“Hụnụ Jehova n’Anya, Ndị Ebere Ya Nile”
A Ga-eme Ememe Ncheta Ọnwụ Jizọs n’April 4
1 Ọtụtụ afọ gara aga, mgbe Ukraine nọ n’okpuru ọchịchị Kọmụnist, ndị ọchịchị na-enyocha ụmụnna anyị nke ukwuu—karịsịa mgbe ọ bụla ụbọchị ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na-eru nso—n’ihi na ha na-enwe olileanya na ha ga-achọta ebe ha ga-anọ mee ya. Nke a na-abụkarị nsogbu ebe ọ bụ na ndị ọchịchị maara oge a na-emekarị ememe ncheta ahụ. Gịnị ka ụmụnna ahụ ga-eme? Otu nwanna nwanyị nwere ụlọ dị n’okpuru ala nke mmiri jupụtara na ya. Ebe ọ bụ na ndị ọchịchị agaghị atụ anya na ndị mmadụ ga-agbakọ n’ebe ahụ, ụmụnna ahụ ji osisi wuo ebe dị elu n’elu mmiri ahụ na-eru n’ikpere. Ọ bụ ezie na ha aghaghị itukwuru ala n’elu ihe ahụ ha wuru n’ime ụlọ ahụ uko ya dị ala, ọ dịghị onye nyere ha nsogbu mgbe ọgbakọ ahụ ji obi ụtọ mee Ememe Ncheta ahụ.
2 Mkpebi siri ike nke ụmụnna anyị ndị Ukraine irube isi n’iwu ahụ bụ́ ime ememe ncheta ọnwụ Jizọs bụ ngosipụta magburu onwe ya nke ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ. (Luk 22:19; 1 Jọn 5:3) Mgbe ọ bụla anyị chere ọnọdụ ndị siri ike ná ndụ ihu, ka anyị nweta nkasi obi site n’ihe nlereanya ndị dị otú ahụ ma kpebisie ike ịnọ ya n’ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’April 4. Site n’ime otú ahụ, anyị na-egosi na anyị nwere mmetụta yiri nke ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye bụrụ, sị: “Hụnụ Jehova n’anya, ndị ebere Ya nile.”—Ọma 31:23.
3 Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịhụkwu Chineke n’Anya: Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-akpalikwa anyị ịkpọ ndị ọzọ òkù ịbịa soro anyị mee ememe ahụ. Ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke February gbara anyị nile n’otu n’otu ume idepụta aha ndị anyị na-eme atụmatụ ịkpọ òkù ka ha bịa Ememe Ncheta ahụ. Ì ji ịdị uchu na-akpọ ndị nile i dere aha ha òkù? Wepụta oge iji kọwaara ha ihe ihe omume ahụ pụtara. Iji obiọma chetara ha ụbọchị na oge a ga-eme Ememe Ncheta ahụ na ịgwa ha ka ha soro gị gaa ma ọ bụrụ na ọ ga-adị mkpa, pụrụ ịgba ha ume ịbịa.
4 N’ememe ahụ, mee mgbalị dị ukwuu ikele ndị zara anyị òkù ma mee ka ahụ́ ruo ha ala. Olee otú ị pụrụ isi nyere ha aka ịhụkwu Jehova n’anya? Wepụta oge iji zaa ajụjụ ha. Dịrị njikere ịgwa ha ka i duziere ha ọmụmụ Bible ma ọ bụrụ na o kwe mee. Kpọọ ha òkù ịbịa nzukọ ọgbakọ ndị anyị na-enwe kwa izu. Ndị okenye kwesịrị nnọọ ilebara Ndị Kraịst na-adịghị ejekwa ozi, bụ́ ndị bịaranụ, anya. Ha pụrụ ime ndokwa ileta ndị dị otú ahụ ma gbaa ha ume ịmaliteghachi ozi, ikekwe na-adabere n’ihe ndị e kwuru n’Ememe Ncheta ahụ.—Rom 5:6-8.
5 Ime Ka Ịhụnanya Anyị Onwe Anyị Nwere n’Ebe Jehova Nọ Mikwuo Emie: Ịtụgharị uche n’onyinye nke ihe mgbapụta ahụ pụrụ ime ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova na Ọkpara ya nọ mikwuo emie. (2 Kọr. 5:14, 15) Otu onye gaworo Ememe Ncheta ruo ọtụtụ afọ kwuru, sị: “Anyị na-atụ anya Ememe Ncheta ahụ. Ọ na-apụwanye iche kwa afọ. Ana m echeta iguzo n’ebe a na-akwadebe ozu 20 afọ gara aga, na-ele ezigbo papa m anya wee na-enweta ezi obi ekele maka ihe mgbapụta ahụ. Ọ bụwo isiokwu nke ihe ọmụma e bu n’isi tupu mgbe ahụ. Oo, m maara akụkụ akwụkwọ nsọ ya nile na ụzọ isi kọwaa ha! Ma nanị mgbe m nwere mmetụta nke ajọ ịbụ eziokwu nke ọnwụ ka obi m maliri n’ọṅụ nke ihe a ga-arụzuru anyị site n’ihe mgbapụta ahụ dị oké ọnụ ahịa.”—Jọn 5:28, 29.
6 Ka ụbọchị a ga-eme ememe nke afọ a na-eru nso, wepụta oge iji kwadebe obi gị maka ememe ahụ. (2 Ihe 19:3) Tụgharịa uche n’ọgụgụ Bible pụrụ iche maka Ememe Ncheta, bụ́ ndị e depụtara n’akwụkwọ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2004 nakwa na 2004 Calendar. Ụfọdụ ndị na-atụle isi nke 112-116 nke akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu n’oge ọmụmụ ihe ezinụlọ ha. Ndị ọzọ na-emekwu nnyocha, na-eji akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ ihe eme ihe, bụ́ ndị ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche bipụtara. (Mat. 24:45-47) Anyị nile pụrụ itinye onyinye nke ihe mgbapụta ahụ n’ekpere sitere n’ala ala obi. (Ọma 50:14, 23) Ee, n’oge Ememe Ncheta a, ka anyị nọgide na-atụgharị uche n’ịhụnanya Jehova nwere n’ebe anyị nọ ma chọọ ụzọ isi gosi na anyị hụrụ ya n’anya.—Mak 12:30; 1 Jọn 4:10.