Ihe Mgbaru Ọsọ Magburu Onwe Ya Maka Afọ Ije Ozi Ọhụrụ
1. Olee ihe mgbaru ọsọ anyị pụrụ inwe n’afọ ije ozi na-abịanụ?
1 Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe ọganihu ime mmụọ, anyị ga-enwerịrị ihe mgbaru ọsọ. Olee ihe mgbaru ọsọ ndị i nwere maka afọ ije ozi na-abịanụ? Otu ihe mgbaru ọsọ magburu onwe ya bụ iji otu ọnwa ma ọ bụ karịa rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Iji nwee ike ịrụ ọrụ a na-enye obi ụtọ, ọ dị mkpa ibu ụzọ kwadebe akwadebe. Ugbu a bụkwa oge magburu onwe ya iji chebara ya echiche. Gịnị mere anyị ga-eji were ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka dị ka ihe mgbaru ọsọ?
2. Gịnị mere anyị ga-eji were ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka dị ka ihe mgbaru ọsọ?
2 Ihe Ndị Mere Anyị Ga-eji Rụọ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka: Ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka na-enyere anyị aka ime ihe na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ “n’ụzọ zuru ezu karị” site n’ijekwu ozi ọma karịa ka anyị na-ejebu. (1 Tesa. 4:1) Ka anyị na-atụgharị uche n’ihe nile Jehova meere anyị, obi anyị na-akpali anyị ịkọrọ ya ndị ọzọ. (Ọma 34:1, 2) Jehova na-ahụ ihe ndị anyị na-achụ n’àjà iji nwee ike ijekwu ozi ọma karịa ka anyị na-ejebu. O jikwa àjà ndị ahụ kpọrọ ihe. (Hib. 6:10) Obi na-atọ anyị ụtọ nke ukwuu ịmata na mgbalị anyị na-eme na-atọ Jehova ụtọ.—1 Ihe 29:9.
3, 4. Olee uru ndị anyị ga-erite ma anyị rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?
3 Ọ bụrụ na mmadụ na-eme ihe ugboro ugboro, ihe ahụ ga-adịkwuru ya mfe, na-atọkwukwa ya ụtọ. Ijekwu ozi ọma karịa ka ị na-ejebu ga-eme ka ahụ́ rukwuo gị ala mgbe i na-ezi ozi ọma n’ụlọ ndị mmadụ. Ọ ga-eme ka ị ghọọ aka ochie n’ịmalite nkwurịta okwu nakwa n’iji Bible akwado ihe ị na-ekwu n’ozi ọma. Ọ bụrụ na ị na-agwakwu ndị mmadụ banyere okwukwe gị, okwukwe gị ga na-esikwu ike. Ọtụtụ ndị na-enwebughị ndị ha na-eduziri ọmụmụ Bible enweela ndị ha na-eduziri ya n’oge ha rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
4 Ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka nwekwara ike ime ka onye na-adịghị anụ ọkụ n’obi n’ụzọ ime mmụọ malite ịnụ ọkụ n’obi. Otu nwanna bụbu onye ọsụ ụzọ oge nile, nke chere na ọrụ ego ya na-ewe ya oge buru ibu, kpebiri iji otu ọnwa rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. O kwuru, sị: “Otú ọnwa ahụ si mee ka m gbasikwuo ike n’ụzọ ime mmụọ tụrụ m n’anya! Emere m ndokwa ịdị na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka mgbe nile. Nke a mekwara ka m maliteghachi ọrụ ọsụ ụzọ oge nile.”
5. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chere na anyị erughị eru ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?
5 Ịrụ Ya n’Agbanyeghị Ihe Ndị Na-eme Ka O Sie Ike: O nwere ike isiri ụfọdụ ndị ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ihi na ha chere na ha amachaghị ezi ozi ọma. Ọ bụrụ na ọ bụ ya mere na ị chọghị ịrụ ya, Jehova nwere ike inyere gị aka dị ka o nyeere Jeremaịa. (Jer. 1:6-10) Ọ bụ ezie na Mozis bụ “onye ọnụ ya dị arọ, nke ire ya dịkwa arọ,” Jehova ji ya rụọ ihe bụ́ uche Ya. (Ọpụ. 4:10-12) Ọ bụrụ na i chere na i rughị eru ịrụ ya, rịọ Jehova ka o nye gị obi ike.
6. Olee ihe mmadụ nwere ike ime iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’agbanyeghị na ahụ́ na-enye ya nsogbu, ma ọ bụ na ọ na-ejikarị ọrụ n’aka?
6 Ị̀ na-ala azụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka maka na ahụ́ na-enye gị nsogbu ma ọ bụ maka na ị na-ejikarị ọrụ n’aka? Ọ bụrụ na ahụ́ esighịzi gị ike, i nwere ike iji nwayọọ nwayọọ rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ọ bụrụ na ị na-ejikarị ọrụ n’aka, i nwere ike ịhapụtụgodị ihe ụfọdụ na-adịchaghị mkpa ma mee ha n’ọnwa ọzọ. Ụfọdụ ndị ọrụ ha na-adịghị enye ohere enweela ike ịzụpụtara onwe ha oge iji rụọ ọsụ ụzọ inyeaka site n’iwere otu ụbọchị ezumike ma ọ bụ abụọ n’ebe ha na-arụ ọrụ.—Kọl. 4:5.
7. Gịnị mere o ji baa uru ịdị na-etinye ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ekpere mgbe nile?
7 Otú Ị Ga-esi Mee Ya: Mee ka Jehova mara na ị chọrọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Rịọ ya ka ọ gọzie mgbalị ị na-eme ijekwu ozi ọma karịa ka ị na-ejebu. (Rom 12:11, 12) O nwere ike inyere gị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha banyere otú ị ga-esi hazigharịa ihe omume gị. (Jems 1:5) Ọ bụrụ na ọ naghị agụ gị agụụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, rịọ Jehova ka o nyere gị aka mee ka ọrụ ikwusa ozi ọma tọwa gị ụtọ.—Luk 10:1, 17.
8. Olee otú itinye ihe dị n’Ilu 15:22 n’ọrụ nwere ike isi nyere gị aka ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?
8 Gị na ezinụlọ gị kwurịta banyere iwere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka dị ka ihe mgbaru ọsọ. (Ilu 15:22) Ikekwe, ezinụlọ unu nwere ike ịkwado otu onye ka ọ rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Kọọrọ ndị ọzọ gị na ha nọ n’ọgbakọ na ị chọrọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ, karịsịa, ndị ọnọdụ ha yiri nke gị. Nke a nwere ike ime ka ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka gụwa ndị ọzọ agụụ.
9. Olee ọnwa ndị i nwere ike ịhọrọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?
9 Ọ bụrụ na i leruo kalenda gị anya nke ọma, olee mgbe i chere ga-akara gị mma ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’afọ ije ozi na-abịanụ? Ọ bụrụ na ị bụ onye ọrụ ya na-adịghị enye ohere, ma ọ bụ nwa akwụkwọ, i nwere ike ịhọrọ ọnwa ndị nwere oge ezumike ma ọ bụkwanụ ọnwa ndị nwere Saturday ise ma ọ bụ Sunday ise. Dị ka ihe atụ, ọnwa September, December, March, na August nwere ngwụsị izu ise zuru ezu. Ọnwa May nwere Saturday ise, ọnwa June nwekwara Sunday ise. Ọ bụrụ na ahụ́ na-enye gị nsogbu, leenụ ma ị̀ ga-ahọrọ ọnwa ndị mmiri na-adịghị ezokarị. I nwekwara ike ịhọrọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ n’ọnwa onye nlekọta sekit ga-eleta ọgbakọ unu. N’oge ọ ga-eleta unu, ị ga-enwe ihe ùgwù ọzọ nke bụ́ isonye n’agba nke mbụ ná nzukọ ya na ndị ọsụ ụzọ oge nile ga-enwe. Ebe ọ bụ na Ncheta Ọnwụ Onyenwe Anyị n’afọ ọzọ ga-abụ na March 22, ọnwa March, April, na May ga-ama mma ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ozugbo ị họọrọ ọnwa ndị ị chọrọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, malite ide otú ị ga-esi rụzuo awa gị.
10. Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ị gaghị arụli ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?
10 A sịgodị na i chere na ị gaghị arụli ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’afọ ije ozi a anyị na-aga ịbanye, i nwekwara ike iji ịnụ ọkụ n’obi jee ozi ọma, dị ka ndị ọsụ ụzọ na-eme. Nọgide na-eme ihe nile i nwere ike ime n’ozi a. Obi siekwa gị ike na obi na-atọ Jehova ụtọ maka mgbalị i ji obi gị nile na-eme n’ozi ya. (Gal. 6:4) Na-akwado ndị na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, na-agbakwa ha ume. Ikekwe, i nwere ike ịhazigharị ihe omume gị iji nwee ike iso ndị ọsụ ụzọ jee ozi ọma n’etiti izu.
11. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mee ihe ngwa ngwa ugbu a?
11 Ndị Jehova maara na ọ dị mkpa ime ihe ngwa ngwa ugbu a. E nwere ọrụ anyị kwesịrị ịrụ—ọrụ ikwusa ozi ọma. Ndị mmadụ nọ n’ihe ize ndụ. Oge fọdụrụnụ dịkwa ntakịrị. (1 Kọr. 7:29-31) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na ndị agbata obi anyị nọ ga-akpali anyị ime ihe nile anyị nwere ike ime n’ozi Jehova. Ọ bụrụ na anyị etinye mgbalị ma hazie ihe omume anyị nke ọma, anyị ga-enwe ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, ọ dịkarịa ala, otu ọnwa n’ime afọ ije ozi na-abịanụ—nke a bụ ihe mgbaru ọsọ magburu onwe ya n’ezie!