Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 14 p. 128-p. 130 para. 4
  • Ikwu Okwu Otú I Si Ekwu Okwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikwu Okwu Otú I Si Ekwu Okwu
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ụzọ Mkparịta Ụka
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ikwu Okwu Ka Ebe Mmadụ na Ibe Ya Na-akparịta Ụka
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • Ịkwadebe Okwu Onye Mmụta Maka Ụlọ Akwụkwọ
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 14 p. 128-p. 130 para. 4

IHE ỌMỤMỤ NKE 14

Ikwu Okwu Otú I Si Ekwu Okwu

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Kwuo okwu otú i si ekwu okwu—n’ụzọ mkparịta ụka, n’obi eziokwu, n’agbanweghịkwa otú i si ekwu okwu.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Ọ bụrụ na ahụ́ na-ama gị jijiji, ahụ́ erughị gị ala, ma ọ bụ na ị tụsaraghị ahụ́ mgbe ị na-ekwu okwu n’ihi na ị maghị ihe ndị ọzọ na-eche, a pụrụ ịdọpụ uche ndị ọzọ n’ihe ị na-ekwu.

IKWU okwu otú i si ekwu okwu na-enyere gị aka ime ka ndị ọzọ nwee obi ike n’ebe ị nọ. Ị̀ ga-atụkwasị ihe onye ji olu onye ọzọ na-agwa gị okwu na-ekwu obi? Ọ̀ ga-eme ka ị tụkwasịkwuo ya obi ma ọ bụrụ na olu o ji na-agwa gị okwu mara mma karịa olu ya? O yighị ka ọ ga-eme. Ya mere kama ịgbanwe otú i si ekwu okwu, kwuo okwu otú i si ekwu okwu.

E kwesịrị ịghọta ọdịiche dị n’ikwu okwu otú i si ekwu okwu na akpacharaghị anya. Ụtọ asụsụ nke na-adabaghị adaba, ịkpọhie okwu, na ekwupụtaghị okwu nke ọma ekwesịghị ekwesị. E kwesịkwara izere àkụ̀kụ̀. Anyị kwesịrị ịdị na-enwe nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị mgbe nile, ma n’okwu ma n’omume anyị. Onye na-ekwu okwu otú o si ekwu okwu adịghị agbasobiga otu ụkpụrụ ókè ma ọ bụ na-echegbubiga onwe ya ókè banyere ime ihe ga-amasị ndị ọzọ.

N’ozi Ubi. Ahụ́ ọ̀ na-ama gị jijiji mgbe ị na-abịaru ụlọ nso ma ọ bụ na-agakwuru mmadụ n’ebe ọha na eze na-anọ iji gbaara ya àmà? Ọ na-eme ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị, ma ọ na-eme ụfọdụ ndị ruo ogologo oge karịa ndị ọzọ. Ahụ́ erughị ala pụrụ ime ka ụda olu gbakatụ agbaka ma ọ bụ na-ama jijiji, ma ọ bụ ahụ́ ịma jijiji pụrụ ịpụta ìhè n’imegharị aka ma ọ bụ isi n’ụzọ na-enweghị isi.

Ọtụtụ ihe pụrụ ime ka onye nkwusa nwee nsogbu a. Ikekwe ọ na-eche otú ndị mmadụ ga-esi lee ya anya ma ọ bụ na-eche ma okwu ya ọ̀ ga-adịkwa irè. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a bụ́ ihe ọhụrụ, ma nsogbu na-ebilite mgbe e chebaara ihe ndị dị otú ahụ echiche gabiga ókè. Ọ bụrụ na ahụ́ amalite ịma gị jijiji tupu ị malite ozi, olee ihe pụrụ inye aka? Ịkwadebe nke ọma na ikpesi ekpere ike gwa Jehova. (Ọrụ 4:29) Cheedị banyere oké ebere Jehova nwere n’ịkpọ ndị mmadụ òkù ka ha nwee ahụ́ ike zuru okè na ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs. Cheedị banyere ndị ị na-agbalị inyere aka na mkpa ọ dị ha ịnụ ozi ọma ahụ.

Chetakwa na ndị mmadụ nweere onwe ha ime nhọrọ, ya mere, ha pụrụ ịnabata ma ọ bụ jụ ozi ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa mgbe Jizọs gbara àmà n’Izrel oge ochie. Ọrụ gị agwụla ime nkwusa. (Mat. 24:14) Ọbụna mgbe ndị mmadụ na-ekweghị gị kwuo okwu, ọbịbịa gị ga-agba àmà. Ị ga-enweworị ihe ịga nke ọma n’ihi na i kwere ka Jehova jiri gị mezuo uche ya. Mgbe i nwere ohere ikwu okwu, gịnị ka a ga-eji mara okwu gị? Ọ bụrụ na ị mụta ime ka uche gị dịkwasị ná mkpa ndị ọzọ nwere, okwu gị ga-abụ nke na-adọrọ mmasị na nke i kwuru otú i si ekwu okwu.

Mgbe ị na-agba àmà, ọ bụrụ na i mee omume, kwuokwa okwu otú i si ekwu kwa ụbọchị, nke a ga-eme ka ahụ́ ruo ndị na-ege gị ntị ala. Ha pụrụ ọbụna ige ntị karị n’ihe ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ ị chọrọ ka gị na ha kwurịta. Kama ịgwa ha okwu, soro ha nwee mkparịta ụka. Nwee omume enyi. Gosi mmasị n’ebe ha nọ, nabatakwa ihe ndị ha kwuru. N’ezie, n’ebe asụsụ ma ọ bụ ọdịbendị obodo chọrọ ka a gbasoo ụkpụrụ ụfọdụ iji gosi nkwanye ùgwù mgbe a na-agwa ndị a na-amabughị okwu, i kwesịrị ịgbaso ha. Ma ị pụrụ ịdị na-enwe ihu ọchị mgbe nile dị ka onye ahụ́ ruru ala.

N’elu Ikpo Okwu. Mgbe ị na-agwa ìgwè mmadụ okwu, ikwu okwu otú i si ekwu okwu, n’ụzọ mkparịta ụka na-akasị mma. Otú ọ dị, mgbe ìgwè ahụ buru ibu, ọ dị mkpa ka i welikwuo olu gị. Ọ bụrụ na ị nwaa iburu okwu gị n’isi ma ọ bụ ọ bụrụ na ihe ndị i depụtara buru nnọọ ibu, ma eleghị anya ị na-eche echiche gabiga ókè banyere ikwu okwu n’otu ụzọ kpọmkwem. Ịhazi okwu ndị ị ga-eji mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị mkpa, ma mgbe e chebaara ya echiche gabiga ókè, a na-ekwu okwu n’ịgbaso otu ụzọ kpọmkwem. Ị gakwaghị ekwu okwu otú i si ekwu okwu. I kwesịrị iji nlezianya chepụta tupu oge eruo echiche ndị ị ga-ewepụta n’okwu gị, ma tinye uche karịsịa n’echiche ndị ahụ, ọ bụghị n’otú ị ga-esi kwuo ha kpọmkwem.

Otú ahụ ka ọ dịkwa mgbe a na-agba gị ajụjụ ọnụ ná nzukọ. Jikere nke ọma, ma agụla azịza gị agụ ma ọ bụ buru ha n’isi. Jiri mgbanwe ụda olu ị na-eji eme ihe mgbe nile kwuo ha ka okwu gị wee bụrụ nke si gị n’obi n’ụzọ na-adọrọ mmasị.

Ọbụna nkà okwu ndị dị mma pụrụ ịdị ndị na-ege ntị ka ndị na-ekwekọghị n’otú i si ekwu okwu ma e jiri ha mebiga ihe ókè. Dị ka ihe atụ, i kwesịrị ikpọpụta okwu akpọpụta, na-akpọzi ha akpọzi ma ọ bụghị ruo n’ókè nke na okwu gị ga na-ada ike ike ma ọ bụ ghara ịdaba n’otú i si ekwu okwu. Mmegharị ahụ́ e ji emesi okwu ike ma ọ bụ nke e ji akọwa ihe, mgbe e meziri ya emezi, pụrụ ime ka okwu gị na-akpali akpali, ma mmegharị ahụ́ ndị e ji ahụ́ erughị ala na-eme ma ọ bụ ndị e mebigara ókè ga-adọpụ uche n’ihe ị na-ekwu. Jiri ụda olu kwesịrị ekwesị mee ihe, ma anwala iwelibiga olu ókè. Ọ dị mma ime ka ụzọ i si ekwu okwu na-ekpo ọkụ mgbe ụfọdụ, ma i kwesịrị izere ikwu okwu n’ụzọ ibuli onwe gị elu. I kwesịrị iji mgbanwe ụda olu, ịnụ ọkụ n’obi, na mmetụta mee ihe n’ụzọ na-agaghị adọta mmasị n’ebe ị nọ ma ọ bụ mee ka ahụ́ ghara iru ndị na-ege gị ntị ala.

Ndị ụfọdụ nwere kpọmkwem ụzọ ha na-esikarị ekwu okwu, ọbụna mgbe ha na-adịghị ekwu okwu n’elu ikpo okwu. Ndị ọzọ na-ejikarị okwu ndị e ji eme ihe nanị ná mkparịta ụka eme ihe. Ihe dị mkpa bụ ịdị na-ekwu okwu n’ụzọ dị mma kwa ụbọchị na ịdị na-eme ihe n’ụzọ dị ùgwù dị ka Onye Kraịst. Ọ bụrụzie na ị rịgoro n’elu ikpo okwu, ị ga-enwe ike karị ikwu okwu otú i si ekwu okwu na ime ihe otú i si eme ihe n’ụzọ na-adọrọ adọrọ.

Mgbe Ị Na-agụ Ihe n’Ihu Ọha. Ikwu okwu otú i si ekwu okwu mgbe ị na-agụ ihe n’ihu ọha chọrọ mgbalị. Iji mezuo ya, mata echiche ndị bụ́ isi dị n’ihe ị gaje ịgụ, rịbakwa ama otú e si kọwapụta ha. Buru ha n’uche nke ọma; ma ọ bụghị ya, nanị ihe ị ga na-eme bụ ịgụpụta okwu ndị dị na ya. Chọpụta otú e si akpọ okwu ndị ị na-amabughị. Mụgharịa ịgụpụta ya agụpụta iji mụta mgbanwe ụda olu kwesịrị ekwesị na ịgụkọta okwu ọnụ n’ụzọ ga-ewepụta echiche ha nke ọma. Mee ya ugboro ugboro ruo mgbe ị na-agụ ya were were. Mara ihe ọgụgụ ahụ nke ọma nke na mgbe ị na-agụpụta ya, ịgụ ihe gị ga na-ada ka mkparịta ụka na-ekpo ọkụ. Ọ bụ ya bụ ikwu okwu otú i si ekwu okwu.

Otú ọ dị, ihe ka ukwuu n’ọgụgụ ihe anyị n’ihu ọha na-esite n’akwụkwọ anyị ndị dabeere na Bible. E wezụga ihe omume ịgụ ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, anyị na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche n’ozi ubi nakwa mgbe anyị nọ n’elu ikpo okwu na-ekwu okwu. A na-ekenye ụmụnna nwoke ịgụ ihe a na-atụle n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nakwa n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Ụfọdụ ụmụnna nwoke ruru eru na-enweta ihe omume ịgụpụta okwu a na-agụ agụ n’ihu ndị na-ege ntị ná mgbakọ. Ma ị̀ na-agụ Bible ma ọ bụ ihe ndị ọzọ, gụọ akụkụ ndị gụnyere ihe ndị ọzọ kwuru n’ụzọ na-akpali akpali. Ọ bụrụ na e hotara ihe ọtụtụ ndị kwuru, gbanwetụ ụda olu gị maka nke ọ bụla. Okwu ịdọ aka ná ntị: Emebigala ya ókè, kama mee ka ịgụ ihe ahụ na-akpali akpali otú i si ekwu okwu.

Ịgụ ihe nke dabara n’otú mmadụ si ekwu okwu na-adị ka mkparịta ụka. Ọ dịghị ada ka ihe na-esighị n’obi kama ọ na-eme ka mmadụ kwenye.

ỤZỌ ISI MEE YA

  • Kwuo okwu otú i si ekwu okwu kwa ụbọchị. Tinye uche gị, ọ bụghị n’onwe gị, kama n’ebe Jehova nọ na ná mkpa ọ dị ka ndị mmadụ mụta banyere ya.

  • Mgbe ị na-akwadebe okwu gị, tinye uche karịsịa n’echiche ndị dị na ya, ọ bụghị ná mkpụrụ okwu ndị ị ga-eji mee ihe kpọmkwem. Mgbe ị na-ekwu okwu nakwa mgbe ị na-enwe mkparịta ụka kwa ụbọchị, zere nkà okwu ndị na-adịghị mma nakwa omume iji nkà okwu eme ihe n’ụzọ na-adọta mmasị n’ebe ị nọ.

  • Jikere nke ọma maka ịgụ ihe n’ihu ọha. Jiri mmetụta gụọ ya, gụọkwa ya n’ụzọ ga-egosi na ị maara nnọọ ihe ọ pụtara.

IHE OMUME: (1) Gụọ Malakaị 1:2-14 n’agụpụtaghị ya agụpụta, rịbakwa ama ndị na-ekwu okwu. Ugbu a jiri mmetụta kwesịrị ekwesị gụpụta ya. (2) N’oge atọ dịgasị iche iche, tupu ị na-ekere òkè n’ozi ubi, gụọ paragraf abụọ ndị mbụ dị n’ihe ọmụmụ a nakwa ihe e kwuru n’okpuru isiokwu nta bụ́ “N’ozi Ubi,” na peeji nke 128. Gbalịa itinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya