Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 21
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 21
Abụ nke 61 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 4 ¶9-14 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Matiu 12-15 (Nkeji 10)
Nke 1: Matiu 14:23–15:11 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Nzọpụta Si n’Aka Chineke Site n’Àjà Mgbapụta Jizọs—td 33A (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Otú Aịzik Si Bụrụ Onye Na-eme Udo?—Jen. 26:19-22 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Na-ezisa Ozi Ọma n’Akwụsịghị Akwụsị. (Ọrụ 5:42) Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ na-agachi ozi ọma anya ajụjụ ọnụ. Gịnị na-enyere ha aka ịgachi ozi ọma anya? Olee otú ha si akwadebe ozi ọma? Olee otú ịga ozi ọma sirila nyere ha aka ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ?
Nkeji 10: Àgwà Ọma Anyị Na-eme Ka Ndị Mmadụ Too Jehova. (1 Pita 2:12) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Ụlọ Nche Eprel 15, 2010, peeji nke 6, paragraf nke 16 na Ụlọ Nche Julaị 15, 2012, peeji nke 24, paragraf nke 11. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Nkeji 10: “Ì Nwere Ike Inwe Ókèala nke Gị?” Ajụjụ na azịza.
Abụ nke 96 na Ekpere