Echefula Ndị Na-adịghị Ejekwa Ozi
1. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-agba ndị na-adịghị ejekwa ozi ume?
1 Ò nwere onye na-adịghị ejekwa ozi ị maara? Ikekwe, ọ kwụsịla ịbịa ọmụmụ ihe na ịga ozi ọma ozi ma kpafuo. Ọ pụrụ ịbụ na ị hụrụ onye ahụ mgbe ị nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ. Anyị aghaghị iburu n’uche na onye dị otú ahụ ka bụkwa nwanna anyị. Anyị kwesịrị igosi ya na anyị hụrụ ya n’anya ma nyere ya aka ịbataghachi n’ọgbakọ na ịlaghachikwuru ‘onye ọzụzụ atụrụ na onye nlekọta nke mkpụrụ obi anyị.’—1 Pita 2:25.
2. Olee otú anyị pụrụ isi gbaa onye nkwusa na-adịghị ejekwa ozi ume?
2 Gosi Ya na I Nwere Mmasị n’Ebe Ọ Nọ: Ọ bụrụ na anyị akpọọ onye na-adịghị ejekwa ozi na fon ma ọ bụ gaa leta ya n’ụlọ ya, obi pụrụ isi ya ike na anyị echefubeghị ya. Olee ihe anyị pụrụ ịgwa ya? Nanị ịgwa ya na anyị na-eche banyere ya pụrụ ịgba ya ume. Kwuo ihe ndị na-agaghị akpasu ya iwe na ihe ndị ga-agba ya ume. (Fil. 4:8) Anyị pụrụ ịgwa ya otu ihe masịrị anyị n’ọmụmụ ihe e nwere na nso nso ahụ. Anyị nwekwara ike ịkpọ ya ka ọ bịa ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ mgbakọ na-abịanụ, ma gwa ya na anyị ga-achọtara ya oche ma ọ bụ kwụọrọ ya ụgwọ ụgbọ.
3. Olee otú e si mee ka otu onye nkwusa na-adịghị ejekwa ozi maliteghachi ije ozi?
3 Otu nwanna nwanyị zutere otu onye nkwusa kwụsịrịla ije ozi ruo ihe karịrị afọ iri abụọ n’ókèala ha. Ọ bụ ezie na ọ chọghị ka a mụwara ya Bible, nwanna nwanyị ahụ gaghachiri na nke ya, ma nye ya magazin ndị ọhụrụ. Mgbe nwanna nwanyị ahụ lọtasịrị mgbakọ distrikti ha, ọ gara kọọrọ onye nkwusa ahụ na-adịghị ejekwa ozi isi ihe ndị e kwuru ná mgbakọ ahụ, n’ikpeazụ ọ maliteghachiri ije ozi.
4. Olee otú anyị kwesịrị isi mesoo onye nkwusa maliteghachiri ịbịa ọmụmụ ihe?
4 Mgbe Ọ Bataghachiri n’Ọgbakọ: Ọ bụrụ na onye nkwusa na-adịghị ejekwa ozi amaliteghachi ịbịa ọmụmụ ihe, olee otú anyị kwesịrị isi mesoo ya ihe? Oleedị otú Jizọs si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe mgbe ha hapụrụ ya ruo nwa oge? O ji obi ụtọ kpọọ ha “ụmụnna” ya ma gosi na obi siri ya ike n’ebe ha nọ. O nyedịrị ha ọrụ dị oké mkpa ịrụ. (Mat. 28:10, 18, 19) Obere oge ka nke ahụ gasịrị, ha kwusawara ozi ọma n’ike n’ike “n’esepụghị aka.”—Ọrụ 5:42.
5. Kwuo ihe ndị ọ ga-abụ anyị mewe n’ebe onye nkwusa na-adịghị ejekwa ozi nọ, anyị eburu ụzọ mee ka ndị okenye mara.
5 Tupu anyị eduziwere onye na-adịghị ejekwa ozi ọmụmụ Bible ma ọ bụ gwa ya ka o soro anyị jee ozi, anyị kwesịrị ịnata ntụziaka n’aka ndị okenye. Ọ bụrụ na anyị ahụ onye nkwusa na-adịghị ejekwa ozi n’ókèala anyị, anyị kwesịrị ime ka ndị okenye mara, ka ha wee nye aka n’ebe ndị ọ dị mkpa.
6. Olee ụdị ọṅụ anyị pụrụ inweta site n’inyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka?
6 Dị ka Bible gosiri n’ụzọ doro anya, ọ bụ nanị ndị gbaara ọsọ ndụ a ruo n’isi ga-enweta nzọpụta. (Mat. 24:13) Ya mere, mata ndị ọ pụrụ ịbụ na ike ife ezi ofufe agwụla ha ma ọ bụ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha akpafuola. Ọ bụrụ na anyị ejiri ndidi na-egosipụta ụdị ịhụnanya Jehova nwere site n’iji obi ọcha egosi ụdị ndị a na anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ, anyị pụrụ inweta ọṅụ nke ịhụ ha ka ha maliteghachiri iso anyị na-eje ozi dị nsọ.—Luk 15:4-10.