Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/03 p. 3-4
  • Mee Nkwusa Ma Gbaa Àmà nke Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee Nkwusa Ma Gbaa Àmà nke Ọma
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Chọrọ—Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka 30,000
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Ànyị Ga-eme Ya Ọzọ?—Òkù Ọzọ Maka Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Kpọsaa Ịdị Mma Jehova n’Ebe Nile
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Ihe Mgbaru Ọsọ Magburu Onwe Ya Maka Afọ Ije Ozi Ọhụrụ
    Ozi Alaeze Anyi—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 2/03 p. 3-4

Mee Nkwusa Ma Gbaa Àmà nke Ọma

1 Dị ka “onye ndú na onye iwu,” Jizọs kwadebere ndị na-eso ụzọ ya maka ọrụ ime nkwusa ahụ buru ibu ha ga-arụ n’ọdịnihu. (Aịsa. 55:4; Luk 10:1-12; Ọrụ 1:8) Pita onyeozi ji okwu ndị a kọwaa ọrụ ahụ Jizọs nyere ha: “O nyere anyị iwu ime nkwusa nye ndị mmadụ na ịgba àmà nke ọma na onye a bụ Onye ahụ Chineke kpebiri na ọ ga-abụ onyeikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.” (Ọrụ 10:42) Gịnị ka ịgba àmà nke ọma na-agụnye?

2 Anyị pụrụ ịmụta ihe buru ibu site n’ịtụle ihe nlereanya nke Pọl onyeozi. Mgbe ya na ndị okenye si n’ọgbakọ dị n’Efesọs nọ na-enwe nzukọ, o chetaara ha, sị: ‘Alaghị m azụ ịgwa onye nke ọ bụla n’ime unu ihe ndị bara uru ma ọ bụ izi unu ihe n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Kama agbasiiri m ma ndị Juu ma ndị Grik àmà ike banyere nchegharị n’ebe Chineke nọ na okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs.’ N’agbanyeghị na ya onwe ya na-eche ọnwụnwa ihu, Pọl gbalịsiri ike ime ka ozi ọma ahụ ruo ọtụtụ mmadụ aka dị ka o kwere ya mee. O nweghị afọ ojuju nanị n’isoro ndị na-ege ya ntị kerịta eziokwu ndị bụ́ isi, kama ọ gbalịsiri ike ịkụziri ha “nzube nile nke Chineke.” Iji mezuo nke a, ọ dị njikere ịdọgbu onwe ya n’ọrụ na ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà. O kwukwara, sị: “Adịghị m ewere mkpụrụ obi m dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa nye m, ma ọ bụrụhaala na m ga-agbacha ọsọ m ma jesịa ozi ahụ m natara n’aka Onyenwe anyị Jizọs, ịgbasi àmà ike banyere ozi ọma nke obiọma ahụ na-erughịrị mmadụ nke Chineke.”—Ọrụ 20:20, 21, 24, 27.

3 Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Pọl taa? (1 Kọr. 11:1) Site n’ịchọ ezinụlọ ndị kwesịrị ekwesị ọbụna mgbe anyị onwe anyị na-eche ule dị iche iche ihu, site n’ịgbalịsi ike ime ka ozi ọma ahụ ruo ndị si n’agbụrụ na asụsụ nile aka, nakwa site n’iji ịdị uchu na-azụlite mmasị ndị anyị na-achọta. (Mat. 10:12, 13) Nke a na-achọ oge, mgbalị, na inwe ịhụnanya maka ndị mmadụ.

4 Ị̀ Pụrụ Ije Ozi Dị Ka Onye Ọsụ Ụzọ Inyeaka? March na April pụrụ ịbụrụ gị ohere dị mma iji gbaa àmà nke ọma site n’ịsụ ụzọ inyeaka. Lee ihe na-agba ume ọ bụ ịhụ ka ọtụtụ mmadụ mere mgbalị pụrụ iche iji sụọ ụzọ inyeaka n’afọ gara aga!

5 Agbamume ahụ nzukọ Jehova nyere kpaliri otu nwanna nwanyị dị afọ 80, bụ́ onye nwere ọtụtụ nsogbu ahụ́ ike. O dere, sị: “Ọ kpaliri ọchịchọ dị m n’obi eri ogologo oge, o mekwara ka m nwee mmetụta na m ga-arụrịrị ọrụ ịsụ ụzọ inyeaka, ma ọ dịghị ihe ọzọ otu ugboro ọzọ.” O kpebiri ime ya na March. “Ihe mbụ m ga-eme,” ka o kwuru, “bụ ịnọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-ewe m. Mụ na nwa m nwanyị kwurịtara ya n’ihi na m ga-achọ enyemaka ya. O mere ihe tụrụ m n’anya site n’iwere otu fọm n’onwe ya.” N’ọnwa ahụ, nwanna nwanyị ahụ meworo okenye tinyere awa 52 n’ozi. “Ekpegaara m Jehova ekpere ọtụtụ ugboro ka o nye m ume ọhụrụ mgbe m chere na ike na-agwụ m. Ná ngwụsị ọnwa ahụ, enwere m afọ ojuju na obi ụtọ dị ukwuu, ekelewokwa m Jehova ekele ọtụtụ ugboro maka inyere m aka. M ga-enwe mmasị ịnwale ya ọzọ.” Ahụmahụ ahụ na-enye obi ụtọ o nwere pụrụ ịgba ndị ọzọ ume, bụ́ ndị chọrọ n’ezie ịsụ ụzọ inyeaka n’agbanyeghị nsogbu ahụ́ ike ndị siri ike ha nwere.

6 Otu nwanna nwoke, bụ́ onye a chụrụ n’ọrụ na mberede jiri ohere ahụ sụọ ụzọ inyeaka. Ka ọnwa ahụ na-aga, o nwekwuru ịnụ ọkụ n’obi maka ọrụ nkwusa, ka ọ na-erule ná ngwụsị ọnwa ahụ, ọ malitewo otu ọmụmụ Bible ọhụrụ. N’ịtụgharị uche n’ahụmahụ o nwere, o kwuru, sị: “Lee ọnwa magburu onwe ya ọ bụ!” Lee ọṅụ o nwere n’ihi inweta nduzi na enyemaka Jehova! Ee, Jehova wụkwasịrị ya ngọzi bara ụba n’ihi mgbalị nwanna nwoke ahụ tinyekwuru n’ozi, ọ ga-emekwara gị otu ihe ahụ.—Mal. 3:10.

7 Nye ọtụtụ ndị, ịsụ ụzọ inyeaka adịghị mfe. Ka o sina dị, n’agbanyeghị ọrụ ego na ibu ọrụ ezinụlọ tinyekwara nsogbu onwe onye dị iche iche, ọtụtụ ụmụnna enwewo ike ime otú ahụ. Ịgba àmà nke ọma na-agụnyekarị iji oge anyị dị oké ọnụ ahịa na ume chụọ àjà, ma ngọzi ndị na-esi na ya apụta enweghị atụ.—Ilu 10:22.

8 March na April bụ oge ndị dị mma iji sụọ ụzọ inyeaka. E nwere ngwụsị izu ise na March. Iji ngwụsị izu ndị a na oge uhuruchi mee ihe nke ọma pụrụ ime ka o kwe ndị ụfọdụ ji oge ha na-arụ ọrụ ego oge nile omume ịsụ ụzọ inyeaka. Tụkwasị na nke a, ị pụrụ iji oge ezumike ndị a ga-enwe n’ọnwa April mee ihe. Ụfọdụ pụrụ inwe oge ezumike n’ụlọ akwụkwọ na n’ọrụ ego, bụ́ nke ga-enyere ha aka ịrụta awa 50 ahụ a chọrọ. Iji nwee ike ime atụmatụ itinye awa 50 n’ozi na March ma ọ bụ n’April, ị̀ pụrụ iji otu n’ime usoro ihe omume nke bụ́ ihe nlereanya maka ịsụ ụzọ inyeaka ndị ha na isiokwu a so mee ihe? Soro ndị ọzọ tụlee usoro ihe omume nke gị; obi abụọ adịghị ya na ọ ga-abụ ihe agbamume nye ụfọdụ ndị isonyere gị n’ozi. Ọ bụrụ na i nweghị ike ịsụ ụzọ inyeaka, setịpụ ihe mgbaru ọsọ a kapịrị ọnụ maka ọnwa ndị a, ma kwadoo ndị nwere ike ịsụ ụzọ. Mee atụmatụ ugbu a maka ịmụba ozi gị na March na April.

9 Gosi Ekele Maka Ememe Ncheta: Kwa afọ, n’oge Ememe Ncheta, ekele ha nwere maka ihe mgbapụta ahụ na-akwali ọtụtụ puku mmadụ ‘ịzụpụta oge’ iji ghọọ ndị ọsụ ụzọ inyeaka. (Efe. 5:15, 16) N’afọ gara aga na Nigeria, e nwere ndị ọsụ ụzọ inyeaka dị 16,101 na March nakwa 13,487 n’April. Nke ahụ bụ nkezi nke 14,794 maka nke ọ bụla n’ime ọnwa abụọ a. Jiri nke ahụ tụnyere nkezi nke 4,837 bụ́ ndị sụrụ ụzọ inyeaka na nke ọ bụla n’ime ọnwa ndị bu ụzọ n’ime afọ ije ozi ahụ. Oge Ememe Ncheta a bụ ohere ọzọ dị mma iji gosi ezi ekele anyị nwere maka àjà mgbapụta Kraịst site n’ikerekwu òkè n’ozi ubi.

10 Ka April 16 na-eru nso, tụgharịa uche n’ihe Ememe Ncheta ahụ pụtara nye gị. Chee echiche banyere ihe omume ndị dugara n’ọnwụ Kraịst na ihe ndị nọ na-echegbu ya. Tụgharịakwa uche n’ọṅụ e setịpụrụ n’ihu Jizọs na otú o si nyere ya aka ịtachi obi ná mmeso ọjọọ dị otú ahụ. Tụgharịa uche n’ọnọdụ ya ugbu a dị ka Isi nke ọgbakọ, onye na-elekọta ọrụ nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ. (1 Kọr. 11:3; Hib. 12:2; Mkpu. 14:14-16) Mgbe ahụ gosipụta ekele i nwere maka ihe nile Kraịst meworo site n’ikere òkè zuru ezu n’ọrụ nkwusa ahụ dị ka ọnọdụ gị kwere gị.

11 Gbaa Ndị Ọzọ Ume Ịgba Àmà nke Ọma: Site n’ikere òkè n’ozi ọsụ ụzọ inyeaka, ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nọ n’ọnọdụ dị mma ịgba ndị ọzọ ume. Mgbe ha na ndị nkwusa na-arụkọ ọrụ n’ozi ubi na mgbe ha na-eme nleta ọzụzụ atụrụ, ha nwere ohere ndị magburu onwe ha inyere ndị ọzọ aka ikere òkè zuru ezu n’ọrụ a pụrụ iche. Ka anyị nile tinye nke a n’ekpere, si otú a na-emesikwu mgbalị anyị jikọrọ aka na-eme iji gbaa àmà nke ọma ike.

12 Ọ bụ ezie na ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nile ga-akwado ndokwa ọgbakọ mere maka ikerekwu òkè n’ọnwa March na April, onye nlekọta ije ozi karịsịa kwesịrị ịhụ maka ịhazi ọrụ izisa ozi ọma ahụ. O kwesịrị ime ndokwa maka ebe ndị a ga-ezukọ maka ozi ubi, ụbọchị, na oge ga-adịrị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa mma ma hụ na a na-ama ha n’ọkwa mgbe nile. A pụrụ ime ndokwa inwe nzukọ maka ije ozi ubi ọtụtụ ugboro n’ụbọchị, na-enye mmadụ nile nọ n’ọgbakọ ohere ikere òkè n’akụkụ dịgasị iche iche nke ịgba àmà. Ndị a pụrụ ịgụnye ịrụ ọrụ n’ógbè azụmahịa, ịgba àmà n’okporo ámá, ije site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ịga nletaghachi, na iji telifon na-agba àmà. Ọzọkwa, o kwesịrị ime ndokwa ka e nwee akwụkwọ, magazin, na ókèala zuru ezu n’ọnwa ndị ahụ.

13 Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa March bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma, n’ebumnobi nke ịmalite ọmụmụ Bible. Aro ndị dị mma maka ụzọ isi nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma pụtara n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2002. Akwụkwọ a ga-enyefe n’April ga-abụ magazin Ụlọ Nche na Teta! Gbalịa iji ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị a tụrụ aro ha, ndị pụtara ‘n’Ihe A Ga-ekwu Maka Magazin Ndị Ahụ’ mee ihe. Mmadụ nile kwesịrị iwepụta oge ma kwadebe nke ọma iji nwee ike ịgba àmà nke ọma.

14 Lee obi ụtọ anyị nwere ịrụ ọrụ n’okpuru nduzi nke Isi nke ọgbakọ, bụ́ Kraịst Jizọs, na inwe ihe ùgwù nke isoro ndị ọzọ na-ekerịta ozi ọma ahụ! Ka ọnwa March na April na-eru nso, ka anyị gbalịa ọzọ ime ha ọnwa ndị kasị mma anyị nwetụrụla ka anyị na-erube isi n’iwu Kraịst nke bụ́ ime nkwusa na ịgba àmà nke ọma.

Igbe dị na peeji nke 4]

Ụzọ Dịgasị Iche Iche nke Isi Sụọ Ụzọ Inyeaka na March na April 2003

Ụbọchị Awa

Monday 1 2 — — 2 —

Tuesday 1 — 3 — — —

Wednesday 1 2 — 5 — —

Thursday 1 — 3 — — —

Friday 1 2 — — — —

Saturday 5 4 3 5 6 7

Sunday 2 2 3 2 2 3

March 56 56 54 55 50 50

April 50 50 51 53 — —

Otu n’ime usoro ihe omume ndị a ọ̀ ga-adabara gị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya