Igbe Ajụjụ
◼ Olee ụdị uwe anyị kwesịrị iyi mgbe anyị na-aga ileta ụlọ ndị e wuru maka ofufe Jehova?
N’ụwa niile, Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, ebe obibi Betel, na alaka ụlọ ọrụ anyị bụ ebe ndị e doro iche maka ozi Jehova. Ha na-adị mma n’anya, dị ọcha, a na-ahazikwa ha nke ọma, n’ihi ya, ha na-adị ùgwù n’anya. Ha na-adị nnọọ iche n’ihe anyị na-ahụ n’ụwa Setan. E kwesịkwara ịma ndị na-aga ileta ebe ndị a a na-anọ ejere Jehova ozi dị ka ndị Jehova, ndị na-eme uche ya.
Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị “na-eme ka a mata anyị dị ka ndị ozi Chineke” n’ihe niile, gụnyere n’iji ejiji kwesịrị ekwesị ma dị mma n’anya. (2 Kọr. 6:3, 4) A na-atụkwa anya ka anyị na-akpa ezigbo àgwà. Ejiji anyị kwesịrị ịdị na-adị mma n’anya ma na-adị ùgwù mgbe niile ebe anyị bụ ndị ohu Jehova Chineke. O kwesịrị ịdị otú ahụ karịsịa mgbe anyị na-eleta alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Igieduma nakwa isi ụlọ ọrụ anyị na alaka ụlọ ọrụ anyị ndị ọzọ dị gburugburu ụwa.
Ka akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova na-ekwu banyere mkpa ọ dị iji ejiji dị mma, ọ sịrị na ọ dị mkpa ka anyị na-adị ọcha ma na-eyi uwe dị mma n’anya mgbe anyị na-aga ozi ubi na mgbe anyị na-aga nzukọ Ndị Kraịst. Na peeji nke 138, paragraf nke 3, o kwuziri, sị: “Cheta na aha ahụ bụ Betel pụtara ‘Ụlọ Chineke.’ Ya mere uwe, ejiji, na omume anyị kwesịrị iyi ihe a tụrụ anya ya n’aka anyị mgbe anyị na-eje nzukọ maka ofufe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.” Ndị nkwusa Alaeze kwesịrị ịgbaso ụkpụrụ a dị elu mgbe ha na-aga ileta Betel, ma hà si n’ebe dị nso, ma hà si n’ebe dị anya. Onye ahụ na-abịa nleta ga-esi otú a gosi na ya na-ekele Chineke ma na-akwanyere ya ùgwù kwesịịrị ya.—Ọma 29:2.
Uwe anyị kwesịrị igosi na anyị bụ ndị “na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke.” (1 Tim. 2:10) Uwe na ejiji kwesịrị ekwesị na-eme ka ndị ọzọ nwee mmasị n’ezi ofufe Jehova. Ma, a chọpụtala na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ole na ole na-eji ejiji otú ọ masịrị ha, yiri uwe ndị na-adịghị mma n’anya, ma ọ bụkwanụ ndị na-egosi ahụ́ ha mgbe ha na-eleta ụlọ ndị e wuru maka ofufe Jehova. O nwetụghị mgbe Ndị Kraịst kwesịrị iyi uwe ndị dị otú ahụ. N’akụkụ a, nakwa n’akụkụ niile nke ndụ anyị dị ka Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịgbaso ụkpụrụ ndị dị elu, bụ́ ndị na-eme ka ndị Chineke dị iche n’ebe ụwa dị, na-eme ihe niile iji nye Chineke otuto.—Rom 12:2; 1 Kọr. 10:31.
Ya mere, mgbe anyị na-aga ileta isi ụlọ ọrụ anyị ma ọ bụ alaka ụlọ ọrụ anyị, ma ị̀ bịawara ebe ahụ kpọmkwem ma ị̀ batara abata mgbe ị na-eleta ebe dị iche iche n’oge ezumike, jụọ onwe gị, sị: ‘Uwe m na ejiji m hà dị mma n’anya, dị ọcha, ma dị ùgwù dị ka ebe ahụ m na-aga ileta? Ọ̀ ga-ewetara Chineke m na-efe otuto? Otú m dị n’anya ọ̀ ga-adọpụ uche ndị mmadụ ma ọ bụ kpasuo ha iwe?’ Ka anyị jiri uwe na ejiji anyị ‘na-achọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma n’ihe niile’!—Taị. 2:10.