Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/13 p. 1
  • “Gbaa Àmà nke Ọma”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Gbaa Àmà nke Ọma”
  • Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kpebisie Ike Ịgbasi Àmà Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Dị Uchu “n’Ịgba Àmà nke Ọma”
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Ndị A Zụrụ Ịgba Àmà nke Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Mee Nkwusa Ma Gbaa Àmà nke Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2013
km 1/13 p. 1

“Gbaa Àmà nke Ọma”

1. Olee otú Pọl onyeozi si were ozi ya?

1 Na 2 Timoti 4:5, Pọl gwara Timoti ka o ‘jezuo ozi ya.’ Pọl onyeozi gbara mbọ jezuo ozi nke ya, ọ bụ ya mere ọnụ ji kaa ya ya agwa Timoti ka o meekwa otú ahụ. Site n’afọ 47 O.A. ruo n’afọ 56 O.A., Pọl gara ozi ala ọzọ ugboro atọ. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru ọtụtụ ugboro na Pọl gbara “àmà nke ọma.” (Ọrụ 23:11; 28:23) Olee otú anyị nwere ike isi gbaa àmà nke ọma taa?

2. Olee otú anyị ga-esi gbaa àmà nke ọma mgbe anyị na-ezi ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

2 Ịga Ozi Ọma Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ: O nwere ndị na-anụtụbeghị ozi ọma anyị na-ezi ndị mmadụ. N’ihi ya, anyị nwere ike ịga ozi ọma oge anyị ga-enweta ha n’ụlọ. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ ná mgbede ma ọ bụkwanụ ná ngwụcha izu ka a na-enweta nna nwe ụlọ. Anyị nwere ike ịga ozi ọma mgbe ahụ ka anyị nwee ike izi ya ozi ọma. Anyị gaa ozi ọma, anyị kwesịrị ịgba mbọ zie onye ọ bụla anyị hụrụ n’ụlọ anyị gara ozi ọma. Anyị kwesịkwara ịgaghachi na nke ndị anyị na-ahụghị n’ụlọ. Gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị agaa ugboro ugboro ma anyị enwetaghị ya n’ụlọ? Anyị nwere ike iji akwụkwọ ozi ma ọ bụkwanụ fon zie ya ozi ọma.

3. Olee ebe i nwere ike izi ndị mmadụ ozi ọma? Oleekwa mgbe i nwere ike izi ha ya?

3 Izi Ozi Ọma n’Ebe Ndị Mmadụ Na-anọkarị Nakwa Mgbe Anyị Na-anọghị n’Ozi: Ndịàmà Jehova na-ezi ndị niile chọrọ ịnụ gbasara Alaeze Chineke ozi ọma. Mgbe ụfọdụ, ha na-ezi ndị ha hụrụ “n’okporo ámá” ma ọ bụkwanụ “n’ámá” ozi ọma. (Ilu 1:20, 21) Mgbe anyị na-arụ ọrụ ndị dịịrị anyị n’ụbọchị, ànyị na-agba mbọ zie ndị mmadụ ozi ọma? È nwere ike ikwu na anyị ‘na-ekwusasi okwu Chineke ike’? (Ọrụ 18:5) Ọ bụrụ na anyị na-ekwusasi ya ike, anyị amara na anyị “na-agba àmà nke ọma.”—Ọrụ 10:42; 17:17; 20:20, 21, 24.

4. Olee otú ekpere na ịtụgharị uche ga-esi nyere anyị aka ịgba àmà nke ọma?

4 Ma mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịhụ mmadụ, ihere agaghị ekwe anyị zie ya ozi ọma. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova ma otú ọ dị anyị. (Ọma 103:14) Ọ bụrụ na ụdị ihe a na-eme anyị, anyị kwesịrị ikpe ekpere ka Jehova mee ka obi kaa anyị izi onye ahụ ozi ọma. (Ọrụ 4:29, 31) Ihe ọzọ anyị nwere ike ime bụ, mgbe naanị anyị na-amụ ihe, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ihe ndị ga-enyere anyị aka iji obi ike na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Anyị kwesịkwara ime otú a mgbe anyị na-atụgharị uche. (Fil. 3:8) Nke a ga-eme ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.

5. Olee otú amụma Joel ga-esi mezuo anyị n’isi?

5 Joel buru amụma na Ndịàmà Jehova ga na-aga ozi ọma “n’eleghị anya n’azụ” tupu oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova abịa. Ha agaghị ekwe ka ihe ọ bụla mee ka ha kwụsị izi ndị mmadụ ozi ọma. (Joel 2:2, 7-9) Ka anyị gbaa mbọ na-agachi ozi ọma anya n’ihi na a gaghị arụ ọrụ a ugboro abụọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya