Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jl ihe ọmụmụ 8
  • Gịnị Mere Anyị Ji Eji Ejiji Dị Mma Aga Ọmụmụ Ihe Anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Anyị Ji Eji Ejiji Dị Mma Aga Ọmụmụ Ihe Anyị?
  • Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-echebara Ákwà Anyị na Ejiji Anyị Echiche
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ụdị Uwe Ị Na-eyi Ọ̀ Na-eme Ka E Too Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Ọdịdị Onwe Onye Dị Mma
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
jl ihe ọmụmụ 8

ISI NKE 8

Gịnị Mere Anyị Ji Eji Ejiji Dị Mma Aga Ọmụmụ Ihe Anyị?

Nna na nwa ya na-ejikere ịga ọmụmụ ihe

Aịsland

Nne na nwa ya na-ejikere ịga ọmụmụ ihe

Meksiko

Ndịàmà Jehova jiri ejiji dị mma na Gini-Bisaụ

Gini-Bisaụ

Ezinụlọ na-aga ọmụmụ ihe na Filipinz

Filipinz

Lerugodị anya na foto Ndịàmà Jehova e sere na broshọ a. Ị̀ chọpụtara na ha jiri ejiji dị mma n’ebe niile ha nọ n’ọmụmụ ihe ha? Ị̀ ma ihe mere anyị ji eji ejiji dị mma otú ahụ?

Ọ bụ maka na anyị na-akwanyere Chineke ùgwù. Ọ bụ eziokwu na mkpa Chineke anaghị abụcha ụdị ejiji anyị ji bịa ọmụmụ ihe, anyị kwesịrị iji ejiji otú ga-egosi na anyị na-akwanyere ma yanwa ma ụmụnna anyị ùgwù. (1 Samuel 16:⁠7) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịga hụ onyeisi ala anyị, anyị ga-eji ejiji dị mma n’ihi ùgwù anyị na-akwanyere ya. Anyị kwesịkwara ịna-eme otú ahụ mgbe anyị na-aga ọmụmụ ihe. Otú anyị si jie ejiji ga-egosi ma ànyị na-akwanyere Jehova ùgwù, bụ́ onye Baịbụl kpọrọ “Eze mba niile.” (Jeremaya 10:⁠7) Ọ ga-egosikwa ma ànyị ji ebe anyị na-anọ efe ya kpọrọ ihe.

Ọ bụ maka na anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha na-eji ejiji ga-egosi na ha na-emeru ihe n’ókè, bụrụkwa ndị uche ha zuru okè. (1 Timoti 2:​9, 10) Mmadụ iji ejiji nke ga-egosi na ‘ọ na-emeru ihe n’ókè’ pụtara na ọ gaghị eyi efe tapaara ya n’ahụ́ ma ọ bụkwanụ nke ndị mmadụ ga na-ahụ ihe o yi n’ime. Inwe “uche zuru okè” ga-enyekwara onye ahụ aka ịna-eyi efe dị mma n’anya. Ma, ihe a na-ekwu ebe a abụghị na anyị enweghị ike iyi efe masịrị anyị. Ọ bụrụ na anyị ejie ejiji dị mma, o nwere ike ‘chọọ ozizi Onye Nzọpụta anyị mma,’ nyekwa ya otuto. (Taịtọs 2:10; 1 Pita 2:12) Anyị jie ejiji dị mma gaa ọmụmụ ihe, anyị na-eme ka ndị ọzọ ghara ileda ofufe anyị na-efe Jehova anya.

Ekwela ka okwu gbasara efe mee ka ị ghara ịbịa ọmụmụ ihe anyị. Ihe na-ekpebi ma efe ọ̀ dị mma iji bịa ọmụmụ ihe abụghị otú ọ maruru ná mma ma ọ bụkwanụ ego ole a zụrụ ya. Ọ bụrụhaala na ọ dị ọcha, dịkwa mma n’anya, i nwere ike iyi ya bịa.

  • Gịnị mere anyị ji eji ejiji dị mma aga ọmụmụ ihe anyị?

  • Gịnị ka Baịbụl kwuru, nke ga-enyere anyị aka ịma ụdị ejiji anyị kwesịrị ịna-eji?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya