị Kraịst oge mbụ kwusara ozi ọma ahụ ebe nile. Ha nụrụ ọkụ n’obi nke ukwuu nke na n’ime afọ 30 nke mbilite n’ọnwụ Jisọs Kraịst, ozi Alaeze ahụ abụrụwo nke “e kwusara n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.”—Kọl. 1:23.

2 Ndị ohu Jehova na-anụ ọkụ n’obi nke taa nwere otu ebumnobi ahụ—iji ozi ọma Alaeze ahụ ruo mmadụ nile o kwere mee. Gịnị pụrụ inyere anyị aka iru ihe mgbaru ọsọ a? Ọtụtụ ndị mmadụ karị na-arụ ọrụ oge nile, ha adịghị anọkebekwa n’ụlọ mgbe anyị kpọtụrụ. Mgbe ha na-adịghị arụ ọrụ, ha pụrụ ịdị na-eme njem, na-aga ahịa, ma ọ bụ na-achụso ụdị ntụrụndụ ụfọdụ. Olee otú e si eji ozi Alaeze ahụ ejekwuru ndị kwesịrị ekwesị so n’ime ha?—Mat. 10:11.

3 A na-ezute ụfọdụ n’ebe ha na-arụ ọrụ. Ọbụna ntakịrị ime obodo dị iche iche nwere ógbè achụmnta ego ebe ọtụtụ ndị mmadụ na-anọkarị n’ụbọchị. N’obodo ukwu ndị buru ibu, a na-agbara ndị na-arụ ọrụ n’ógbè ndị e nwere ụlọ ọrụ mmepụta ihe ma ọ bụ n’ụlọ ọfịs ndị dị oké elu na ndị bi n’ụlọ ndị a na-eche nche n’ụzọ bụ ọkpọka àmà—nke mbụ nye ọtụtụ. Ná ngwụsị izu, a chọpụtawo ụfọdụ ndị e zutere mgbe ha na-ezuru ike n’ogige ntụrụndụ ma ọ bụ n’ebe ntụrụndụ, ma ọ bụ ka ha nọ na-echere n’ebe ndọba ụgbọala ma ọ bụ n’ahịa ịbụ ndị nwere mmasị n’ozi ọma ahụ.

4 Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị nkwusa na-eme mgbalị pụrụ iche ịgba àmà n’ebe ọha na eze na-anọ, n’ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ndị mmadụ. Na mbụ, Ndịàmà ndị a latụrụ azụ ma nwetụ ahụ erughị ala n’ihi ịbụ ndị ime nkwusa n’ọnọdụ ndị a na-enwekarị maara ahụ, dị ka site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Olee otú ọ dị ha ugbu a?

5 “O nyewo ozi m ume ọhụrụ!” ka otu nwanna nwoke nwere ahụmahụ ji oké mmetụta kwuo. Onye ọzọ kwukwasịrị: “Ọ na-eme ka m tụkwasị uche m n’otu ebe.” Onye ọsụ ụzọ meworo okenye karị na-ekwu, sị: “Ọ bụrụwo ihe na-enye ume n’uche, n’anụ ahụ, na n’ụzọ ime mmụọ, . . . m ka na-etokwa.” Otu onye nkwusa kwuru na ya na-ejekwuru ọtụtụ ndị ha na Ndịàmà Jehova na-ekwurịtatụbeghị okwu mbụ ugbu a. Ndị na-eto eto jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ a na-enye ọṅụ. Otu onye ntorobịa kwupụtara echiche ya otú a, sị: “Ọ bụ ihe obi ụtọ n’ihi na ị na-agwa ọtụtụ ndị okwu.” Onye ọzọ na-ekwu, sị: “M na-etinye akwụkwọ karịa mgbe mbụ!” Ihe a nile na-eme n’ókèala a na-arụ ugboro ugboro.

6 Ndị Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị Na-ebute Ụzọ: N’ịmata na “ụwa nke a ka e si ahụ ya anya na-agabiga agabiga,” Society tụrụ aro n’oge na-adịbeghị anya ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-agbanwe usoro ije ozi ubi ha site n’izu ruo n’izu ka e wee nwee ike iji ozi ọma ahụ jekwuru ọtụtụ mmadụ ruo n’ókè o kwere mee. (1 Kọr. 7:31) Ruo ọtụtụ afọ, ndị nlekọta sekit na-ewepụta oge ụtụtụ n’ime izu iji kere òkè n’ọrụ ụlọ n’ụlọ, ebe a na-eji ehihie eme nletaghachi na iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi. N’ógbè ụfọdụ, usoro ihe omume ahụ ka pụkwara ịba uru. N’ebe ndị ọzọ, a pụrụ ịrụzu ihe dị ntakịrị site n’ịrụ ọrụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ụtụtụ ụfọdụ n’ime izu. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị pụrụ ikpebi na ná mmalite ụbọchị ọ ga-adị mma ikere òkè n’ọrụ ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa ma ọ bụ ịgba àmà okporo ámá. Ma ọ bụ ọ pụrụ ime ndokwa ka ìgwè ndị dị nta gbaa àmà n’ụlọ ọfịs ndị dị oké elu, ebe azụmahịa, ebe ndọba ụgbọala, ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ ọha na eze na-anọ. Site ná ndị nkwusa iji oge e nwere mee ihe n’ụzọ dị irè karị maka ozi ubi, a pụrụ ịkpọtụrụ ọtụtụ mmadụ karị.

7 Akụkọ na-egosi na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị nkwusa n’otú aka ahụ anabatawo mgbanwe a nke ọma. Ọtụtụ òtù ndị okenye arịọwo onye nlekọta sekit ka ọ zụọ ndị nkwusa ole na ole n’akụkụ ọrụ ahụ ndị chọrọ nlebara anya n’ọgbakọ. Ọ baworo ndị nkwusa a uru isonyere onye nlekọta na-ejegharị ejegharị ka ọ na-ekere òkè n’otu n’ime ihe omume ndị a. N’aka nke ọzọ, ha enwewo ike ịzụ ndị ọzọ. (2 Tim. 2:2) N’ihi ya, a na-eji ozi ọma ahụ ejekwuru ọtụtụ ndị ugbu a karị.

8 N’ezie, ọ dịghị mkpa ka i chere ka onye nlekọta sekit bịa tupu ị nwalee ụfọdụ n’ime ụzọ ndị ọzọ a nke ime nkwusa. E nwere n’ebe a echiche dịgasị iche iche ị pụrụ ịhụ na ha bara uru n’ókèala unu:

9 Ịgba Àmà Okporo Ámá: ‘Olee ebe ndị a nile gara?’ ka anyị pụrụ iche mgbe ụfọdụ mgbe anyị jere n’ógbè ụlọ obibi ebe ndị mmadụ na-anọghị n’ụlọ n’oge ụtụtụ n’ime izu. A pụrụ ịhụ ụfọdụ ka ha na-eje ozi, ma ọ bụ na-azụ ihe, ma ọ bụ na-aga ahịa. Ị̀ nwalewo ijekwuru ha site n’ịgba àmà okporo ámá? Mgbe e mere ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, akụkụ ozi a pụrụ ịrụpụta nnọọ ihe. Kama iji magazin guzoro otu ebe, ọ kasị mma ijekwuru ndị mmadụ ma malite nkwurịta okwu enyi na enyi. Ọ dịghị mkpa ịgbara onye ọ bụla na-agafenụ àmà. Gwa ndị ọ na-adịghị ọsọ ọsọ okwu, dị ka ndị nọ n’ime ụgbọala a dọbara adọba ma ọ bụ ndị na-echere ụgbọ njem ọha na eze. Na mbụ, ị pụrụ nanị ikele ha ekele enyi ma chere maka nzaghachi. Ọ bụrụ na onye ahụ dị njikere ikwu okwu, jụọ ya echiche ya n’otu isiokwu i chere pụrụ ịmasị ya.

10 Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kpọrọ ndị nkwusa isii ka ha sonyere ya na nwunye ya n’ịgba àmà okporo ámá. Gịnị si na ya pụta? “Anyị nwere ụtụtụ magburu onwe ya!” ka ọ na-akọ. “E nweghị ndị na-anọghị n’ụlọ. E tinyere magazin 80 na ọtụtụ traktị. Anyị nwere ọtụtụ mkparịta ụka na-akpali akpali. Otu n’ime ndị nkwusa ahụ, onye na-ekere òkè nke mbụ ya n’ọrụ okporo ámá jiri oké mmetụta kwuo, sị: ‘Anọwo m n’eziokwu ruo ọtụtụ afọ ma amataghị m ihe nọ na-efunahụ m!’ Ka ọ na-erule ngwụsị izu ahụ, magazin tụkọbara n’ọgbakọ ahụ belatara.”

11 Mgbe ọ na-eleta ọgbakọ na-esonụ, otu onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị nụrụ na ọtụtụ ndị nkwusa ekerewo òkè n’ịgba àmà okporo ámá n’otu isi ụtụtụ ma nwee nanị ntakịrị ihe ịga nke ọma. Otu nwanna nwanyị gwara nanị mmadụ abụọ okwu n’oge ahụ nile e ji gbaa àmà, ebe onye ọ bụla o zutere na-agbaga ọrụ. Onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị tụrụ aro ka ha nile laghachi n’otu okporo ámá ahụ ma oge gatụ n’ụtụtụ. Ha mere otú ahụ, ha nọgidekwara ruo ehihie. Nwanna nwanyị ahụ nwere nanị mkparịta ụka abụọ n’isi ụtụtụ ahụ mere nke ọma karị mgbe ọ laghachiri. O tinyere magazin 31 na broshuọ 15, nweta aha na adres mmadụ asaa, malitekwa ọmụmụ Bible ebe obibi abụọ! Ndị ọzọ so n’ìgwè ahụ rụpụtara ihe ndị yiri ya na-agba ume.

12 Mgbe ị hụrụ onye gosiri mmasị, gbalịa inweta aha, adres, na nọmba telifon onye ahụ. Kama ịjụ ya ihe ndị ahụ ozugbo, ị pụrụ ikwu, sị: “Mkparịta ụka a atọwo m ụtọ. Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla anyị pụrụ isi kwurịtakwuo ya mgbe ọzọ?” Ma ọ bụ jụọ, sị: “Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla m pụrụ isi nweta gị n’ụlọ?” Ọtụtụ ndị e si otú a kpọtụrụ na-anabata nletaghachi. Jide n’aka inwe mpempe akwụkwọ zuru ezu maka iji kpọọ ndị ga-enwe mmasị ịga nzukọ anyị òkù.

13 Ọ bụrụ na ị gwa onye nwere mmasị nke bi n’ókèala e kenyere ọgbakọ ọzọ okwu, i kwesịrị ịgwa ha ka ụmụnna nọ n’ebe ahụ nwee ike isochi mmasị ahụ. Ịgba àmà okporo ámá ọ̀ ga-abụ ụzọ dị irè isi gbasaa ozi ọma ahụ n’ógbè gị? Ọ bụrụ otú ahụ, tụleghachi isiokwu bụ́ “Ịchọta Ndị Nwere Mmasị Site n’Ịgba Àmà Okporo Ámá nke Dị Irè” ná mbipụta Ozi Alaeze Anyị nke July 1994. Mgbe ahụ mee ndokwa ikere òkè n’ịgba àmà okporo ámá n’oge kwesịrị ekwesị n’ụbọchị nke ga-eme ka i nwee ike ijekwuru ọtụtụ mmadụ ruo n’ókè o kwere mee.

14 Ịgba Àmà n’Ụgbọ Njem Ọha na Eze: N’otu ụtụtụ, ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ kpebiri ịgbara ndị na-echere bọs na nso nso otu kọleji dị n’ógbè ha àmà. Ọ bụ ezie na ha nwere mkparịta ụka ndị dị mma, e nwere otu nsogbu. Mgbe nkwurịta okwu ahụ na-aga n’ihu, bọs ga-apụta, na-eweta mkparịta ụka ahụ ná njedebe mberede. Ndị ọsụ ụzọ ahụ gwọtara nsogbu ahụ site n’ịbanye bọs ahụ na ịnọgide na-agbara ndị njem àmà ka ha na-aga n’akụkụ ọzọ nke obodo. Mgbe e ruru n’ebe njedebe, ndị ọsụ ụzọ ahụ ga-esoro bọs ahụ laghachi, na-agba àmà ka ha na-aga. Mgbe e mesịrị ọtụtụ njem uje na ụla, ha gụkọtara ihe nile a rụpụtara site ná mgbalị ha: E tinyere ihe karịrị magazin 200, malitekwa ọmụmụ Bible isii. Ụfọdụ ndị njem ji ọchịchọ obi nye adres na nọmba telifon ha ka e wee nwee ike ileta ha n’ụlọ. N’izu na-esonụ, ndị ọsụ ụzọ ahụ laghachiri n’ebe ahụ bọs na-akwụsị ma gbasoo otu ụzọ ahụ dị ka na mbụ. Ha tinyere magazin 164 ma malite otu ọmụmụ Bible ọzọ. N’otu ebe nkwụsị otu onye njem banyere bọs ahụ ma were nanị otu oche ghere oghe—n’akụkụ otu onye ọsụ ụzọ. O lere nwanna nwoke ahụ anya wee jiri ịmụmụ ọnụ ọchị kwuo, sị: “Ama m na i nwere otu Ụlọ Nche ị ga-enye m.”

15 Ọtụtụ ndị nkwusa na-agba àmà dị irè mgbe ha ji bọs, ụgbọ okporo ígwè, ma ọ bụ ụgbọelu na-eme njem. Olee otú ị pụrụ isi malite mkparịta ụka gị na onye njem nọ gị n’akụkụ? Otu onye nkwusa dị afọ 12 malitere nanị ịgụ Teta! na bọs, na-enwe olileanya ịkpasu ọchịchọ ịmata ihe nke otu nwa agbọghọ dị afọ iri na ụma nọ ya n’akụkụ. Ọ rụrụ ọrụ. Nwa agbọghọ ahụ jụrụ ya ihe ọ na-agụ, onye ntorobịa ahụ zakwara na ya na-agụ banyere ihe ngwọta nke nsogbu ndị na-eto eto na-aghaghị iche ihu. O kwukwasịrị na ya eritewo uru dị ukwuu site n’isiokwu ahụ na ọ pụkwara inyere ya aka. O ji obi ụtọ nara magazin ndị ahụ. Ndị ntorobịa abụọ ọzọ nụchatara mkparịta ụka ha bụ́ ndị kwuru ka e nye ha magazin ndị ahụ. Mgbe ọ nụrụ nke a, onye na-anya bọs ahụ kwụsịrị n’akụkụ ụzọ ma jụọ ihe mere e ji nwee oké mmasị na magazin ndị a. Mgbe ọ chọpụtara, ọ nakwaara ụfọdụ. N’ezie, ihe a nile agaraghị ekwe omume ma a sị na onye nkwusa ahụ na-eto eto enweghị magazin zuru ezu isoro onye ọ bụla gosiri mmasị kerịta!

16 Ịgba Àmà n’Ogige Ntụrụndụ na n’Ebe Ndọba Ụgbọala: Ịgba àmà n’ogige ntụrụndụ na n’ebe ndọba ụgbọala bụ ụzọ magburu onwe ya isi jekwuru ndị mmadụ. Ị̀ nwalewo ịgba àmà n’ebe ndọba ụgbọala nke ebe a na-azụ ahịa? Mgbe nile jiri ntakịrị oge legharịa anya gburugburu gị. Chọọ onye ọ na-adịghị ọsọ ọsọ ma ọ bụ onye nọ na-echere n’ime ụgbọala kwụ otu ebe ma gbalịa ịmalite mkparịta ụka enyi na enyi. Ọ bụrụ na mkparịta ụka ahụ agaa n’ihu, webata ozi Alaeze ahụ. Nwalee ịrụ ọrụ otu otu ma na-enwe onye nkwusa ọzọ nọ gburugburu ebe ahụ. Zere ibu nnukwu akpa buru ibu ma ọ bụ nke na-adọrọ uche aga n’ọrụ gị n’ụzọ ndị ọzọ. Dị akọ. Ọ pụrụ ịkasị mma ịnọ nanị nwa mkpirikpi oge n’otu ebe ndọba ụgbọala mgbe ahụ gafee n’ọzọ. Ọ bụrụ na mmadụ achọghị ka gị na ya nwee mkparịta ụka, jiri nkwanye ùgwù gawara onwe gị ma chọọ onye ọzọ ị ga-ejekwuru. N’iji ụzọ ndị a eme ihe, otu nwanna nwoke tinyere magazin 90 n’otu ọnwa ka ọ na-agba àmà n’ebe ndọba ụgbọala.

17 Ụfọdụ ndị na-aga ogige ntụrụndụ ịga zuru ike; ndị ọzọ na-aga ebe ahụ ịga gwurie egwu ma ọ bụ iso ụmụ ha nọkọọ. N’egbochighị ihe omume ha n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị, mụrụ anya maka ohere iji gbaa àmà. Otu nwanna nwoke malitere mkparịta ụka ya na onye na-elekọta otu ogige ma chọpụta na ọ na-enwe nchegbu banyere ọgwụ ọjọọ na ọdịnihu nke ụmụ ya. A malitere ọmụmụ Bible ebe obibi ma na-amụchi ya anya n’ogige ahụ.

18 Ịgba Àmà n’Ahịa: Mgbe ị na-ekele mmadụ, malite mkparịta ụka ahụ n’olu enyi. Ọ bụrụ na onye na-ege gị ntị azaghachi, jụọ ajụjụ, mgbe ahụ gee ntị nke ọma mgbe ọ na-ekwupụta echiche ya. Nwee mmasị onwe onye n’ihe ọ na-ekwu. Gosi na i ji echiche ya kpọrọ ihe. Ebe o kwere mee, kwenyere ya.

19 Otu nwanna nwanyị sooro otu agadi nwanyị nwee nkwurịta okwu dị ụtọ site n’ikwu otú ihe e ji ebi ndụ si ada ọnụ. Nwanyị ahụ kwetara ngwa ngwa, mkparịta ụka na-akpali akpali sikwa na ya pụta. Nwanna nwanyị ahụ nwere ike inweta aha na adres nwanyị ahụ, e jekwara nletaghachi n’otu izu ahụ.

20 Ịrụ Ọrụ Site n’Ụlọ Ahịa Ruo n’Ụlọ Ahịa: Ọgbakọ ụfọdụ nwere ógbè achụmnta ego dị ka akụkụ ókèala e kenyere ha. Nwanna nwoke na-ahụ maka ókèala ahụ pụrụ ịkwadebe kaadị map pụrụ iche nke akụkụ ebe ndị a nwere ọtụtụ achụmnta ego. Kaadị map ókèala ọ bụla nke ebe ndị e bi ebi ndị batara na ha kwesịrị igosi n’ụzọ doro anya na a gaghị arụ ebe achụmnta ego ndị ahụ dị ka akụkụ nke ókèala ahụ. N’ókèala ndị ọzọ, a pụrụ ịrụkọta ebe achụmnta ego na ebe ndị e bi ebi. Ndị okenye pụrụ ịkpọ ndị nkwusa ruru eru ịrụ ókèala achụmnta ego n’ụzọ chiri anya ka e wee ghara ileghara ọrụ ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa anya.

21 Ọ bụrụ na a kpọrọ gị ikere òkè n’ọrụ a, ị rụtụbeghịkwa ya mbụ, ụzọ dị mma isi ‘nweta obi ike’ bụ ibu ụzọ rụọ ụlọ ahịa ole na ole ndị dị ntakịrị karị; mgbe ahụ, mgbe i nwere obi ike karị, rụọ ndị buru ibu karị. (1 Tesa. 2:2, NW) Mgbe ị na-arụ ọrụ site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa, jie ejiji otú ị ga-esi jie ma ọ bụrụ na ị na-aga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụrụ na o kwe mee, banye n’ụlọ ahịa ahụ mgbe a na-enweghị ndị ahịa nọ na-echere ka e resị ha ihe. Rịọ ka ị gwa manija ma ọ bụ onye ọrụ dị n’aka okwu. Gosi ikpo ọkụ, karịsịakwa, gbuo ya nkenke. Ọ dịghị mkpa ikwu okwu n’ụzọ ịrịọ arịrịọ. Ọtụtụ achụmnta ego na-eburu ndị ahịa n’uche ma na-atụ anya ihe mgbochi ụfọdụ.

22 Mgbe i kelesịrị onye nọ n’ụlọ ahịa, ị pụrụ ikwu nke a: “Ndị ọchụ nta ego nwere usoro ihe omume juru eju nke na anyị adịghị ahụkebe ha n’ụlọ, ya mere anyị bịara ileta gị n’ebe a n’ebe achụmnta ego gị ịhapụrụ gị otu isiokwu na-akpali echiche ịgụ.” Mgbe ahụ kwuo otu ihe ma ọ bụ abụọ banyere magazin ị na-enyefe.

23 Ma ọ bụ ị pụrụ ịnwale nke a mgbe ị na-ejekwuru manija: “Anyị achọpụtawo na ndị ọchụ nta ego na-agbalị ịma nke a na-akọ. Mbipụta kasị ọhụrụ nke Ụlọ Nche (ma ọ bụ Teta!) bu isiokwu na-emetụta anyị nile n’otu n’otu.” Kọwaa ihe ọ bụ, ma mechie site n’ikwu, sị: “Anyị ji n’aka na ị ga-enwe mmasị ịgụ ya.” Mgbe ahụ nyefee ya n’ụtụ a na-enyefekarị ya.

24 Ọ bụrụ na e nwere ndị ọrụ, o yiekwa ihe kwesịrị ekwesị, ị pụrụ ikwukwasị: “Ọ̀ ga-ewute gị ma m nyekwa ndị ọrụ gị otu ihe ọmụma a dị mkpirikpi?” Ọ bụrụ na e nye ikike, cheta na i kwewo nkwa igbu ya nkenke, manija ahụ ga-atụkwa anya ka i mee ihe i kwuru. Ọ bụrụ na onye ọrụ ọ bụla chọrọ ịbanye n’ogologo nkwurịta okwu, ọ ga-akasị mma ịkpọtụrụ ha n’ụlọ ha.

25 N’oge na-adịbeghị anya, ndị nkwusa ole na ole nọ n’otu ntakịrị obodo sonyeere onye nlekọta sekit n’ọrụ ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa. Ụfọdụ n’ime ndị nkwusa ahụ tụrụ ụjọ na mbụ, ebe ha na-arụtụbeghị ọrụ ahụ mbụ; ma ahụ ruru ha ala n’oge na-adịghị anya, ọ malitekwa ịtọ ha ụtọ. N’ihe na-erughị otu hour, ha gwara mmadụ 37 okwu ma tinye magazin 24 na broshuọ anọ. Otu nwanna nwoke kwuru na dị ka ọ na-adịkarị ha agaghị enwe ike ịkpọtụrụ ọtụtụ mmadụ hà otú ahụ n’otu ọnwa nke ọrụ ụlọ n’ụlọ dị ka ha mere mgbe ha na-arụ ọrụ site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa ná mkpirikpi oge ahụ.

26 Imepụta Ohere Ime Nkwusa: Jisọs emeghị ka ịgba àmà ya bụrụ nanị n’ọnọdụ ndị a na-enwekarị. Ọ gbasara ozi ọma ahụ n’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị. (Mat. 9:9; Luk 19:1-10; Jọn 4:6-15) Rịba ama otú ndị nkwusa ụfọdụ si emepụta ohere ime nkwusa.

27 Ụfọdụ na-eme ya omume ha ịgbara ndị mụrụ ụmụ àmà bụ́ ndị na-echere ụmụ ha na nso nso ọnụ ụzọ mbata ụlọ akwụkwọ. Ebe ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ na-erute ihe dị ka minit 20 tupu oge eruo, oge dị iji soro ha nwee mkparịta ụka na-akpali akpali n’otu isiokwu Akwụkwọ Nsọ.

28 Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ na-amụ anya ijekwuru ndị pụrụ inwe mmasị pụrụ iche n’otu isiokwu nke e kwuru maka ya na magazin anyị. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwanyị nwetara nzaghachi ndị dị mma n’iji usoro isiokwu bụ́ “Ụlọ Akwụkwọ Nọ n’Ọgba Aghara,” nke pụtara na Teta! January 8, 1996, kpọtụrụ ụlọ akwụkwọ isii dị n’ókèala ọgbakọ ya. O jikwa magazin ndị na-ekwu maka ndụ ezinụlọ na mmetọ ụmụaka jee leta ụlọ ọrụ nlekọta ezinụlọ, a gwakwara ya ka ọ nọgide na-eweta mbipụta ndị ga-apụta n’ọdịnihu n’isiokwu yiri ndị ahụ. A kọwara nzaghachi o nwetara n’ụlọ ọrụ maka ndị na-enweghị ọrụ nye mbipụta Teta! nke March 8, 1996, banyere enweghị ọrụ dị ka nke “dị egwu.”

29 Otu onye nlekọta distrikti na-akọ na ya na nwunye ya na-agbachi àmà mberede anya mgbe ha na-azụ ihe ha ji esi nri. Ha na-aga azụ ihe n’oge ụlọ ahịa na-adịghị ejubiga ókè n’ụbọchị, mgbe ndị ahịa na-agagharịkwa nwayọọ nwayọọ n’ụzọ ngafe ahụ. Ha na-akọ banyere ọtụtụ mkparịta ụka dị mma.

30 N’ógbè ụfọdụ, ndị nkwusa ụfọdụ a họtara nwere ikike ịgba àmà n’ọdụ ụgbọelu. Mgbe ụfọdụ, ha enwewo ọṅụ nke ịgbara ndị njem mba ọzọ àmà bụ́ ndị bi ná mba ebe ndị Jehova dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ. N’ebe a chọtara mmasị, ha enyewo traktị ma ọ bụ magazin.

31 Ọ bụrụ na e kweghị ha gbaara ndị bi n’ụlọ a na-eche nche n’ụzọ bụ ọkpọka ma ọ bụ na mbara ndị dị n’ókèala ọgbakọ àmà n’onwe ha, ụfọdụ emewo ka ọ bụru omume ha iji akọ gbaara ndị nche nọ ọrụ ma ọ bụ ndị manija nke ọfịs mgbaziri ihe àmà. A na-ejikwa otu ụzọ ahụ eme ihe n’ógbè ndị mmadụ nwere ụlọ nke ha, ndị nwere ọnụ ụzọ ámá. Otu onye nlekọta sekit na ndị nkwusa ole na ole si otú a leta ụlọ asaa. N’ọnọdụ nke ọ bụla, ha gwara manija ahụ na ọ bụ ezie na e kweghị ka ha banye n’ụlọ ndị ahụ otú anyị si emekarị, ha achọghị ka ihe ọmụma ndị dị ná mbipụta ndị kasị ọhụrụ kwaa ya. Ndị manija nile nọ n’ụlọ asaa ahụ ji obi ụtọ nara magazin ndị ahụ ma chọọkwa mbipụta ndị na-esonụ! A na-ejizi telifon akpọtụrụ ndị bi n’ụlọ ndị dị otú ahụ.

32 Dọgbuo Onwe Gị n’Ọrụ Iji Mee Nkwusa Ebe Nile: Ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị na-agụnye echiche nke ịdị ngwa banyere ọrụ e kenyere anyị ikwusa ozi Alaeze ahụ. Iji jekwuru ndị mmadụ n’oge dịịrị ha mma, ọ dị anyị mkpa iwezụga n’ụsọ ihe ndị na-amasịkarị anyị ka anyị “wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ.” Ndị ohu Jehova nile raara onwe ha nye chọrọ ka ha nwee ike ikwu, dị ka Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ana m eme ihe nile n’ihi ozi ọma, ka m wee ghọọ onye na-enwekọ ya.”—1 Kọr. 9:22, 23.

33 Pọl gara n’ihu dee, sị: “Ya mere kama ihe ọzọ m ga-ewere obi ụtọ nile nyaa isi n’adịghị ike m nile, ka ike nke Kraịst wee rịdakwasị m, birikwa n’ime m. . . . N’ihi na mgbe ọ bụla m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” (2 Kọr. 12:9, 10) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịrụzu ọrụ a n’ike aka anyị. Ọ dị anyị mkpa ikpegara Jehova ekpere maka mmụọ nsọ ya dị ike. Ọ bụrụ na anyị ekpegara Chineke ekpere maka ume, anyị pụrụ inwe obi ike na ọ ga-aza ekpere anyị. Mgbe ahụ ịhụnanya anyị nwere maka ndị mmadụ ga-akwali anyị ịchọ ohere iji kwusaara ha ozi ọma, n’ebe ọ bụla a pụrụ ịhụ ha. N’ime izu na-abịanụ, gịnị ma ị nwalee otu n’ime aro ndị a tụrụ n’ihe ntinye a?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya