Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite na February 26, 2007. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu January 1 ruo February 26, 2007. [Ihe Ị Ga-arịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Olee mgbe anyị kwesịrị ime ka uru okwu anyị bara doo anya, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee ya? [be-IB p. 158 para. 2-4]
2. Olee ihe mere o ji dị mkpa inyere ndị ọzọ aka ịhụ uru okwu anyị na-agwa ha bara, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee ya? [be-IB p. 159 para. 3-4]
3. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-ahọ okwu ndị anyị ji eme ihe ahọ? [be-IB p. 160]
4. Olee ihe ga-enyere anyị aka iji okwu dịgasị iche iche na-eme ihe otú kwesịrị ekwesị? [be-IB p. 161 para. 5-6; p. 162 para. 1, 4]
5. Olee uru ụfọdụ ọ bara ikwu okwu site n’isi ihe e bu n’isi ma ọ bụ nke e depụtara edepụta? [be-IB p. 166 para. 1-3]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee otú onye e kenyere ịgụ ihe ọgụgụ ga-esi kwadebe ya? [be-IB p. 43 para. 2, 4]
7. Olee ihe ọ dị mkpa ka anyị mee ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịhụ ezi ihe n’anya otú Jehova si hụ ya ma kpọọ ihe ọjọọ asị otú O si kpọọ ya? (Hib. 5:14) [w05-IB 1/1 p. 9 para. 11]
8. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na o nwere ihe anyị gụtara na Bible nke na-eme ka anyị nwee obi abụọ ma Chineke ò mere ihe n’ụzọ ziri ezi? [w05-IB 2/1 p. 24 para. 7]
9. Gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe iwu ụmụ mmadụ nyere megidere iwu Chineke nyere? [w05-IB 4/15 p. 12 para. 9]
10. Olee ihe ndị o yiri ka ọ̀ bụ ha bụ ‘ime ụlọ’ ahụ taa, oleekwa otú ha si abara anyị uru? (Aịsa. 26:20) [w01-IB 3/1 p. 21 para. 17]
ỌGỤGỤ BIBLE DỊỊRỊ IZU
11. Gịnị bụ “ihe mfụchi ahụ” na “ihe mkpuchi ahụ” e kwuru banyere ha n’Aịsaịa 25:7?
12. Olee otú ndị mmadụ pụrụ isi ‘hụ’ ma ‘nụ’ olu Jehova? (Aịsa. 30:20, 21)
13. Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha: O nweghị ihe ọzọ kpaliri Hezekaịa ikpe ekpere ahụ e dekọrọ n’Aịsaịa 38:3 ma ọ́ bụghị na ọ chọrọ ka ya dịtụkwuo ndụ.
14. Olee otú ụmụ Izrel pụrụ isi gosi na ha bụ ndịàmà Jehova, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ha? (Aịsa. 43:10)
15. Dị ka amụma e buru n’Aịsaịa 52:11, 12 si kwuo, gịnị ka a chọrọ iji ruo eruo ‘ibu ihe dị iche iche nke Jehova’?