Enyemaka nke Bịara n’Ezi Oge
1 Mgbe Pita onyeozi hụrụ na ọ dị mkpa iwusi ndị kwere ekwe ibe ya ike, nchegbu o nwere maka ha kpaliri ya inye ha ihe ncheta na agbamume ịhụnanya. (2 Pita 1:12, 13; 3:1) Ọ gbara “ndị nataworo okwukwe” ume ịnọgide na-eto eto n’àgwà ime mmụọ ka ha wee ghara ịghọ “ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ n’ihe metụtara ezi ihe ọmụma banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.” (2 Pita 1:1, 5-8) Nzube Pita bụ inyere ha aka ime ka ha jide ọkpụkpọ na nhọrọ ahụ ha natara n’aka Jehova n’aka, ka e wee nwee ike ‘ịhụ ha n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-agbaghị ọrụ na ndị nọ n’udo.’ (2 Pita 1:10, 11; 3:14) Nye ọtụtụ ndị, agbamume ya bụ enyemaka bịara n’ezi oge.
2 Taa, Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta na-enwe nchegbu dị otú ahụ maka ndị Chineke. ‘N’oge ndị a pụrụ iche bụ́ ndị siri ike obibi,’ ọtụtụ ndị ohu Jehova aghaghị ịnagide ọnọdụ ndị siri ike. (2 Tim. 3:1) N’ihi nsogbu ego, nke ezinụlọ, ma ọ bụ nke onwe onye ndị na-aga n’ihu, ụfọdụ pụrụ inwe mmetụta dị ka nke Devid: “Ihe ọjọọ na-adịghị ọnụ ọgụgụ agbawo m gburugburu, ajọ omume m nile eruwo m ahụ́, apụghịkwa m ịhụ ụzọ; ha karịrị agịrị isi nile nke isi m n’ụba, obi m ahapụwokwa m.” (Ọma 40:12) Nrụgide ndị a pụrụ ibu nnọọ ibu nke na ndị dị otú ahụ nwere ike ileghara ihe ime mmụọ ndị dị mkpa anya ma kwụsị ịdị na-ekeresi òkè ike n’ozi Ndị Kraịst. N’agbanyeghị ihe isi ike ndị ha nwere, ‘ha echezọbeghị ihe nile Jehova nyere n’iwu.’ (Ọma 119:176) Ugbu a bụ oge kwesịrị ekwesị ka ndị okenye nyere ndị dị otú ahụ aka n’ụzọ dị ha mkpa.—Aịsa. 32:1, 2.
3 Iji gboo mkpa a, a gbawo ndị okenye ume ime mgbalị pụrụ iche iji nyere ndị na-adịghị ekere òkè ugbu a n’ọrụ nkwusa aka. A na-eme mgbalị siri ike iji mezuo nke a ugbu a, a ga-anọgidekwa na-eme ya ruo ọnwa March. A na-agwa ndị nlekọta ọmụmụ akwụkwọ ka ha gaa leta ndị na-adịghị ejekwa ozi iji nyere ha aka n’ụzọ ime mmụọ n’ebumnobi nke inyere ha aka isoroghachi ọgbakọ na-arụ ọrụ. N’ebe ọ dị mkpa, a pụrụ ime ndokwa maka iduzi ọmụmụ Bible onwe onye. A pụrụ ịgwa ndị ọzọ ka ha nye aka. Ọ bụrụ na a kpọọ gị inye aka, mgbalị gị pụrụ ịba uru nke ukwuu, karịsịa ma ọ bụrụ na i jiri obiọma nye agbamume n’ụzọ na-egosi nchebara echiche.
4 E nwere ihe mere anyị nile ga-eji ṅụrịa ọṅụ mgbe mmadụ maliteghachiri iso ọgbakọ na-eje ozi. (Luk 15:6) Mgbalị anyị na-eme ịgba ndị na-adịghị ejekwa ozi ume pụrụ ịbụ “okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya.”—Ilu 25:11.