Ị Ga-agbali Àmà n’Oge Ị Na-anọghị n’Ozi!
1. (a) Gịnị bụ ịgba àmà n’oge a na-anọghị n’ozi? (b) Mmadụ ole ná ndị bịara ọmụmụ ihe taa ka ozi ọma mbụ ha nụrụ n’ọnụ Onyeàmà bụ n’oge Onyeàmà ahụ na-anọghị n’ozi?
1 Mmadụ ole n’ọgbakọ unu si n’àmà mbụ a gbaara ha n’oge a na-anọghị n’ozi nwee mmasị n’eziokwu ma bata n’ọgbakọ? O nwere ike iju gị anya ma ị chọpụta ole ha dị. Ịgba àmà n’oge a na-anọghị n’ozi bụ izi ndị anyị na ha na-ahụ mgbe anyị na-eme ihe ndị dịịrị anyị n’ụbọchị ozi ọma. O nwere ike ịbụ mgbe anyị na-eme njem, mgbe anyị gara ịhụ ndị ikwu anyị ma ọ bụ ndị agbata obi anyị, mgbe anyị gara ahịa, mgbe anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe anyị na-arụ ọrụ ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ. Mgbe a jụrụ ndị nkwusa karịrị narị abụọ e merela baptizim otú ha si mata eziokwu, mmadụ iri asatọ n’ime ha kwuru na ozi ọma mbụ ha nụrụ n’ọnụ Onyeàmà bụ n’oge Onyeàmà ahụ na-anọghị n’ozi! Nke a na-egosi na ụdị ozi ọma a na-amị ezigbo mkpụrụ.
2. Olee àmà ndị a gbara n’oge a na-anọghị n’ozi, bụ́ ndị a kọrọ n’Akwụkwọ Nsọ?
2 Ndị kwusara ozi ọma na narị afọ mbụ gbara àmà ọtụtụ ugboro n’oge ha na-anọghị n’ozi. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs si obodo Sameria na-agafe, ọ gbaara otu nwaanyị bịara isere mmiri n’olulu mmiri Jekọb àmà. (Jọn 4:6-26) Mgbe otu nwoke na-eje ozi n’obí eze nwaanyị ndị Itiopia nọ na-agụ akwụkwọ Aịzaya, Filip ji ajụjụ malite mkparịta ụka ya na ya nwere. Ọ jụrụ nwoke ahụ, sị: “Ị̀ maara n’ezie ihe ị na-agụ?” (Ọrụ 8:26-38) Mgbe Pọl onyeozi nọ n’ụlọ mkpọrọ na Filipaị, o ziri onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ ozi ọma. (Ọrụ 16:23-34) Mgbe e mechara tụọ Pọl mkpọrọ n’ụlọ ya, ‘o ji obiọma na-anabata ndị niile bịakwutere ya, na-ekwusara ha alaeze Chineke, na-ezikwa ha ihe banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.’ (Ọrụ 28:30, 31) A sịgodị na ị bụ onye ihere, ị ga-agbali àmà n’oge ị na-anọghị n’ozi. Olee otú ị ga-esi eme ya?
3. Gịnị ga-enyere anyị aka ịkata obi zie mmadụ ozi ọma?
3 Otú E Si Ebido Ya: Ọ na-esiri ọtụtụ n’ime anyị ike ibu ụzọ agwa ndị anyị na-amaghị okwu. Ọ bụrụgodị ndị anyị ma, o nwere ike ịnyị anyị arọ n’ọnụ ikwulite okwu Baịbụl. Ma, izi ndị mmadụ ozi ọma ga-enu anyị enu n’obi ma ọ bụrụ na anyị na-atụgharị uche n’ịdị mma Jehova, n’eziokwu ndị dị na Baịbụl Chineke na-akụziri ndị ohu ya, nakwa n’ọnọdụ ọjọọ ndị mmadụ nọ na ya taa. (Jona 4:11; Ọma 40:5; Mat. 13:52) Ihe ọzọ bụ na anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ‘inwe nkwuwa okwu.’ (1 Tesa. 2:2) Otu nwanna gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied kwuru, sị: “Achọpụtala m na mgbe ọ bụla o siiri m ike izi mmadụ ozi ọma, ekpere na-enyere m aka.” Ọ bụrụ na obi anaghị akacha gị izi mmadụ ozi ọma, kpee ekpere dị nkenke n’obi gị.—Nehe. 2:4.
4. Anyị chọọ ịgba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi, gịnị ka anyị nwere ike ibu ụzọ mee, ọ bụkwa maka gịnị?
4 Onye nkwusa chọọ ịgba àmà n’oge ọ na-anọghị n’ozi, ọ dịghị mkpa imewe ka onye ahụ mara na ya bụ Onyeàmà ma ọ bụkwanụ iji okwu Baịbụl malite. Ihe anyị nwere ike ilekwasị anya bụ otú anyị na onye ahụ ga-esi malite ikwurịta okwu nkịtị, ọ bụghị iziwe ya ozi ọma ozugbo. Ọtụtụ ndị nkwusa kwuru na ibu ụzọ amalite mkparịta ụka nkịtị na-eme ka ha katazie obi zie onye ahụ ozi ọma. Ọ bụrụ na onye ahụ achọghị ka gị na ya kparịta ụka, hapụ ya. Sị ya ka ọ dịwa mgbe ọzọ.
5. Olee otú otu nwanna nwaanyị, bụ́ onye ihere, si amalite izi ndị mmadụ ozi ọma n’oge ọ na-anọghị n’ozi?
5 Otu nwanna nwaanyị, bụ́ onye ihere, gaa ịzụ ihe n’ahịa, ihe ọ na-eme bụ ibu ụzọ lee onye ọ chọrọ ịgwa okwu anya n’ihu ma mụmụọrọ ya ọnụ ọchị. Ọ bụrụ na onye ahụ amụmụọkwara ya ọnụ ọchị, ya agwa ya otu ihe. Onye ahụ jiri obiọma zaghachi ya, obi na-akazi ya ikwuwe ihe ndị ọzọ. Ọ na-ege onye ahụ ntị nke ọma ma chọpụta isiokwu Baịbụl ga-amasị ya. O sila otú a nyefee ọtụtụ akwụkwọ ma malitedị ịmụrụ mmadụ Baịbụl.
6. Olee otú anyị nwere ike isi malite mkparịta ụka mgbe anyị na-anọghị n’ozi?
6 Otú Ị Ga-esi Malite Mkparịta Ụka: Gịnị ka anyị nwere ike ikwu ma anyị chọọ ịmalite mkparịta ụka? Mgbe Jizọs na nwaanyị ahụ bịara isere mmiri kwurịtara okwu, otú o si malite bụ ịrịọ nwaanyị ahụ ka o nye ya mmiri ka ya ṅụọ. (Jọn 4:7) N’ihi ya, otu ụzọ i nwere ike isi malite mkparịta ụka bụ iji ihu ọchị kelee onye ị chọrọ ịgwa okwu ma ọ bụ ịjụ ya ajụjụ ga-egosi na i nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Ka gị na ya na-akparịta ụka, i nwere ike ịhụ otú ị ga-esi webata ihe Baịbụl kwuru, ma eleghị anya, si otú ahụ kụnye eziokwu ahụ n’uche ya. (Ekli. 11:6) Ihe ụfọdụ ndị merela iji kpalie mmasị onye ha chọrọ ịgwa okwu bụ ikwu otu ihe ga-esiri onye ahụ ike ikweta nke ga-emekwa ka ọ jụọ ajụjụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị nọ n’ụlọ ọgwụ na-eche ka ị hụ dọkịta, otú i nwere ike isi mee ka gị na onye nọ gị n’akụkụ nwee mkparịta ụka bụ ịsị, “Obi ga-adị m ụtọ mgbe m na-agaghị na-arịazi ọrịa.”
7. Olee otú ileru anya ala ga-esi nyere anyị aka mgbe anyị chọrọ ịgba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi?
7 Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi malite mkparịta ụka bụ ileru anya ala. Ọ bụrụ na anyị ahụ nne ma ọ bụ nna ụmụ ya na-akpa àgwà ọma, anyị nwere ike ịja ya mma, ma jụọ ya, sị, “Gịnị nyeere gị aka ịzụ ụmụ gị nke ọma?” Otu nwanna nwaanyị na-esi ná mkparịta ụka ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ na-enwe amata ihe ndị na-amasị ha. E mechazie, ya achọta akwụkwọ anyị kwuru okwu banyere ihe ahụ ma jiri ya zie ha ozi ọma. Mgbe ọ matara na otu nwaanyị ya na ya na-arụkọ ọrụ na-akwadebe ịgba akwụkwọ, o nyere ya Teta! kwuru otú e si akwadebe agbamakwụkwọ. Nke a mere ka ha abụọ nwekwuo mkparịta ụka si na Baịbụl.
8. Olee otú anyị nwere ike isi jiri akwụkwọ anyị malite mkparịta ụka?
8 Ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi malite mkparịta ụka bụ ịgụ akwụkwọ anyị ebe ndị ọzọ ga-ahụ anyị. Otu nwanna nwoke na-asapeta otu isiokwu dị n’Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta!, nke ọ maara na ọ ga-adọrọ mmasị mmadụ, ma jiri nwayọọ na-agụ ya. Ọ bụrụ na ọ hụ na e nwere onye ihe e dere na magazin ahụ masịrị, ọ na-ajụ onye ahụ ajụjụ ma ọ bụ kwuo otu ihe banyere isiokwu ahụ ọ na-agụ. Nke a na-emekarị ka ya na onye ahụ kparịta ụka, ya enweekwa ike izi ya ozi ọma. Naanị idebe otu akwụkwọ anyị ebe ndị ọzọ ga-ahụ ya nwere ike ime ka ụmụ akwụkwọ ma ọ bụ ndị ọrụ ibe anyị chọọ ịma ihe akwụkwọ ahụ na-ekwu ma jụọ anyị ajụjụ banyere ya.
9, 10. (a) Olee otú anyị nwere ike isi chepụta ụzọ ndị anyị ga-esi na-agba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi? (b) Olee otú i sirila mee ya?
9 Chepụta Ụzọ Ndị Ị Ga-esi Mee Ya: Ebe ọ bụ na oge fọdụrụ maka ikwusa ozi ọma dị ntakịrị, anyị ekwesịghị ile ịgba àmà n’oge a na-anọghị n’ozi anya ka ihe a na-eme mgbe ọ dabara. Kama, anyị kwesịrị ichepụta ụzọ anyị ga-esi gbaara ndị mmadụ àmà mgbe anyị na-eme ihe ndị dịịrị anyị n’ụbọchị. Chee ụdị ndị gị na ha nwere ike ịhụ n’ụbọchị, cheekwa otú gị na ha nwere ike isi kparịta ụka ka enyi na enyi. Hụ na Baịbụl dị n’akpa gị mgbe niile, hụkwa na i ji akwụkwọ i nwere ike inye ndị gosiri mmasị.—1 Pita 3:15.
10 Ọtụtụ ndị nkwusa echepụtala ọtụtụ ụzọ ha na-esi agbara ndị mmadụ àmà n’oge ha na-anọghị n’ozi. Otu nwanna nwaanyị, onye bi ná nnukwu ụlọ ebe ọtụtụ ndị bi, na-eji foto ebe e sere ihe okike ndị mara mma aga n’ebe ndị bi gburugburu ebe ahụ na-anọ atụrụ ndụ ma dewe ya n’ebe ndị ọzọ ga-ahụ ya. Ndị mmadụ pụta hụ foto ndị ahụ, ha ekwuo na ihe osise ndị ahụ mara mma. Nwanna nwaanyị ahụ na-ejizi ohere ahụ amalite mkparịta ụka ma gwa ha nkwa Chineke kwere na a ga-enwe “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” (Mkpu. 21:1-4) Ì nwere ike ichepụta ụzọ ndị i nwere ike isi gbaara ndị mmadụ àmà n’oge ị na-anọghị n’ozi?
