IHE ỌMỤMỤ NKE 24
Okwu Ndị A Họọrọ Iji Mee Ihe
OKWU bụ ngwá ọrụ dị ike e ji enwe nkwurịta okwu. Ma ka okwu anyị wee mezuo otu nzube kpọmkwem, ọ dị mkpa ka anyị jiri nlezianya họrọ ha. Okwu nke pụrụ ịdaba adaba n’otu ọnọdụ nwere ike inwe mmetụta na-adịghị mma mgbe e nwere ọnọdụ dị iche. Mgbe e ji ya mee ihe n’ụzọ na-adabaghị adaba, okwu dị ụtọ nwere ike ịghọ “okwu na-akpasu iwe.” Iji ụdị okwu ndị ahụ eme ihe pụrụ nnọọ ịbụ echeghị echiche, na-egosipụta echebaraghị ndị ọzọ echiche. Okwu ụfọdụ na-apụta ihe abụọ, otu n’ime ha pụrụ ịdị na-akpasu iwe ma ọ bụ na-eweda mmadụ ala. (Ilu 12:18; 15:1) N’aka nke ọzọ, “okwu ọma”—okwu na-enye agbamume—na-eme ka obi nke onye a gwara ya ṅụrịa. (Ilu 12:25) Ịchọta okwu ndị kwesịrị ekwesị na-achọ mgbalị, ọbụna nye onye maara ihe. Bible na-agwa anyị na Solomọn maara mkpa ọ dị ịchọ “okwu nile na-atọ ụtọ” na “okwu nile nke eziokwu.”—Ekli. 12:10.
N’asụsụ ụfọdụ, a na-eji okwu ụfọdụ eme ihe mgbe a na-agwa ndị tọrọ mmadụ ma ọ bụ ndị nwere ikike okwu, ma a na-eji okwu dị iche eme ihe mgbe mmadụ na-agwa ndị ọgbọ ya ma ọ bụ ndị ọ tọrọ okwu. A na-ewere ileghara ezi àgwà ndị dị otú ahụ anya dị ka enweghị nsọpụrụ. O kwesịghịkwa ekwesị bụ́ mmadụ iji okwu nkwanye ùgwù ndị a na-eji eme ihe maka onye ọzọ, dị ka omenala obodo si dị, mee ihe banyere onwe ya. N’okwu banyere igosi nsọpụrụ, Bible setịpụrụ ụkpụrụ dị elu karịa ihe iwu ma ọ bụ omenala obodo pụrụ ịchọ. Ọ na-agba Ndị Kraịst ume ka ha ‘sọpụrụ mmadụ nile.’ (1 Pita 2:17) Ndị ji obi ha na-eme ya na-agwa ndị nọ n’afọ ndụ nile okwu n’ụzọ nkwanye ùgwù.
Otú ọ dị, ọtụtụ ndị na-abụghị ezi Ndị Kraịst na-eji okwu na-adịghị egosi nkwanye ùgwù na okwu ọjọọ eme ihe. Ha pụrụ iche na iji okwu ọjọọ eme ihe na-emesikwu ihe ha na-ekwu ike. Ma ọ bụkwanụ ojiji ha na-eji ya eme ihe pụrụ nanị igosi na ha amatụghị okwu ndị a pụrụ iji mee ihe. Ọ bụrụ na ọ maara mmadụ ahụ́ ịdị na-eji ụdị okwu ahụ eme ihe tupu ya amụta ụzọ Jehova, ọ pụrụ isiri ya ike ịkwụsị. Ma, ọ ga-akwụsịli ya. Mmụọ Chineke pụrụ inyere mmadụ aka ịgbanwe otú o si ekwu okwu. Otú ọ dị, onye ahụ aghaghị ịdị njikere ịmụta ọtụtụ okwu ọma—okwu ndị na-enye ihe dị ụtọ, okwu ndị na-ewuli elu—mgbe ahụ jiri ha na-eme ihe mgbe nile.—Rom 12:2; Efe. 4:29; Kọl. 3:8.
Okwu A Na-aghọta Ngwa Ngwa. Otu isi ihe a chọrọ n’ikwu okwu dị mma bụ ka a na-aghọta ya ngwa ngwa. (1 Kọr. 14:9) Ọ bụrụ na ndị na-ege gị ntị adịghị aghọta okwu ị na-ekwu ngwa ngwa, ị ga-adị ha ka onye na-asụ asụsụ ọzọ.
Okwu ụfọdụ nwere ihe pụrụ iche ha pụtara nye ndị na-arụ otu ụdị ọrụ. Ha pụrụ ịdị na-eji ụdị okwu ndị ahụ eme ihe kwa ụbọchị. Ma gị iji ha eme ihe n’ebe na-ekwesịghị ekwesị pụrụ ime ka ị ghara inwe ike inye ihe ọmụma. Ọzọkwa, ọ bụrụgodị na e ji okwu ndị e ji eme ihe kwa ụbọchị mee ihe, ọ bụrụ na i nye nkọwa gabigara ókè, ndị na-ege gị ntị pụrụ itinye uche ha n’ihe ndị ọzọ.
Ọkà okwu nke na-echebara ndị ọzọ echiche na-ahọrọ okwu ndị ọbụna ndị na-agụghị oké akwụkwọ pụrụ ịghọta. N’iṅomi Jehova, ọ na-echebara “onye na-enweghị ike” echiche. (Job 34:19) Ọ bụrụ na ọkà okwu ahụ na ọ dị mkpa iji okwu a na-amachaghị mee ihe, mgbe ahụ o kwesịrị iwebata ya ná nkebi ahịrịokwu ndị dị mfe ndị ga-eme ka a ghọta ihe ọ pụtara.
Okwu ndị dị mfe, ndị e ji nlezianya họrọ na-ewepụta echiche dị n’okwu n’ụzọ dị ike. Ahịrịokwu ndị dị mkpirikpi na nkebi ahịrịokwu ndị na-ataghị akpụ na-adị mfe nghọta. A pụrụ ịtụgwa ha na ahịrịokwu ndị toro ogologo karị ka okwu gị wee ghara ịghọ ihe e gbubisịrị egbubisị. Ma, maka echiche okwu ndị ị chọrọ ka ndị na-ege gị ntị cheta karịsịa, họrọ okwu ndị dị mfe na ahịrịokwu ndị dị nkenke.
Ihe E Kwuru Inwetụ Ọdịiche na Ịbụ nke Ziri Ezi. Okwu ọma adịghị ụkọ. Kama iji otu okwu ahụ na-eme ihe maka ọnọdụ ọ bụla, jiri okwu dịgasị iche iche na-eme ihe. Mgbe ahụ okwu gị ga-adị ụtọ ma kwe nghọta. Olee otú ị pụrụ isi mụbaa okwu ndị i ji eme ihe?
Mgbe ị na-agụ ihe, na-akanye akara n’okwu ọ bụla ị na-aghọtachaghị, chọọkwa ha n’akwụkwọ ọkọwa okwu ma ọ bụrụ na e nwere ya n’asụsụ unu. Họrọ okwu ole na ole n’ime ha, meekwa ezigbo mgbalị iji ha na-eme ihe mgbe o kwesịrị ekwesị. Lezie anya ka ị na-akpọzi ha akpọzi, jirikwa ha mee ihe n’ebe a ga-aghọta ha ngwa ngwa ọ bụghị nanị iji dọta mmasị. Ịmụba okwu ndị i ji eme ihe ga-eme ka okwu gị dịtụ iche. Ma ọ dị mkpa ịkpachara anya—mgbe mmadụ kpọhiere okwu ma ọ bụ jiri okwu mee ihe n’ụzọ na-adabaghị adaba, ndị ọzọ pụrụ ikwubi na ọ maghị ihe ọ na-ekwu n’ezie.
Nzube anyị ga-eji mụbaa okwu ndị anyị ji eme ihe bụ iji mee ka ndị na-ege anyị ntị nweta ihe ọmụma, ọ bụghị ka ha wee jaa anyị mma. Okwu ndị dị ogologo, ndị sikwara ike nghọta yiri ka ha na-adọta uche n’ebe ọkà okwu nọ. Ọchịchọ anyị kwesịrị ịbụ inye ihe ọmụma bara uru na ime ka ọ dị ndị na-anụ ya ụtọ. Cheta ilu Bible bụ́: “Ire ndị maara ihe na-eme ka ihe ọmụma dị mma.” (Ilu 15:2) Iji okwu ndị dị mma, okwu ndị dabara adaba, bụ́ ndị a na-aghọta ngwa ngwa eme ihe, na-enye aka eme ka okwu anyị dị ụtọ ma na-akpali akpali kama ịbụ nke na-adịghị ekpo ọkụ na nke na-adịghị ụtọ.
Ka ị na-amụba okwu ndị ị na-eji eme ihe, lezie nnọọ anya ịdị na-eji okwu ndị kwesịrị ekwesị na-eme ihe. Okwu abụọ pụrụ iyitetụ n’ihe ha pụtara ma ha pụrụ ịdịtụ iche mgbe e ji ha mee ihe n’ọnọdụ dịgasị iche iche. Ọ bụrụ na ị mata nke a, ị ga-enwe ike ime ka ihe ị na-ekwu dokwuo anya ma zere ịkpasu ndị na-ege gị ntị iwe. Ṅaa ndị na-ekwu okwu nke ọma ntị. Ụfọdụ akwụkwọ ọkọwa okwu na-edepụta n’okpuru okwu nke ọ bụla ma okwu ndị yiri ya (okwu ndị yitetụrụ ya n’ihe ha pụtara, ọ bụ ezie na ha abụghị otu ihe ahụ) ma okwu ndị na-emegide ya (okwu ndị ihe ha pụtara na-emegidetụ ya). N’ụzọ dị otú a ị ga-achọta ọ bụghị nanị okwu dịgasị iche iche maka otu echiche ahụ kamakwa ndị nwere ntakịrị ọdịiche n’ihe ha pụtara. Nke a na-enye nnọọ aka mgbe ị na-achọ okwu kwesịrị ekwesị maka otu ọnọdụ. Tupu ị gụnye otu okwu n’okwu ndị i ji eme ihe, jide n’aka na ị maara ihe ọ pụtara, otú e si akpọ ya, na mgbe e kwesịrị iji ya mee ihe.
Okwu ndị nwere otu ihe ha pụtara kpọmkwem na-enyekarị echiche ka doo anya karịa ndị pụtara ihe karịrị otu ihe. Ọkà okwu pụrụ ikwu, sị: “N’oge ahụ, ọtụtụ mmadụ dara ọrịa.” Ma ọ bụ ọ pụrụ ikwu, sị: “Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, n’ime ọnwa ole na ole, ọrịa oké ahụ́ ọkụ Spen gburu ihe dị ka mmadụ 21,000,000.” Lee ka ọ ga-esi doo anya karị mgbe ọkà okwu kwuru n’ụzọ doro anya ihe o bu n’obi mgbe ọ sịrị “n’oge ahụ,” “ọtụtụ mmadụ,” na “dara ọrịa”! Ọ ga-adị mkpa na ị ga-amata ihe ndị metụtara isiokwu gị nakwa iji nlezianya họrọ okwu ndị ị ga-eji mee ihe iji wee kwupụta ihe i bu n’obi n’ụzọ dị otú a.
Iji okwu kwesịrị ekwesị eme ihe pụkwara inyere gị aka iwepụta isi ihe dị n’okwu n’ekwughị ọtụtụ okwu. Ikwu ọtụtụ okwu yiri ka ọ na-eme ka echiche dị n’okwu ghara ido anya. Ime ka ọ dị mfe na-eme ka ndị ọzọ ghọta ma na-echeta isi ihe ndị dị mkpa ngwa ngwa karị. Ọ na-enye aka inye ihe ọmụma ziri ezi. Izi ihe Jizọs Kraịst bụ nke kwesịrị ịrịba ama n’ihi ịdị mfe nke okwu ndị o jiri mee ihe. Mụta ihe site n’aka ya. (Lee ihe atụ ndị e dekọrọ na Matiu 5:3-12 na Mak 10:17-21.) Mụgharịa iji okwu ndị e ji nlezianya họrọ kwupụta ihe i bu n’obi n’ụzọ dị nkenke.
Okwu Ndị Na-eme Ka Okwu Kpoo Ọkụ, Nwee Mmetụta, Ma Dị Ụtọ. Ka ị na-amụba okwu ndị ị na-eji eme ihe, na-eche echiche ọ bụghị nanị maka okwu ndị ọhụrụ kamakwa okwu ndị nwere ọdịdị ụfọdụ kpọmkwem. Dị ka ihe atụ, tụlee ngwaa ndị na-eme ka okwu kpoo ọkụ; nkọwaaha ndị na-eme ka okwu dị ụtọ; na okwu ndị na-egosi mmetụta ịhụnanya, ndị na-egosi obiọma, ma ọ bụ iji ihe kpọrọ ihe.
N’ime Bible, e nwere ọtụtụ ihe atụ nke ụdị okwu ndị doro anya dị otú ahụ. Site n’ọnụ Emọs onye amụma, Jehova gbara ume, sị: “Chọọnụ ezi ihe, achọkwala ihe ọjọọ . . . Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụnụ ezi ihe n’anya.” (Emọs 5:14, 15, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Samuel onye amụma gwara Eze Sọl, sị: “Jehova adọwapụwo alaeze Izrel n’ahụ́ gị taa.” (1 Sam. 15:28, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Mgbe ọ na-agwa Ezikiel okwu, Jehova jiri okwu siri ike ichefu mee ihe, na-asị: “Ụlọ Izrel nile bụ ndị nwere egedege ihu siri ike, ọ bụkwa ndị obi ha siri ike ka ha bụ.” (Ezik. 3:7, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) N’imesi ịdị njọ nke mmehie Izrel ike, Jehova jụrụ, sị: “Mmadụ, ọ̀ ga-apụnara Chineke ihe? ma unu na-apụnara m ihe.” (Mal. 3:8, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ka ọ na-akọwa ule nke okwukwe na Babilọn, Daniel kọrọ n’ụzọ doro anya na “Nebukadneza jupụtara n’ọnụma” n’ihi na Shedrak, Mishak, na Abednego jụrụ ife ihe oyiyi ya ofufe, n’ihi ya o nyere iwu ka e kee ha agbụ ma tụba ha “n’oké ọkụ na-enwu ajọ onwunwu.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Iji nyere anyị aka ịghọta otú okpomọkụ ya ruru, Daniel kọrọ na eze mere ka ndị ikom ya “mee oké ọkụ ahụ ka ọ dị ọkụ ugboro asaa karịa otú a na-emerịị ka ọ dị ọkụ”—dị oké ọkụ nke na mgbe ha bịaruru nso, oké ọkụ ahụ gburu ndị ikom eze. (Dan. 3:19-22, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Mgbe ọ nọ na-agwa ndị nọ na Jeruselem okwu ụbọchị ole na ole tupu ya anwụọ, Jizọs ji oké mmetụta kwuo, sị: “Lee ọtụtụ ugboro m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị, dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya! Ma unu achọghị ya. Lee! A gbahapụworo unu ụlọ unu.”—Mat. 23:37, 38.
Okwu ndị e ji nlezianya họrọ pụrụ ime ka ndị na-ege gị ntị jiri uche ha see onyinyo ndị doro anya. Ọ bụrụ na i jiri okwu ndị na-akpali ikike ịghọta ihe mee ihe, ndị na-ege gị ntị “ga-ahụ” ma “bitụ” ihe ndị ị na-ekwu maka ha aka, “detụ ire,” ma “nụ ísì” ihe oriri ndị ị na-ezo aka na ha, “nụkwa” ụda ndị ị na-akọwa nakwa okwu nke ndị ị na-ehota ihe ha kwuru. Ndị na-ege ntị ga-etinye uche ha nile n’ihe ị na-ekwu n’ihi na ị na-eme ka ọ na-akpali ha akpali.
Okwu ndị na-ewepụta echiche dị n’okwu n’ụzọ doro anya pụrụ ime ka ndị mmadụ chịa ọchị ma ọ bụ bee ákwá. Ha pụrụ ime ka e nwee olileanya, na-eme ka onye nwere nkụda mmụọ nwee ọchịchọ ịdị ndụ ma kpasuo n’ime ya ịhụnanya maka Onye Okike ya. Olileanya nke ihe ndị e kwuru n’akụkụ Bible ndị dị ka Abụ Ọma 37:10, 11, 34: Jọn 3:16; na Mkpughe 21:4, 5 na-enye enwewo mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ndị mmadụ gburugburu ụwa.
Ka ị na-agụ Bible na akwụkwọ dị iche iche nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” ị ga-ahụ ụdị okwu na nkebi ahịrịokwu dịgasị iche iche. (Mat. 24:45) Elegharala ha anya. Họrọ ndị i nwere mmasị na ha, gụnyekwa ha n’okwu ndị ị ga-eji na-eme ihe.
Okwu Ndị Kwekọrọ n’Ụkpụrụ Na-achị Ụtọ Asụsụ. Ụfọdụ ndị na-achọpụta na okwu ha nwere ike ọ gaghị na-ekwekọcha mgbe nile n’ụkpụrụ na-achị ụtọ asụsụ. Ma olee ihe ha nwere ike ime banyere ya?
Ọ bụrụ na ị ka na-aga akwụkwọ, jiri ohere i nwere ugbu a mụta ụtọ asụsụ dị mma na iji nlezianya na-ahọrọ okwu. Ọ bụrụ na i jighị n’aka ihe mere e ji nwee otu ụkpụrụ na-achị ụtọ asụsụ, jụọ onye nkụzi gị. Amụla ihe nanị ka i wee lafere. I nwere ihe mkpali nke ọ pụrụ ịbụ na ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ enweghị. Ị chọrọ ịbụ onye ozi dị irè nke ozi ọma ahụ.
Gịnị ma ọ bụrụ na i mewo okenye karị, nakwa na asụsụ ị na-asụ ugbu a dị iche na nke i ji tolite? Ma ọ bụ ikekwe i nwekebeghị ohere iji mụọ asụsụ gị. Enwela nkụda mmụọ. Kama nke ahụ, mee ezi mgbalị iji meziwanye ihe, na-eme otú ahụ n’ihi ozi ọma ahụ. Anyị mụtara ihe dị ukwuu n’ihe anyị maara banyere ụtọ asụsụ site n’ige ndị ọzọ ntị mgbe ha na-ekwu okwu. Ya mere na-ege ntị nke ọma mgbe ndị ọkà okwu nwere ahụmahụ na-ekwu okwu. Mgbe ị na-agụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible, na-arịba ama otú e si hazie ahịrịokwu dị iche iche, okwu ndị e ji mekọta ihe ọnụ, na ebe ndị e jiri ha mee ihe. Ṅomie ihe nlereanya ọma ndị a n’okwu nke gị.
Ndị a ma ama n’ime ihe ntụrụndụ na ndị na-agụ egwú pụrụ ikwu okwu na iji okwu ndị na-emegide ụtọ asụsụ mee ihe. Ndị mmadụ na-eṅomikarị ndị dị otú ahụ. Ọtụtụ mgbe, ndị na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ na ndị ọzọ bụ́ ndị ụzọ ndụ ha dum bụ ime mpụ ma ọ bụ ime omume rụrụ arụ na-enwe okwu ndị nke ha bụ́ ndị ha na-eji eme ihe, na-enye okwu dị iche iche nkọwa ndị dị iche n’ihe ha pụtara nye onye nkịtị. Ọ bụghị ihe amamihe dị na ya bụ Ndị Kraịst iṅomi nke ọ bụla n’ime ndị a. Ime otú ahụ ga-eme ka a gụkọta anyị na ndị ụwa dị otú ahụ na ụzọ ndụ ha.—Jọn 17:16.
Mee ka ọ bụrụ omume gị iji okwu dị mma na-eme ihe kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na i kwe ka otú i si ekwu okwu ná mkparịta ụka ị na-enwe kwa ụbọchị ghọọ ihe ị na-eme na-ejighị nlezianya, atụla anya na ị ga-enwe ike ikwu okwu nke ọma n’ọnọdụ ndị pụrụ iche. Ma ọ bụrụ na ị na-eji okwu ndị dị mma eme ihe kwa ụbọchị, ọ ga-adịrị gị mfe, ọ ga-abịa n’onwe ya mgbe ị nọ n’elu ikpo okwu ma ọ bụ mgbe ị na-agbara ndị ọzọ àmà banyere eziokwu ahụ.