Nabata Ha
1. Olee mgbe anyị na-akacha aga ozi ọma n’afọ ọ bụla? Oleekwa ihe mere o ji bụrụ oge anyị na-akacha aga ozi ọma?
1 Kwa afọ, anyị na-akacha aga ozi ọma oge anyị na-echeta ọnwụ Jizọs. Dị ka ihe atụ: N’afọ a, anyị na-atụ anya na ihe karịrị nde mmadụ iri ga-abịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. Ha bịa, ha ga-amata otú ọnwụ Jizọs si gosi na Jehova na Jizọs hụrụ anyị n’anya. (Jọn 3:16; 15:13) Ha ga-amatakwa uru ọnwụ ahụ Jizọs nwụrụ ga-abara ha. (Aịza. 65:21-23) Ma, ọ bụghị naanị onye ga-ekwu okwu Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ụbọchị ahụ ga-agbara ndị bịara ya àmà. Anyị niile ga-eso gbaara ha àmà. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịnabata ha nke ọma.—Rom. 15:7.
2. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ahụ́ ruo ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ala?
2 Kama ịga nọrọ n’oche gị na-eche ka oge ruo ka a malite ihe omume, i nwere ike ịgakwuru onye nọ gị nso gwa ya onye ị bụ. Ụjọ nwere ike ịna-atụ ndị anyị kpọrọ òkù, o nwekwara ike ha amaghị ma ànyị ga-anabata ha nke ọma. Ahụ́ ga-eru ha ala ma ọ bụrụ na anyị emesaara ha ihu. I nwere ike ịchọpụta ma onye ahụ ọ̀ bịara n’onwe ya ka ọ̀ bụ mmadụ kpọrọ ya. Otú i nwere ike isi achọpụta ya bụ ịjụ ya ma ọ̀ bụ nke mbụ ọ na-abịa ọmụmụ ihe anyị. Ma ọ bụkwanụ gị ajụọ ya ma ò nwere onye ọ ma n’ọgbakọ unu. I nwere ike ịkpọrọ ya ka gị na ya nọrọ. I nwekwara ike ịna-egosi ya ebe a na-agụ na Baịbụl. Ma ọ bụkwanụ a na-abụ abụ, gị agwa ya ka ọ na-ele anya n’akwụkwọ abụ gị. Ọ bụrụ na ọ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka ọgbakọ unu nọ na-echeta ọnwụ Jizọs, i nwere ike kpọgharịa ya gburugburu Ụlọ Nzukọ Alaeze. A gbasaa, gakwuru ya ka ị mara ma ò nwere ajụjụ. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu ga-apụ ozugbo unu mechara ka ọgbakọ ọzọ nwee ike ịnọ ebe ahụ mee nke ha, i nwere ike ịjụ onye ahụ otú o si hụ ihe omume ahụ. Jụọ ya ebe o bi na otú ị ga-esi ahụ ya ọzọ. Gbalịakwa gaa hụ ya ngwa ngwa. Ọ bụrụ na e nwere ndị nkwusa na-anaghị ejekwa ozi bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs, ndị okenye kwesịrị ịga gbaa ha ume.
3. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji nabata ndị anyị kpọrọ ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs?
3 Ọtụtụ ndị ga-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs abịatụbeghị ọmụmụ ihe anyị. Nke a nwere ike ịbụ nke mbụ ha na-ahụ na anyị nwere obi ụtọ, dịrị n’udo, dịrịkwa n’otu. (Ọma 29:11; Aịza. 11:6-9; 65:13, 14) Olee ihe ha ga-akọrọ ndị mmadụ ma ha bịachaa laa? Otú anyị si nabata ha nwere ike ime ka ha kọọ akụkọ ọma ma ọ bụ akụkọ ọjọọ gbasara anyị.