Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/03 p. 1
  • Too Jehova Site n’Ịgba Àmà Mberede

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Too Jehova Site n’Ịgba Àmà Mberede
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị Ga-agbali Àmà n’Oge Ị Na-anọghị n’Ozi!
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Ị̀ Dị Njikere Ịgba Àmà n’Oge Ị Na-anọghị n’Ozi?
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Dị Uchu “n’Ịgba Àmà nke Ọma”
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Anyị Bụ Ndịàmà Mgbe Niile
    Ozi Alaeze Anyi—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 5/03 p. 1

Too Jehova Site n’Ịgba Àmà Mberede

1 Ndị ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe na-achọ ohere ndị ha ga-eji na-eto ya kwa ụbọchị. (Ọma 96:2, 3; Hib. 13:15) Otu ụzọ anyị pụrụ isi mee nke ahụ bụ site n’ịgba àmà mberede. Ọtụtụ ndị na-efe Jehova ofufe taa nwere ekele na ọ dị onye ziri ha ozi Alaeze ahụ site n’ịgbara ha àmà mberede.

2 Ọtụtụ mgbe, ịgbara otu onye àmà mberede na-emeghe ụzọ ka ndị ọzọ nụ ozi Alaeze ahụ. Dị ka ihe atụ, mkparịta ụka Jizọs na otu nwanyị onye Sameria nwere n’ụsọ olulu mmiri Jekọb mere ka ọtụtụ ndị ọzọ nwee mmasị n’ozi ọma ahụ. (Jọn 4:6-30, 39-42) Mgbe a tụrụ Pọl na Saịlas nga, ha gbaara onye na-elekọta ụlọ nga ahụ àmà, nwoke ahụ na ezinụlọ ya dum nakweere eziokwu ahụ.—Ọrụ 16:25-34.

3 Ohere Ndị E Nwere: Olee ohere ndị i nwere iji gbaa àmà mberede? Ụfọdụ na-eme otú ahụ mgbe ha gara ịzụ ahịa, mgbe ha nọ n’ụgbọ njem ọha na eze, ma ọ bụ mgbe ha na-echere ịhụ dọkịta. Ndị ọzọ na-enwe ike ịgba àmà n’oge ezumike n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ. Nanị idebe otu n’ime akwụkwọ anyị dabeere na Bible n’ebe a pụrụ ịhụ ya anya pụrụ ịkpali ndị ọzọ ịjụ ajụjụ banyere nkwenkwe anyị.—1 Pita 3:15.

4 Ụzọ Isi Malite: Otu nwatakịrị nwanyị na-eme ihere, onye dị afọ asaa nụrụ ka e kwuru ná nzukọ, mkpa ọ dị ka mmadụ nile na-eme nkwusa. Ya mere, mgbe ya na nne ya gawara ahịa, o tinyere broshuọ abụọ n’ime akpa ya. Ka nne ya nọ na-akwụ ụgwọ ihe ndị ọ zụrụ, nwa agbọghọ ahụ nyere otu nwaada broshuọ, bụ́ onye ji obiọma nara ya. Mgbe a jụrụ ya otú o siri nwee obi ike ịgakwuru nwaada ahụ, nwatakịrị nwanyị a na-eme ihere zara, sị: “Nanị ihe m kwuru bụ, Ngwa, Jikere, Gawa! M wee gaa!”

5 Iji nwee ike ịgba àmà mberede, ọ dị anyị nile mkpa inwe ụdị mmụọ nwatakịrị nwanyị ahụ nwere. Gịnị pụrụ inyere anyị aka? Kpee ekpere iji nwee obi ike ikwulite okwu. (1 Tesa. 2:2) Buru otu ajụjụ n’uche ma ọ bụ kwuo okwu n’otu isiokwu na-adọrọ mmasị nke ị pụrụ iji malite nkwurịta okwu. Mgbe ahụ nwee obi ike na Jehova ga-agọzi mgbalị gị.—Luk 12:11, 12.

6 Ịgbara ndị anyị na-ezute kwa ụbọchị àmà mberede na-ewetara Jehova otuto ma na-enye anyị obi ụtọ. Ọ pụrụ inyere mmadụ aka ịbata n’ụzọ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya