IHE ỌMỤMỤ NKE 28
N’ụzọ Mkparịta Ụka
AHỤ́ na-erukarị ndị mmadụ ala mgbe ha na ndị enyi ha na-enwe mkparịta ụka. Okwu ha na-abịara onwe ya. Ndị ụfọdụ na-adị gara gara n’ikwu okwu; ndị ọzọ na-anọ jụụ karị. Ka o sina dị, ikwu okwu ahụ otú i si ekwu okwu na-adọrọ mmasị.
Otú ọ dị, mgbe ị na-agakwuru onye ị na-amabughị, ọ bụghị ihe kwesịrị ekwesị ịgwa ya okwu dị ka onye ị maara nke ọma ma ọ bụ onye ị mabu. N’ezie, n’ebe ụfọdụ a na-amalite mkparịta ụka nile e so ndị a na-amabughị na-enwe n’ụzọ omenala. Mgbe e gosichara nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị, mgbe ahụ, n’iji akọ eme ihe, ọ pụrụ ịdị mma ikwu okwu n’ụzọ mkparịta ụka, n’ụzọ na-agaghị abụcha ịgbaso otu ụkpụrụ.
Mgbe ị nọ n’elu ikpo okwu na-ekwu okwu, ị ghaghịkwa ilezi anya. Ịtụsara ahụ́ gabiga ókè na-ewetu ịdị ùgwù nke nzukọ Ndị Kraịst nakwa ịdị mkpa nke ihe a na-ekwu, ala. N’asụsụ ụfọdụ, a na-achọ ka e jiri okwu ụfọdụ mee ihe mgbe mmadụ na-agwa onye tọrọ ya, onye nkụzi, onyeisi, ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna, okwu. (Rịba okwu ndị e ji mee ihe n’Ọrụ 7:2 nakwa 13:16 ama.) A na-eji okwu ndị dị iche eme ihe mgbe mmadụ na-agwa di ma ọ bụ nwunye ya ma ọ bụ ezigbo enyi ya okwu. Ọ bụ ezie na ụzọ anyị si ekwu okwu n’elu ikpo okwu ekwesịghị ịbụ nke na-agbasobiga otu ụkpụrụ ókè, o kwesịrị ịbụ n’ụzọ nkwanye ùgwù.
Otú ọ dị, ọ dị ihe ndị pụrụ ime ka otú mmadụ si ekwu okwu yie nke ilezibiga anya ókè ma ọ bụ nke ịgbaso otu ụkpụrụ. Otu n’ime ha bụ otú e si hazie ahịrịokwu ahụ. A na-enwe ihe isi ike mgbe ọkà okwu na-agbalị ikwu ihe e dere n’akwụkwọ kpọmkwem otú e si dee ya. Okwu e dere ede na-adịkarị iche n’okwu a na-ekwu ekwu. N’eziokwu, a na-ejikarị akwụkwọ ndị e bipụtara ebipụta eme nnyocha mgbe a na-akwadebe okwu. Ikekwe, ọ na-abụ n’ihe ndepụta e biri ebi ka okwu ahụ dabeere. Ma ọ bụrụ na i kwupụta echiche ndị dị na ya kpọmkwem otú e si bie ha ma ọ bụ gụpụta ha kpọmkwem site n’ihe ndepụta e biri ebi mgbe ị na-ekwu okwu gị, o yighị ka okwu gị ọ ga-adị ka mkparịta ụka. Iji nọgide na-ekwu okwu n’ụzọ mkparịta ụka, kwupụta echiche ndị dị na ya n’okwu nke aka gị ma zere ahịrịokwu ndị na-akwụchaghị ọtọ.
Ihe ọzọ bụ ịgbanwe otú i si na-ekwu okwu ọsọ ọsọ. Okwu e ji oké nlezianya na-ekwu ma na-agbaso otu ụkpụrụ na ya na-agụnyekarị inye ohere ha nhata gabiga ókè mgbe a na-ekwu okwu nakwa ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ n’okwu nke na-adịtụghị agbanwe agbanwe. Ná mkparịta ụka nkịtị, a na-enwe mgbanwe n’otú e si ekwu okwu ọsọ ọsọ, na-enwekwa nkwụsịtụ ndị na-ahaghị nhata site n’oge ruo n’oge.
Mgbe ị na-agwa ìgwè buru ibu okwu, i kwesịrị ijikọta ikwu okwu n’ụzọ mkparịta ụka na iwelikwu olu gị elu, itinyekwu ume na ya, na ịnụ ọkụ n’obi iji mee ka ha nọgide na-ege ntị.
Iji jiri ụzọ mkparịta ụka nke kwesịrị ekwesị maka ozi na-eme ihe, ọ dị mkpa ka ịdị na-ekwu okwu nke ọma kwa ụbọchị mara gị ahụ́. Nke a apụtaghị na ị ghaghị ịgụ ezigbo akwụkwọ. Ma ọ dị mma ịzụlite nkà ikwu okwu ndị ga-eme ka ndị ọzọ jiri nkwanye ùgwù na-ege ntị n’ihe ị na-ekwu. N’iburu nke ahụ n’uche, chee echiche ma ọ̀ dị gị mkpa ịrụ ọrụ n’isi ihe ndị na-esonụ ná mkparịta ụka ị na-enwe kwa ụbọchị.
Zere okwu ndị na-emegide ụtọ asụsụ ma ọ bụ ndị na-eme ka a gụnye gị ná ndị ụzọ ndụ ha na-emegide ụkpụrụ Chineke. N’ikwekọ na ndụmọdụ dị ná Ndị Kọlọsi 3:8, zere okwu ọjọọ ma ọ bụ okwu rụrụ arụ. N’aka nke ọzọ, okwu ndị e ji eme ihe nanị ná mkparịta ụka adịghị njọ. Okwu ndị e ji eme ihe nanị ná mkparịta ụka, ma ọ bụkwanụ okwu ndị e ji eme ihe kwa ụbọchị, bụ okwu ndị a na-adịghị ede ede n’akwụkwọ, ma ha bụ okwu ndị kwesịrị ekwesị.
Zere iji otu okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu na-eme ihe mgbe nile iji kwupụta echiche ọ bụla dị iche ị pụrụ inwe. Mụta iji okwu ndị na-akọwapụta ihe i bu n’uche n’ụzọ doro anya na-eme ihe.
Zere ịkwụsị ma kwughachi n’ụzọ na-adịghị mkpa ihe i kwuru site n’ime ka ihe ị chọrọ ikwu doo gị anya n’uche gị; mgbe ahụ malite ikwu okwu.
Zere iji ọtụtụ okwu kwuchie echiche okwu ndị dị mma. Mee ka ọ mara gị ahụ́ iji ahịrịokwu dị mfe kwupụta n’ụzọ doro anya isi ihe ọ dị mkpa ka e cheta.
Kwuo okwu n’ụzọ na-egosi nkwanye ùgwù maka ndị ọzọ.