A Ga-agba Àmà Dị Egwu
1. E wezụga okwu a ga-ekwu n’ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs, gịnị ọzọ ga-amasị ndị ga-abịa n’ụbọchị ahụ? Kọwaa.
1 Olee mgbe? Ọ bụ ná mgbede ahụ a ga-echeta ọnwụ Jizọs. Ọ bụ ya mere anyị ji na-agba mbọ na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. Ọ bụghị naanị okwu e kwuru n’ụbọchị ahụ nwere ike ịmasị ndị bịaranụ. Mgbe otu nwaanyị bịachara Ncheta Ọnwụ Jizọs, o kwuru na ya hụrụ otú onye ọ bụla si jiri obiọma na-emeso ibe ya ihe nakwa otú ebe a nọ mee Ncheta ahụ, bụ́ nke ndị ọrụ afọ ofufo rụrụ ma na-elekọta, si maa mma n’anya ma dị ọcha. N’ihi ya, ma ọkà okwu ga-ekwu okwu ma anyịnwa ga-agbakọ aka gbaa àmà dị egwu n’ụbọchị ahụ dị ezigbo mkpa n’afọ a.—Efe. 4:16.
2. Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi gbaara ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs àmà?
2 Kelee Ndị Bịaranụ nke Ọma: Ọ bụrụ na anyị ejiri ihu ọchị kelee ndị bịaranụ, ọ ga-agbara ha àmà. (Jọn 13:35) Ọ bụrụgodị na gị na mmadụ niile enwelighị ike ịkparịta ụka, ị ka nwere ike ịgwa ndị nọ n’akụkụ gị aha gị. (Hib. 13:1, 2) Leruo anya ala chọpụta ndị na-enweghị ndị ha ma. O nwere ike ịbụ na e nyere ha akwụkwọ ịkpọ òkù mgbe ahụ a na-eme mkpọsa pụrụ iche. I nwere ike ịjụ ha, sị: “Nke a ọ̀ bụ nke mbụ ị na-eso Ndịàmà Jehova amụ ihe?” Kpọrọ onye ahụ ka gị na ya nọrọ otu ebe, zaakwa ya ajụjụ ọ bụla ọ jụrụ gị. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu ga-apụ ozugbo a gbasara, ka ọgbakọ ọzọ nwee ike ịnọ ebe ahụ mee nke ha, i nwere ike ịjụ onye ahụ, sị: “Olee otú i si hụ ihe a e mere taa? Olee otú mụ na gị ga-esi ahụ ọzọ?”
3. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ndị na-anaghị ejekwa ozi bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs?
3 Nabata Ndị Na-anaghị Ejekwa Ozi: O doro anya na ndị na-anaghị ejekwa ozi na ndị na-abịa naanị Ncheta Ọnwụ Jizọs ga-abịa. Nabata ha, gwakwa ha na obi dị gị nnọọ ụtọ ịhụ ha. (Rom 15:7) Ndị okenye nwere ike ịga n’ụlọ ha ozugbo e mechara Ncheta Ọnwụ Jizọs ma gbaa ha ume ka ha na-abịachi ọmụmụ ihe anya. Ekpere anyị bụ ka okwu a ga-ekwu n’ụbọchị ahụ na ihe ọtụtụ ndị bịaranụ ga-eji anya ha hụ, ‘n’ihi ọrụ ọma anyị,’ mee ka ha too Chineke.—1 Pita 2:12.