Dị Uchu “n’Ịgba Àmà nke Ọma”
1, 2. Gịnị masịrị gị n’otú Pọl si lee ikwusa ozi ọma ahụ anya, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya ya nke “ịgba àmà nke ọma”?
1 Dị ka Jizọs na ọtụtụ ndị ohu Chineke ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, Pọl onyeozi bụ onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi nke oziọma ahụ, ‘na-agba àmà nke ọma’ n’agbanyeghị ọnọdụ ọ nọ na ya. Ọbụna mgbe e ji ya eji n’ụlọ ya, ọ “na-ejikwa obiọma anabata ndị nile bịakwutere ya, na-ekwusara ha alaeze Chineke, jirikwa nkwuwa okwu kasị ukwuu na-ezi ihe ndị metụtara Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.”—Ọrụ 28:16-31.
2 Anyị onwe anyị kwa pụrụ ịdị uchu “n’ịgba àmà nke ọma” n’oge nile. Nke ahụ na-agụnye ịgbara ndị anyị na-ezute mgbe anyị na-eme njem àmà.—Ọrụ 28:23; Ọma 145:10-13.
3. Olee otú anyị pụrụ isi zere ime ka ịgba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi ghọọ ịgba àmà ndapụta?
3 Ịgba Àmà Ndapụta Ka Ọ̀ bụ Ịgba Àmà n’Oge A Na-anọghị n’Ozi? È nwere ọdịiche dị na ha abụọ? Ee. Ihe mere ná ndapụta bụ ihe e mere na mberede ma ọ bụ ihe a na-ebughị n’obi ime, dị ka a ga-asị na e meghị atụmatụ maka ya ma ọ bụ na ọ dịchaghị mkpa. N’ezie, a pụghị isi otú ahụ kọwaa ozi anyị. Dị ka ọ dị Pọl, inye Chineke otuto site n’ịgba àmà anyị dị anyị mkpa, o kwesịkwara ịbụ ebumnobi anyị ịgba àmà n’ebe ọ bụla kwesịrị ekwesị ka anyị na-eme njem. Otú ọ dị, a pụrụ ịkọwa ụzọ anyị si agakwuru ndị mmadụ n’ụzọ ziri ezi dị ka nke a na-eme n’oge a na-anọghị n’ozi—ya bụ, n’ụzọ ntụsara ahụ́, n’omume enyi, na nke a na-eyighị eyi. Isi otú a agba àmà pụrụ ịrụpụta ihe ndị dị mma.
4. Gịnị mere ka Pọl nwee ike ịgba àmà n’ebe o bi?
4 Kwadebe Ịgba Àmà: Pọl aghaghị imere onwe ya ohere iji gbaa àmà mgbe e ji ya eji n’ụlọ ya na Rom. Site n’ebe o bi, o ji aka ya kpọọ ndị ndú ndị Juu nọ n’ógbè ahụ n’ụlọ ya. (Ọrụ 28:17) Ọ bụ ezie na e nwere ọgbakọ Ndị Kraịst na Rom, Pọl nụrụ na ihe ndị Juu bi n’obodo ahụ maara n’onwe ha banyere okpukpe Ndị Kraịst dị ntakịrị. (Ọrụ 28:22; Rom 1:7) Ọ laghị azụ “n’ịgba àmà nke ọma” banyere Jizọs Kraịst na Alaeze Chineke.
5, 6. Ohere dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ inwe iji gbaa àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi, oleekwa nkwadebe ndị anyị pụrụ ime iji gbaa àmà n’ụzọ dị irè?
5 Cheedị echiche banyere ndị nile ị pụrụ izute mgbe ị na-eme njem, bụ́ ndị na-amachaghị banyere Ndịàmà Jehova. O nwere ike ha agaghị ama na anyị na-ekweta iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Mụrụ anya iji hụta ohere ndị ị pụrụ iji gbaara ndị ị na-ezute mgbe ị na-eme njem àmà, mgbe unu kwụsịtụrụ iji zuru ike, mgbe unu na-agbara mmanụ ụgbọala, mgbe ị gara ịzụ ihe, mgbe ị nọ na họtel, mgbe ị na-eri nri n’ụlọ nri, mgbe ị nọ n’ụgbọ njem ọha na eze, na ọtụtụ ebe ndị ọzọ. Buru ụzọ mee atụmatụ ihe ị pụrụ ikwu iji kpalite mkparịta ụka na iji gbaa àmà dị mkpirikpi. Ikekwe, ka oge na-aga ị pụrụ ịmalite ịmụgharị ya site n’ịgbara ndị agbata obi gị, ndị ikwu gị, ndị ọrụ ibe gị, na ndị ọzọ ị maara àmà n’oge ị na-anọghị n’ozi.
6 Ọ ga-adị gị mkpa inweta akwụkwọ ndị ị ga-eji mee ihe ka ị na-agba àmà n’oge ị na-anọghị n’ozi. Akwụkwọ dịgasị aṅaa? Ị pụrụ iji traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? mee ihe. Kọwapụta paragraf ise ndị mbụ, bụ́ ebe e kwuru ihe dịgasị iche iche mere a ga-eji gụọ Bible. Gosi onye ahụ mpempe akwụkwọ dị n’azụ ya maka iji rịọ maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Mgbe i nwetara onye gere gị ntị, nye ya broshuọ Na-achọ. N’atụmanya nke izute ndị na-asụ asụsụ ọzọ, jide akwụkwọ nta bụ́ Good News For All Nations. Peeji nke 2 na-akọwa ụzọ isi jiri ya gbaa àmà. Ọ bụrụ na i ji obere ụgbọala ma ọ bụ bọs na-eme njem, ị pụrụ ijide mbipụta ole na ole ndị ọzọ maka ndị ga-egosi ezi mmasị n’ozi Alaeze ahụ.
7, 8. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa banyere ejiji na àgwà anyị ka anyị kwesịrị ige ntị na ya mgbe anyị na-eme njem nakwa mgbe anyị na-atụrụ ndụ?
7 Chebara Ejiji Gị na Àgwà Gị Echiche: Anyị aghaghị ijide n’aka na àgwà anyị nakwa uwe na ejiji anyị agaghị eme ka ndị ọzọ nwee echiche na-ezighị ezi ma ọ bụ mee ka ha ‘kwugide’ nzukọ Jehova. (Ọrụ 28:22) Nke a abụghị nanị maka mgbe anyị na-eme njem kamakwa mgbe anyị na-enwe ntụsara ahụ́. Ụlọ Nche nke August 1, 2002, peeji nke 18, paragraf nke 14 dọrọ aka ná ntị, sị: “Ejiji anyị ekwesịghị ịbụ nke a na-agba nkiri, nke mara mma gabiga ókè, nke na-akpali agụụ mmekọahụ, ma ọ bụ nke na-ewu ewu. Tụkwasị na nke ahụ, anyị kwesịrị iji ejiji n’ụzọ ga-egosipụta ‘nsọpụrụ Chineke.’ Nke ahụ na-akpali anyị iche echiche, ọ́ bụghị ya? Ọ bụghị nanị okwu banyere iji ejiji kwesịrị ekwesị mgbe anyị na-aga nzukọ ọgbakọ dị iche iche, [ma ọ bụ mgbakọ ukwuu ndị ọzọ] ma na-eji ejiji otú masịziri anyị n’oge ndị ọzọ. Ọdịdị onwe onye anyị pụrụ ịdị na-egosipụta nsọpụrụ ofufe mgbe nile, n’ihi na anyị bụ ndị Kraịst na ndị ozi n’oge nile.”—1 Tim. 2:9, 10.
8 Anyị kwesịrị iji ejiji n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma dị ùgwù. Ọ bụrụ na ejiji anyị na àgwà anyị na-egosipụta mgbe nile na anyị kweere na Chineke, ọ dịghị mgbe a ga-amanye anyị ịla azụ n’ịgba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi n’ihi na ejiji anyị adịchaghị mma.—1 Pita 3:15.
9. Ihe ịga nke ọma dị aṅaa ka Pọl nwere n’ịgba àmà na Rom?
9 Ịgba Àmà n’Oge A Na-anọghị n’Ozi Na-arụpụta Ihe: N’ime afọ ahụ e ji Pọl eji n’ụlọ ya na Rom, ọ hụrụ ezi ihe ndị si ná mgbalị ndị o mere iji gbaa àmà pụta. Luk kọrọ na “ụfọdụ ndị malitekwara ikwere ihe ndị a na-ekwu.” (Ọrụ 28:24) Pọl n’onwe ya chọpụtara ịdị irè nke ‘ịgba àmà nke ọma’ ya mgbe o dere, sị: “Ọnọdụ m aghọwo nke na-eme ka ozi ọma na-aga n’ihu kama ime ka ọ ghara ịga n’ihu, nke mere na agbụ m aghọwo ihe ọha mmadụ maara n’ihe metụtara Kraịst n’etiti Ndị Nche Eze nile na ndị nile ọzọ; ihe kakwa ọtụtụ n’ụmụnna n’ime Onyenwe anyị, n’inwe obi ike n’ihi agbụ ụlọ mkpọrọ m, na-egosi obi ike karị n’ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu.”—Fil. 1:12-14.
10. Olee ihe ịga nke ọma otu di na nwunye nwere n’ịgba àmà n’afọ gara aga?
10 Ka ha gachara mgbakọ distrikti nke afọ gara aga, otu di na nwunye nwere ahụmahụ rụpụtara ihe n’ịgbara otu nwanyị na-eke nri, bụ́ onye jụrụ ha ajụjụ banyere baajị mgbakọ ha, àmà n’oge ha na-anọghị n’ozi. Ha kọọrọ ya banyere mgbakọ ahụ nakwa banyere olileanya Bible na-enye maka ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ha nyere ya traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? ma kọwaara ya banyere ndokwa inwe ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Nwanyị ahụ kwuru na ya chọrọ ka mmadụ bịa na nke ya, o dere aha ya na adres ya n’azụ traktị ahụ ma gwa di na nwunye ahụ ka ha mee ndokwa maka ya. Olee ihe ịga nke ọma ị pụrụ inwe n’afọ a site n’ịdị uchu “n’ịgba àmà nke ọma”?
11. Àgwà dịgasị aṅaa ka anyị na-aghaghị ịzụlite iji kwusaa ozi ọma ahụ site “n’ịgba àmà nke ọma”?
11 Kwusaa Ozi Ọma ahụ nke Ọma: Cheedị obi ụtọ Pọl nwere mgbe ọ nụrụ na Ndị Kraịst ibe ya na-eṅomi ihe nlereanya ya nke ịnụ ọkụ n’obi! Ka anyị mee ihe nile anyị nwere ike ime iji kwusaa ozi ọma ahụ site n’ịgba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi banyere nkwenkwe anyị ndị dabeere na Bible n’ohere ọ bụla dapụtaranụ.
Igbe dị na peeji nke 4]
Akwụkwọ Ndị A Chọrọ Maka Ịgba Àmà n’Oge A Na-anọghị n’Ozi
■ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? (traktị)
■ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? (broshuọ)
■ Good News For All Nations (akwụkwọ nta)
■ Akwụkwọ ndị ọzọ bụ́ isi