Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/98 p. 7
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Echefula Ndị Na-adịghị Ejekwa Ozi
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • “Lọghachikwutenụ M”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Nyere Ha Aka Ịlọghachi n’Egbughị Oge!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 11/98 p. 7

Igbe Ajụjụ

◼ Ọ̀ ka kwesịrị ekwesị iduziri nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị na-adịghị ejekwa ozi ọmụmụ Bible ebe obibi site ná ntụziaka nke otu n’ime ndị so na Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ?

Ndị okenye nwere ibu ọrụ nke ilekọta ọgbakọ, gụnyere ndị ọ bụla nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị na-adịghị ejekwa ozi. Ha na-eleta ndị dị otú ahụ ma kpebie ụdị enyemaka dị mkpa. N’ebe o kwesịrị ekwesị, nke a pụrụ ịgụnye iduziri onye ahụ na-adịghị ejekwa ozi ọmụmụ Bible onwe onye. Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị, peji nke 104, na-akọwa na Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ga-ekpebi onye ga-erite uru site ná ndokwa dị otú ahụ.

Onye nlekọta ije ozi na-ekpebi onye ga-akasị mma inye ụdị enyemaka ahụ, isiokwu ndị a ga-amụ, na akwụkwọ ga-akasị baa uru. Ikekwe onye duziiri onye ahụ ọmụmụ ihe na mbụ ma ọ bụ onye ọ maara ma na-asọpụrụ ga-anọ n’ọnọdụ dị mma inye aka. A pụrụ ịgwa nwanna nwanyị ruru eru, nke tozukwara okè ka o nyere nwanna nwanyị na-adịghị ejekwa ozi aka. Ọ dịghị adịkebe mkpa ka onye nkwusa ọzọ sonyere onye ahụ e kenyere iduzi ọmụmụ ihe ahụ. Mgbe e kenyere ya mmadụ, onye nkwusa na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ pụrụ ịgụrụ awa, nletaghachi, na ọmụmụ ihe.—Lee Ozi Alaeze Anyị nke February 1989 peji nke 1-2.

Ebe onye ahụ a na-amụrụ ihe bụ onye e mere baptism, n’ozuzu ya ọ dịghị mkpa ka a nọgide na-enwe ọmụmụ ihe ahụ ruo ogologo oge. Nzube ya bụ inyere onye ahụ na-adịghị ejekwa ozi aka ịmaliteghachi bịawa nzukọ ọgbakọ dum na ịghọ onye nkwusa ozi ọma na-ejechi ozi anya. Onye nlekọta ije ozi ga-eleru anya n’ọganihu nke ọmụmụ ihe ndị dị otú ahụ. Ihe ga-esi n’enyemaka ịhụnanya a pụta kwesịrị ịbụ na ụmụnna nwoke na nwanyị ndị a ga-enwe ike iburu ibu ọrụ ha nwere n’ebe Jehova nọ ma ghọọ ndị ‘gbagidesiri mkpọrọgwụ’ ike n’eziokwu ahụ.—Efe. 3:17; Gal. 6:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya