Igbe Ajụjụ
◼ Olee otú a pụrụ isi nyere onye na-adịghị ejekwa ozi ruo ogologo oge aka iru eru ọzọ dị ka onye nkwusa ozi ọma?
Mgbe onye na-adịghị ejekwa ozi gosipụtara ihe àmà na ya nwere ọchịchọ si n’obi ijere Jehova ozi, nke a na-enye ọṅụ. (Luk 15:4-6) Ma eleghị anya, onye ahụ kwere ka mmegide ma ọ bụ nrụgide nke ndụ kpagbuo ọmụmụ ihe onwe onye ọ na-enwe, ịga nzukọ, na ikere òkè n’ozi ubi. Olee otú a pụrụ isi nyere ya aka n’ụzọ kasị mma ka o wee nwee ọganihu ime mmụọ?
Anyị nile kwesịrị ibute ụzọ n’imesighachi onye a obi ike na anyị nwere ezi ịhụnanya ndị Kraịst n’ebe ọ nọ. Ndị okenye ga-adị ngwa ịchọpụta kpọmkwem mkpa ime mmụọ ya. (Jes. 5:14, 15) Ọ bụrụ na ọ bụ ruo nwa oge ka ọ na-ejekwaghị ozi, ọ pụrụ ịbụ nanị enyemaka nke onye nkwusa nwere ahụmahụ ga-adị mkpa iji mee ka onye ahụ maliteghachi ije ozi ubi. Otú ọ dị, ọ bụrụ na onye ahụ na-adịghị ejekwa ozi anọghị n’ọgbakọ ruo ogologo oge, ma eleghị anya, ọ ga-adị mkpa inyekwu aka. Iji wulite okwukwe na nghọta, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya iji otu akwụkwọ kwesịrị ekwesị na-enwe ọmụmụ Bible onwe onye. Ọ bụrụ otú ahụ, onye nlekọta ije ozi ga-eme ndokwa ka onye nkwusa ruru eru na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ. (Hib. 5:12-14; lee Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke November 1998.) Ọ bụrụ na ị maara onye enyemaka dị otú ahụ dị mkpa, gwa onye nlekọta ije ozi nọ n’ọgbakọ gị.
Tupu a gwa onye na-adịghị ejekwa ozi ruo ogologo oge ka o kere òkè n’ozi ọzọ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ka ndị okenye abụọ soro ya nọkọọ ịhụ ma o ruru eru dị ka onye nkwusa Alaeze. Ha ga-agbaso ụkpụrụ yiri nke ahụ e ji eme ihe mgbe e so ndị ọhụrụ chọrọ iru eru dị ka ndị nkwusa ozi ọma na-anọkọ. (Lee Ụlọ Nche nke November 15, 1988, peeji nke 16.) Onye ahụ na-adịghị ejekwa ozi kwesịrị inwe ọchịchọ siri ike isoro ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ. Ọ dịkwa ya mkpa iru ihe ndị bụ́ isi a chọrọ, bụ́ ndị e depụtara na peeji nke 98-99 n’akwụkwọ Ozi Anyị nakwa ịbịachi nzukọ ọgbakọ anya.
Inwe usoro ihe omume ime mmụọ dị mma ga-enyere onye ahụ na-alọghachi alọghachi aka nke ukwuu iwusi mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke ya na Jehova ike ma mee ka ọ dịgide nakwa ịnọgide na-eje ije n’ụzọ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi. (Mat. 7:14; Hib. 10:23-25) Ya itinye “oké mgbalị nile” [NW] na ịzụlite àgwà inwe ntachi obi dị ka onye Kraịst ga-egbochi ya ịghọghachi ‘onye na-adịghị arụkwa ọrụ na onye na-adịghị amị mkpụrụ,’ dị ka onye Kraịst na-eso ụzọ.—2 Pita 1:5-8.