Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Nyere Ndị Bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs Aka?
1. Olee àmà kpụ ọkụ n’ọnụ a ga-agba na March 22, 2008?
1 Na March 22, 2008, a ga-agbara ọtụtụ nde mmadụ àmà kpụ ọkụ n’ọnụ n’ụwa niile. Ndị ga-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs ga-anụ banyere oké ịhụnanya Jehova gosiri site n’inye ụmụ mmadụ ihe mgbapụta. (Jọn 3:16) Ha ga-amụta banyere Alaeze ahụ na otú Jehova ga-esi jiri ya mezuo uche ya banyere ụwa niile. (Mat. 6:9, 10) Ha ga-eji anya ha hụrụ ịhụnanya na ịdị n’otu dị n’etiti ndị Chineke, hụkwa otú anyị na-esi eji obi ụtọ anabata ndị ọzọ.—Ọma 133:1.
2. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl bịaranụ aka?
2 Ndị A Na-amụrụ Baịbụl: Ụfọdụ n’ime ndị ga-abịanụ bụ ndị anyị malitere ịmụrụ Baịbụl ọhụrụ. Mee ka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị mata ha. Kọọrọ ha banyere ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe kwa izu, kpọgharịtụkwa ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe a na-ekwu okwu Ncheta ọnwụ Jizọs, ọkà okwu ga-agba ndị dị otú ahụ ume ka ha nọgide na-enwe ọganihu n’ime uche Chineke. I nwere ike iji ihe ndị o kwuru gbaa onye ị na-amụrụ ihe ume.
3. Gịnị ka e nwere ike ime iji gbaa ndị nkwusa na-anaghị ejekwa ozi bịaranụ ume?
3 Ndị Na-anaghị Ejekwa Ozi: Ụfọdụ n’ime ndị ga-abịanụ bụ ndị nkwusa na-anaghị ejekwa ozi. Gbalịa iji ihu ọchị kelee ha. Ajụla ha ajụjụ ma ọ bụ gwa ha okwu ndị nwere ike imenye ha ihere. Obere oge ka Ncheta Ọnwụ Jizọs gasịrị, ndị okenye kwesịrị ileta onye ọ bụla na-anaghị ejekwa ozi nke bịaranụ, jaa ya mma maka mgbalị o mere iji bịa, ma jiri obi ụtọ kpọọ ya òkù ka ọ bịa ọmụmụ ihe ọzọ a ga-enwe.
4. Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike isi nyere ndị ọbịa aka?
4 Ndị Ọbịa: Ụfọdụ n’ime ndị ga-abịanụ nwere ike ịbụ ndị enyi anyị ma ọ bụ ndị ezinụlọ anyị, bụ́ ndị anyị kpọrọ òkù n’onwe anyị. O nwere ike ịbụ na a kpọrọ ndị ọzọ mgbe a na-ekesa akwụkwọ ịkpọ òkù. Ọ bụrụ na ị hụ ndị ị na-amaghị ndị ha bụ, kọwaara ha onwe gị ma nabata ha. O nwere ike ịbụ na ha abịatụbeghị ọmụmụ ihe anyị. Ka gị na ha na-ekwurịta okwu, i nwere ike ịchọpụta otú ị ga-esi kpọtụrụ ya. Ọ bụrụ na ị gaa leta ha, ma ọ bụ kpọọ ha na fon ụbọchị ole na ole e chetasịrị ọnwụ Jizọs, i nwere ike ime ka ha nwekwuo mmasị ma gwa ha ka ị mụwara ha Baịbụl.
5. Gịnị ka anyị nwere ike ikwu iji malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl?
5 E nwere ike ịgbakwasị ụkwụ n’ihe ndị e kwuru n’okwu Ncheta Ọnwụ Jizọs malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’akwụkwọ Bible Na-akụzi mgbe a gaara ya nletaghachi. Dị ka ihe atụ, ọkà okwu ahụ ga-agụ Aịzaya 65:21-23. Mgbe ị gara nletaghachi, i nwere ike ikwu banyere okwu ahụ ma sị, “Ka m gosi gị ngọzi ndị ọzọ anyị nwere ike inweta n’ihi ihe mgbapụta ahụ.” Tụlezie peeji nke 4-5 nke akwụkwọ Bible Na-akụzi. Ma ọ bụ, i nwere ike ịsị, “Ọtụtụ ndị na-eche banyere mgbe anyị ga-ahụ mmezu nke amụma Aịzaya.” Tụlezie paragraf nke 1-3 n’isi nke 9. Ihe ọzọ anyị nwere ike ime bụ naanị ikwu ihe ọkà okwu ahụ kwuru, gosi onye ahụ akwụkwọ Bible Na-akụzi, ma gosi ya otú e si eji ya amụ ihe.
6. Olee ohere ndị anyị nwere ka anyị na-erube isi n’iwu Jizọs nyere anyị icheta ọnwụ ya?
6 Ka onye ọ bụla n’ime anyị mụrụ anya iji hụta ohere ndị ọ ga-eji enyere ndị a na-amụrụ Baịbụl, ndị na-anaghị ejekwa ozi, na ndị ọbịa, bụ́ ndị ga-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, aka. (Luk 22:19) Jehova ga-agọzirịrị oge ọ bụla anyị tinyekwuru n’ozi Alaeze anyị.