11. Olee ihe anyị nwere ike ime ma anyị hụ onye gosiri mmasị mgbe anyị na-agba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi?
11 Mee Ndokwa Maka Mkparịta Ụka Ọzọ: Ọ bụrụ na e nwere onye gere gị ntị, gbalịa ka gị na ya kparịta ụka n’oge ọzọ. Ị chọpụta na onye ahụ nwere mmasị, i nwere ike ịsị ya: “Mkparịta ụka a mụ na gị nwere tọrọ m ụtọ. Olee otú mụ na gị ga-esi hụ, ka anyị nwee ike ịkparịtakwu?” Ihe ụfọdụ ndị nkwusa na-eme bụ inye onye ahụ adres ụlọ ha nakwa nọmba ekwe ntị ha ma kwuo, sị: “Mkparịta ụka a mụ na gị nwere masịrị m. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka anyị kparịtakwuo, lekwa adres ụlọ m na nọmba ekwe ntị m.” Ọ bụrụ na ọ ga-esi ike gị na onye ahụ ịkparịta n’oge ọzọ, dejupụta fọm bụ́ Please Follow Up (S-43) ma nye ya odeakwụkwọ ọgbakọ unu, ka e nwee ike mee ndokwa ka ọgbakọ dị nso ebe onye ahụ bi ziga nwanna ga-aga leta onye ahụ.
12. (a) Gịnị mere o ji dị mma idekọ oge anyị ji gbaa àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi ma gbakọnye ya n’akụkọ ozi anyị? (b) Olee ihe ndị a rụpụtarala n’ịgba àmà n’oge a na-anọghị n’ozi? (Gụọ igbe bụ́ “Ịgba Àmà n’Oge A Na-anọghị n’Ozi Na-amị Ezigbo Mkpụrụ!”)
12 Anyị kwesịrị ịgbakọnye oge anyị ji gbaa àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi mgbe anyị na-enye akụkọ ozi anyị. N’ihi ya, hụ na ị na-edekọ oge ndị i ji gbaara mmadụ àmà n’oge ị na-anọghị n’ozi, ọ sọgodị ya ya bụrụ nkeji ole na ole n’ụbọchị. Chebagodịrị ihe a echiche: Ọ bụrụ na onye nkwusa ọ bụla ejiri nkeji ise gbaara mmadụ àmà n’oge ọ na-anọghị n’ozi n’ụbọchị ọ bụla, a ga-enweta nde awa iri na asaa n’otu ọnwa ma a gbakọọ nke ndị nkwusa niile!
13. Gịnị kwesịrị ịkpali anyị ịgba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi?
13 Ihe kacha mkpa mere anyị ji agba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi bụ n’ihi na anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya. (Mat. 22:37-39) Obi ụtọ anyị nwere maka àgwà ọma ndị Jehova nwere na nzube ya na-akpali anyị ịkọrọ ndị ọzọ “ebube nke ịma mma ọbụbụeze ya.” (Ọma 145:7, 10-12) Ebe ọ bụ na anyị bu ọdịmma ndị agbata obi anyị n’obi, anyị ga-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ na-ezi ha ozi ọma ugbu a oge ka dị. (Rom 10:13, 14) Ọ bụrụ na anyị niile ana-ewepụta obere oge chee echiche ma kwadebe otú anyị ga-esi gbaara mmadụ àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi, anyị ga-enwe ike ime ya, anyị ga-enwekwa ọṅụ ma e nwee onye obi ya ziri ezi si n’aka anyị nwee mmasị n’eziokwu ahụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 2]
Ihe i nwere ike ilekwasị anya bụ otú gị na onye ị chọrọ ịgbara àmà ga-esi malitegodị mkparịta ụka nkịtị
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]
Ọtụtụ ndị nkwusa echepụtala ọtụtụ ụzọ ha na-esi agbara ndị mmadụ àmà n’oge ha na-anọghị n’ozi
[Igbe dị na peeji nke 3]
Aro Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịmalite Mkparịta Ụka
◼ Rịọ Jehova ka o nyere gị aka tupu ị gwawa mmadụ okwu
◼ Gwa ndị nwere ihu ọchị na ndị ọ na-adịghị ngwa ngwa okwu
◼ Na-ele onye ị chọrọ ịgwa okwu anya n’ihu, mụmụọrọ ya ọnụ ọchị, kwulitekwa otu ihe ga-amasị ya
◼ Gee ya ntị nke ọma
[Igbe dị na peeji nke 3]
Ịgba Àmà n’Oge A Na-anọghị n’Ozi Na-amị Ezigbo Mkpụrụ!
• Mgbe otu nwanna nwoke nọ na-eche ka a rụziere ya ụgbọala ya, o ziri ndị nọ gburugburu ebe ahụ ozi ọma ma nye ha akwụkwọ e ji akpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa gere okwu ihu ọha a ga-ekwu ná mgbakọ. Ka otu afọ gachara, nwanna nwoke ahụ gara mgbakọ distrikti, otu nwoke ọ na-amataghị abịa kelee ya. Onye ahụ kelere ya bụ otu n’ime ndị ahụ o nyere akwụkwọ ịkpọ òkù n’ebe ahụ ọ gara ịrụzi ụgbọala. Nwoke ahụ gara gere okwu ihu ọha ahụ, ọ gwakwara ụmụnna ndị nọ ebe ahụ na ya chọrọ ka a mụwara ya Baịbụl. Ugbu a kwa, e meela ya na nwunye ya baptizim.
• Mgbe otu onye ọrụ ịnshọransị bịara na nke otu nwanna nwaanyị, nwanna nwaanyị ahụ ji ohere ahụ gbaara ya àmà. Ọ jụrụ nwoke ahụ ma ọ̀ ga-achọ ụdị ịnshọransị ọ ga-abụ ọ zụọ, ya enye ya ezigbo ahụ́ ike, ezigbo obi ụtọ, nakwa ndụ ebighị ebi. Nwoke ahụ sịrị ee ma jụzie nwanna nwaanyị ahụ ụdị ịnshọransị ọ na-ekwu okwu ya. Nwanna nwaanyị ahụ gosiziri ya nkwa ndị Jehova kwere na Baịbụl ma nye ya otu akwụkwọ anyị. Nwoke ahụ naara akwụkwọ ahụ ma gụchaa ya n’otu abalị. E mechara mụwara ya Baịbụl, ya ebidokwa ịbịa ọmụmụ ihe. E mechakwara mee ya baptizim.
• E nwere otu nwanna nwoke kpuru ìsì, ọ dị otu narị afọ, o bikwa n’ebe a na-elekọta ndị agadi. Mgbe ọ bụla ya na ndị mmadụ na-akparịta ụka, ihe ọ na-ekwukarị bụ, “Alaeze Chineke dị anyị mkpa.” Ihe a ọ na-ekwukarị emeela ka ndị nọọsụ na ndị agadi ndị ọzọ bi n’ụlọ ọgwụ ahụ jụọ ya ihe Alaeze ahụ bụ. Otu n’ime ụmụ nwaanyị ndị na-arụ ebe ahụ jụrụ ya ihe ọ ga-eme ma Paradaịs bịa, ya asị ya: “Mgbe ahụ, m ga-ahụwa ụzọ, gawa ije, m ga-agbazi ígwè ndị ngwọrọ a m nọ na ya ọkụ.” Ebe ọ bụ na nwanna ahụ kpuru ìsì, ọ na-agwa nwaanyị ahụ ka ọ na-agụrụ ya magazin anyị. Mgbe ada nwanna nwoke ahụ bịara ileta ya, nwaanyị ahụ na-arụ ebe ahụ rịọrọ ka ya were magazin ndị ahụ gaa gụọ n’ụlọ ya. Otu onye nọọsụ gwara ada nwanna ahụ, sị: “Ihe anyị niile nọ n’ebe a na-ekwuzi mgbe niile bụ: ‘Alaeze Chineke dị anyị mkpa.’”