IHE ỌMỤMỤ NKE 15
Ọdịdị Onwe Onye Dị Mma
ỌDỊDỊ gị na-ekpughe ihe dị ukwuu banyere gị. Ọ bụ ezie na Jehova na-enyocha obi, ụmụ mmadụ na-erukarị ná nkwubi okwu site ‘n’ihe anya na-ahụ.’ (1 Sam. 16:7) Mgbe ị dị ọcha ma jie ejiji nke ọma, o yikarịrị ka ndị ọzọ ha ga-ekwubi na ị na-akwanyere onwe gị ùgwù, ha ga-achọkwa ige gị ntị karị. Gị iji ejiji n’ụzọ kwesịrị ekwesị ga-enwekwa mmetụta dị mma n’ebe nzukọ ị na-anọchite anya ya nọ nakwa n’otú ndị na-ege gị ntị si ele Chineke ị na-efe anya.
Ụkpụrụ Nduzi Ndị A Ga-etinye n’Ọrụ. Bible enyeghị ọtụtụ iwu banyere ọdịdị onwe onye. Ma ọ na-enye ụkpụrụ ndị guzoziri eguzozi, ndị pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ndị ziri ezi. Ihe bụ́ isi ihe dị n’ihe a nile bụ eziokwu ahụ bụ́ na anyị ‘na-eme ihe nile iji nye Chineke otuto.’ (1 Kọr. 10:31) Olee ụkpụrụ ndị na-emetụta ọdịdị anyị n’otu n’otu?
Nke mbụ, Bible na-agba anyị ume ịdị ọcha, ma n’ahụ́ ma n’uwe anyị. N’Iwu o nyere Izrel oge ochie, Jehova kwuru ihe ndị a chọrọ banyere ịdị ọcha. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị nchụàjà nọ n’ọrụ, ha ga-asa ahụ́ ma saa uwe ha n’oge ndị e nyere iji mee ha. (Lev. 16:4, 24, 26, 28) Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mozis, ma ụkpụrụ ndị dị n’ime ya ka dị irè. (Jọn 13:10; Mkpu. 19:8) Ahụ́ anyị, ísì ọnụ anyị, na uwe anyị kwesịrị ịdị ọcha karịsịa mgbe anyị na-aga n’ebe anyị na-efe ofufe ma ọ bụ na-ekere òkè n’ozi ubi ka ndị ọzọ ghara ịdị na-asọ anyị asọ. Ndị na-ekwu okwu ma ọ bụ na-ekere òkè n’ime ihe ngosi n’ihu ọgbakọ kwesịrị isetịpụ ezi ihe nlereanya na nke a. Ilebara ọdịdị anyị anya na-egosi ịkwanyere Jehova nakwa nzukọ ya ùgwù.
Nke abụọ, Bible na-agba anyị ume ịzụlite imeru ihe n’ókè nakwa uche zuru okè. Pọl onyeozi gbara ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst ume ka ha “na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè, ọ bụghị n’ụdị dị iche iche nke ịkpa isi na ọlaedo ma ọ bụ nkume pel ma ọ bụ ejiji dị nnọọ oké ọnụ, kama n’ụzọ kwesịrị ụmụ nwanyị ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke.” (1 Tim. 2:9, 10) Imeru ihe n’ókè na uche zuru okè dịkwa mkpa n’uwe na ejiji ndị ikom.
Onye na-emeru ihe n’ókè na-eche echiche ka ọ ghara ịkpasu ndị ọzọ iwe n’ụzọ na-adịghị mkpa nakwa ịghara ịdọta mmasị na-ekwesịghị ekwesị n’ebe onwe ya nọ. Uche zuru okè na-arụpụta ịdị akọ, ma ọ bụ ezi uche. Onye na-egosipụta àgwà ndị a nwere nguzozi nke na-esite n’ịkwanyere ụkpụrụ Chineke ùgwù. Igosipụta àgwà ndị a apụtaghị ịghara iji ejiji n’ụzọ mara mma kama ọ na-enyere anyị aka iji ezi uche eme ihe banyere ọdịdị anyị na izere ụdị uwe na ejiji ndị gabigara ókè. (1 Jọn 2:16) Anyị kwesịrị ịdị na-etinye ụkpụrụ ndị a n’ọrụ ma ànyị nọ n’ebe a na-efe ofufe, na-ekere òkè n’ozi ubi, ma ọ bụ na-ekere òkè n’ihe omume ndị ọzọ. Ọbụna uwe ndị anyị pụrụ iji nọrọ n’ụlọ kwesịrị igosipụta imeru ihe n’ókè na uche zuru okè. N’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe anyị na-arụ ọrụ ego, a ga-enwe ohere dị iche iche iji gbaa àmà mberede. Ọ bụ ezie na o nwere ike anyị agaghị eji ejiji otú anyị ga-esi jie mgbe anyị na-aga nzukọ na mgbakọ dị iche iche, uwe anyị ka kwesịrị ịdị mma n’anya, dị ọcha, ma kwesị ekwesị.
N’ezie, anyị nile adịghị eji ejiji n’otu ụzọ. A dịghị atụ anya ka anyị mee otú ahụ. Ndị mmadụ nwere ihe dịgasị iche iche na-amasị ha, nke a kwesịkwara ekwesị. Ma e kwesịrị iji ụkpụrụ nduzi ndị sitere na Bible na-eme ihe mgbe nile.
Pita onyeozi gosiri na uwe nke e jikọtara ya na “mmadụ zoro ezo nke obi” dị mkpa ọbụna karịa otú e si edozi isi na uwe elu. (1 Pita 3:3, 4) Mgbe ịhụnanya, ọṅụ, udo, obiọma, na okwukwe nke nwere ebe ndabere siri ike jupụtara anyị n’obi, ha ga-aghọrọ anyị uwe ime mmụọ ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ n’ezie.
Nke atọ, Bible na-agba anyị ume ịtụle ma a haziri ọdịdị anyị nke ọma. Na 1 Timoti 2:9, e kwuru okwu banyere “uwe a haziri nke ọma.” Ọ bụ ezie na Pọl onyeozi na-ezo aka n’uwe ndị inyom, otu ụkpụrụ ahụ na-emetụtakwa ndị ikom. Ihe a haziri nke ọma bụ ihe dị mma n’anya na n’usoro. Ma ànyị bara ọgaranya ma ànyị abaghị, anyị pụrụ inwe ọdịdị dị mma n’anya.
Otu n’ime ihe mbụ ndị ọzọ na-ahụ n’ọdịdị anyị bụ ntutu isi anyị. O kwesịrị ịdị mma n’anya, ma ọ bụ bụrụ nke a haziri nke ọma. Ma otú a na-eme n’ógbè ma ihe ndị e ketara eketa na-enwe mmetụta n’otú ndị mmadụ si edozi ntutu ha. Ná 1 Ndị Kọrint 11:14, 15, anyị na-ahụ ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere banyere ụzọ isi dozie ntutu isi, bụ́ nke ihe àmà na-egosi na o chebaara ihe ndị a echiche mgbe o kwuru ha. Otú ọ dị, mgbe ụzọ mmadụ si dozie ntutu ya na-enye echiche na nwoke na-achọ ịdị ka nwanyi ma ọ bụ na nwanyị na-achọ ịdị ka nwoke, nke a na-emegide ụkpụrụ Bible.—Deut. 22:5.
Nye ndị ikom, ọdịdị onwe onye dị mma n’anya pụrụ ịgụnye ịkpụ afụ ọnụ ha akpụ. N’ebe ọtụtụ ndị na-ewere afụ ọnụ dị ka ihe dị ùgwù, onye ọ bụla hapụrụ ya kwesịrị ịkpụtulata ya otú dị mma n’anya.
Nke anọ, ọdịdị anyị ekwesịghị ịdị na-egosipụta ịhụnanya maka ụwa na ụzọ ya. Jọn onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya.” (1 Jọn 2:15-17) E ji ọtụtụ ọchịchọ mmehie mara ụwa a. N’ime ọchịchọ ndị a, Jọn hotara ọchịchọ nke anụ ahụ́ na-emehie emehie na oké ngosi nke ihe mmadụ nwere. Akwụkwọ Nsọ na-adọrọkwa uche gaa na mmụọ isi ike, ma ọ bụ inupụrụ ọchịchị isi. (Ilu 17:11; Efe. 2:2) Ọchịchọ na omume ndị a na-apụtakarị ìhè n’ụzọ ndị mmadụ si eyi uwe ma na-eji ejiji. N’ihi ya, ọdịdị ha pụrụ ịbụ nke na-ekwesịghị ekwesị, nke na-akpali agụụ mmekọahụ, nke gabigara ókè, nke dị nkịrịka, nke ejizighị ejiji, ma ọ bụ iyi uwe a na-ahazighị ahazi. Dị ka ndị na-ejere Jehova ozi, anyị ga-ezere ụdị ejiji ndị na-egosipụta ụzọ ndị dị otú ahụ na-abụghị nke Ndị Kraịst.
Kama iṅomi ụwa, lee ka o si ka mma ikwe ka ihe nlereanya ọma nke ndị ikom na ndị inyom tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst nwee mmetụta n’uwe na ejiji gị! Ụmụ okorobịa ndị na-atụ anya ịbụ ndị ọkà okwu n’ihu ọha otu ụbọchị pụrụ ileru anya n’ejiji nke ndị ruworo eru ikwu okwu ihu ọha. Mmadụ nile pụrụ ịmụta ihe site n’ihe nlereanya nke ndị jiworo iguzosi ike n’ihe jee ozi ruo ọtụtụ afọ n’ozi ihu ọha na-esetịpụ.—1 Tim. 4:12; 1 Pita 5:2, 3.
Nke ise, n’ikpebi ihe kwesịrị ekwesị, anyị kwesịrị iburu n’uche na “ọbụna Kraịst ahụ emeghị ihe masịrị ya onwe ya.” (Rom 15:3) Ihe kasị chegbuo Jizọs bụ ime uche Chineke. Jizọs mekwara ka inyere ndị ọzọ aka butere inwe ntụsara ahụ́ onwe ya ụzọ. Mgbe a bịara n’ụdị uwe na ejiji ụfọdụ, ọ bụrụ na ọ dị ihe ọ bụla ga-abụ ihe mgbochi n’agbata anyị na ndị mmadụ nọ n’ebe anyị na-eje ozi ugbu a, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Iṅomi mmụọ ịdị umeala n’obi nke Kraịst gosipụtara pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi amamihe dị na ya. Pọl onyeozi setịpụrụ ụkpụrụ bụ́: “Ọ dịghị ụzọ ọ bụla anyị si na-eweta ihe na-eme ka a sụọ ngọngọ.” (2 Kọr. 6:3) N’ihi ya, anyị pụrụ ịhapụ otú e si edozi isi ma ọ bụ ihe ejiji ndị yiri ka ha ga-eme ka ndị anyị chọrọ ịgbara àmà ghara inwe mmasị ige ntị.
Otú E Si Anọ. Ọdịdị onwe onye dị mma na-agụnyekwa ịnọ otú kwesịrị ekwesị. N’ezie, anyị nile adịghị anọ n’otu ụzọ ahụ, anyị adịghịkwa agbalị ime ihe n’otu ụzọ ahụ. Otú ọ dị, ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na dị ka Bible si jiri ya mee ihe, iguzo kwem na-enye echiche nke ùgwù onwe onye na inwe nchekwube. (Lev. 26:13; Luk 21:28) Ka o sina dị, n’ihi ihulata ehulata arụ ọrụ ruo ọtụtụ afọ ma ọ bụ n’ihi ime agadi ma ọ bụ n’ihi adịghị ike anụ ahụ́, nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị nwere ike ọ gaghị enwe ike iguzo kwem ma ọ bụ ọ pụrụ ịdị mkpa ka ọ na-adabere n’ihe iji kwụsie ike. Ma nye ndị nwere ike ime otú ahụ, a na-atụ aro ka ha guzoro n’ụzọ dịtụ kwem mgbe ha na-agwa ndị ọzọ okwu ka ha ghara inye echiche nke inwe omume ọ̀ gbasara m ma ọ bụ na ọ na-ewute ha ikwu ihe ha na-ekwu. N’otu aka ahụ, ọ bụ ezie na ọkà okwu ịtụkwasị aka site n’oge ruo n’oge n’elu ihe ọkà okwu na-atụkwasị akwụkwọ ya adịghị njọ, ọ na-enyekarị echiche ka mma ma ọ bụrụ na ọ dịghị adabere na ya.
Ihe Ndị E Ji Eme Ihe Ndị Dị Mma n’Anya. Ọ bụghị nanị na ọdịdị anyị kwesịrị ịdị ọcha ma bụrụ nke a haziri nke ọma kama ihe ndị anyị ji eme ihe n’ozi kwesịkwara ịdị ọcha ma dị mma n’anya.
Chee echiche banyere Bible gị. Ọ gaghị ekwe omume na anyị nile ga-enweta Bible ọhụrụ mgbe nke anyị kara nká. Ka o sina dị, n’agbanyeghị afọ ole anyị jiworo Bible anyị mee ihe, o kwesịrị inye ihe àmà na e jiziri ya ejizi.
N’ezie, e nwere ọtụtụ ụzọ nke isi hazie akpa ozi ọma anyị, ma o kwesịrị ịdị mma n’anya. Ị̀ hụtụwo ka mpempe akwụkwọ si n’ime Bible wụpụta mgbe onye nkwusa na-ejikere ịgụrụ onye nwe ụlọ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ ikekwe mgbe nwanna na-agwa ọgbakọ okwu? Ọ dọpụrụ uche gị, ọ̀ bụ na ọ dọpụghị ya? Ọ bụrụ na mpempe akwụkwọ ndị e tinyere n’ime Bible na-eweta ndọpụ uche, ọ pụrụ ịbụ na idebe ha ebe ọzọ ga-eme ka ihe i ji na-eme ihe bụrụ nke a haziri nke ọma. Ghọtakwa na n’ebe ụfọdụ, a na-ewere ịtọgbọ Bible ma ọ bụ akwụkwọ okpukpe ndị ọzọ n’ala dị ka akwanyeghịrị ha ùgwù.
Ọdịdị onwe onye dị mma kwesịrị ịbụ ihe dị mkpa nye anyị. Ọ na-enwekwa mmetụta n’otú ndị ọzọ si ele anyị anya. Ma karịsịa, anyị na-echebara ya echiche nke ọma n’ihi na anyị chọrọ ‘ịchọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma n’ihe nile.’—Taị. 2:10.