Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/05 p. 1
  • Kelee Jehova Ekele Maka Ebere Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kelee Jehova Ekele Maka Ebere Ya
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Na-agọzi Mbọ Anyị Na-agba Ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • “Hụnụ Jehova n’Anya, Ndị Ebere Ya Nile”
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Nyere Ndị Ọzọ Aka Irite Uru n’Ihe Mgbapụta Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Ihe Mere Anyị Ji Aga Ncheta Ọnwụ Jizọs
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 2/05 p. 1

Kelee Jehova Ekele Maka Ebere Ya

A Ga-eme Ememe Ncheta Ọnwụ Kraịst na March 24

1. Olee otú Jehova siworo meere anyị ebere?

1 Ọbụ abụ ahụ ji oké olu kwuo, sị: “Ka ha kelee Jehova ekele banyere ebere Ya, na oké ọrụ Ya nile nke Ọ na-arụrụ ụmụ mmadụ!” (Ọma 107:8) Ebere Chineke karịrị nnọọ ọmịiko o nwere n’ebe ndị mmadụ nọ. E mere ka nke ahụ pụta ìhè n’okwu otuto a sitere n’ike mmụọ nsọ: “Ebere Gị na-akwagide m, Jehova.” (Ọma 94:18) Ebere Jehova meere anyị site n’inye anyị Ọkpara ọ mụrụ nanị ya enweghị atụ!—1 Jọn 4:9, 10.

2. Olee otú anyị pụrụ isi kelee Jehova?

2 Ka Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst na-eru nso, olee otú anyị pụrụ isi kelee “Chineke nke ebere” ekele? (Ọma 59:17) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iwepụta oge iji tụgharịa uche n’ụbọchị ndị ikpeazụ Jizọs biri n’ụwa. (Ọma 143:5) Ọ ga-abakwa uru isonye n’ọgụgụ Bible pụrụ iche e dokwara maka oge Ememe Ncheta dị ka o si dị n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2005. Ọ bụrụ na o kwe mee, ọ ga-adịkwa mma ka anyị mekwuo nnyocha n’isi nke 112-116 nke akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nakwa n’akwụkwọ ndị ọzọ dabeere na Bible. Tụgharịa uche n’ihe ndị ị gụrụ, ma kwe ka ha baa gị n’obi. (1 Tim. 4:15) Iji ekpere na-atụgharị uche n’Okwu Chineke abụghị nanị na ọ na-eme ka obi anyị sikwuo ike kamakwa ọ na-eme ka a mara otú anyị hụruru Jehova n’anya.—Mat. 22:37.

3, 4. (a) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie àgwà ụmụnna anyị ndị Liberia? (b) Olee ndị ị na-eme atụmatụ ịkpọ ka ha bịa Ememe Ncheta?

3 Kpalie Ndị Ọzọ Ikele Chineke: N’afọ gara aga, mmadụ 16,760,607 bịara Ememe Ncheta n’ụwa nile. N’otu obodo nta dị na Liberia, ụmụnna nọ n’ámá egwuregwu bọl dị n’obodo ahụ mee ya, a kpọsakwara ya n’obodo ahụ dum, na-agwa ndị mmadụ ka ha bịa. Ọ bụ ezie na e nwere nanị ndị nkwusa ise n’obodo ahụ, ndị bịara Ememe Ncheta ahụ dị 636!

4 N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị inyere ọtụtụ mmadụ ruo ókè o kwere mee aka ịbịa Ememe Ncheta a. Í depụtakwanụ aha ndị ị chọrọ ịkpọ? Ihe osise ndị dị n’azụ Teta! nke March 8 na Ụlọ Nche nke March 15 na-akpọ òkù ka a bịa. A pụkwara iji akwụkwọ ịkpọ òkù Ememe Ncheta bụ́ nke e biri ebi mee ihe. Jiri typewriter ma ọ bụ aka depụta n’akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ, oge na ebe a ga-eme ememe ahụ, ma nye onye ọ bụla ị kpọrọ otu. Ka March 24 na-eru nso, gaghachi na nke ndị nile ị kpọrọ iji chetara ha ya na iji hazie ihe nile nke ọma.

5. Olee otú anyị pụrụ isi gbaa ndị anyị na-amụrụ Bible ume ịbịa?

5 Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị anyị na-amụrụ Bible bụ́ ndị na-ebidobeghị ịbịa nzukọ aka ịbịa na irite uru nke ọma n’ememe ahụ? Wepụta minit ole na ole n’oge ọ bụla unu na-amụ ihe iji nyere ha aka ịghọta mkpa ememe ahụ dị. A pụrụ ịchọta ihe ọmụma bụ́ ịgba n’Ụlọ Nche nke March 15, 2004, peeji nke 3-7, nakwa n’akwụkwọ Reasoning, peeji nke 266-269.

6. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịnabata ndị ọbịa mgbe anyị bịara Ememe Ncheta?

6 Nabata Ndị Ọbịa: Mgbe ị bịara Ememe Ncheta ahụ, gakwuru ndị ọbịa ma nabata ha. (Rom 12:13) Mee ndokwa ka gị na ndị ị kpọrọ nọdụ ala n’otu ebe, hụkwa na ha ji Bible na akwụkwọ abụ. Anyị kwesịrị ibute ụzọ karịsịa n’iji obi ụtọ kelee ụmụnna ndị na-adịkwaghị eje ozi bụ́ ndị gbara mbọ bịa. Ịhụnanya anyị gosiri ha pụrụ ime ka ha maliteghachi iso ọgbakọ na-akpakọ. (Luk 15:3-7) N’ememe a kasị dị nsọ, ka anyị mee ike anyị nile iji gbaa ndị ọzọ ume iso anyị kelee Jehova maka “ebere Ya dị ebube.”—Ọma 31:21.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya