Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite March 8
Abụ nke 37
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara mmadụ nile iji broshuọ ọhụrụ ahụ bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’ bịa Nzukọ Ije Ozi nke izu na-abịanụ. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke March 15 na Teta! nke April 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke April 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe.
15 min: Iji Traktị Amalite Mkparịta Ụka. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Mgbe mgbe, akụkụ kasị esi ike n’ịgba àmà bụ ịmalite mkparịta ụka. A pụrụ iji traktị mee ihe iji merie ihe isi ike ahụ n’ozi ụlọ n’ụlọ, n’ógbè achụmnta ego, nakwa n’ebe ọha na eze na-anọ. Ná mkpirikpi, tụlee traktị abụọ ma ọ bụ atọ ndị pụrụ ịmasị ndị bi n’ógbè unu. Olee okwu mmeghe ndị a pụrụ iji mee ihe mgbe a na-enyefe traktị ndị a? Olee otú a pụrụ isi jiri ihe osise ndị dị na ya mee ihe? Olee ajụjụ ndị a pụrụ iji akọ jụọ? Mee ka otu paragraf dị na traktị nke ọ bụla pụta ìhè, bụ́ nke a pụrụ isoro onyenwe ụlọ tụlee ma ọ bụrụ na o gosi mmasị. Mee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi jiri traktị malite mkparịta ụka. Mee ka onye nkwusa ahụ tụlee n’ụzọ dị mkpirikpi otu paragraf dị na traktị ahụ, ma mechizie site n’inyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma.
20 min: “Hụnụ Jehova n’Anya, Ndị Ebere Ya Nile.”a Mgbe a na-atụle paragraf nke 3, jụọ ndị na-ege ntị otú ha si kpọọ ndị mmadụ òkù ịbịa Ememe Ncheta.
Abụ nke 131 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 15
Abụ nke 121
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee isi ihe ndị dị ‘n’Ihe Ncheta Maka Ememe Ncheta.’ Maa ọkwa mgbe a ga-enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche maka izu Ememe Ncheta. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara ọnwa March.
15 min: Akụkọ Banyere Ọganihu E Nweworo n’Ozi Pụrụ Iche n’Oge Ememe Ncheta A. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Kwuo ndokwa ndị pụrụ iche e meworo. Kọọ ahụmahụ ole na ole ndị e nwetaworo. Gbaa ndị nile ọ ga-ekwe mee ume itinye akwụkwọ maka ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa April na May. Ná mkpirikpi, tụlee isi ihe ole na ole dị n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke February.
20 min: Rite Uru Site na ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ.’ Broshuọ ọhụrụ a pụrụ ime ka ọgụgụ na ọmụmụ anyị na-amụ Okwu Chineke bakwuo uru. Ihe bụ́ isi ga-eme ka ọ baa uru bụ iji ndepụta ntụaka ya mee ihe. Gụọ Aịsaịa 63:1, bụ́ nke na-akọwa Jehova dị ka onye na-esi na Bọzra bịa. Gwa mmadụ nile ka ha chọta ebe Bọzra dị ná ndepụta ntụaka “Ezi Ala.” Kọwaa ihe “Bọzra 11 G11” pụtara, na-eji igbe dị na peeji nke 34 eme ihe, chọtakwa Bọzra na Idọm na map ahụ e zoro aka na ya. N’iji ndepụta ntụaka eme ihe, chọpụta njem Jizọs mere site na Jeruselem ruo Saịka. (Jọn 4:3-5) Meekwa otu ihe ahụ iji chọta ebe ọdọ mmiri Betzeta dị. (Jọn 5:1-3) Họrọ otu ihe atụ ma ọ bụ abụọ ọzọ site n’ọgụgụ Bible kwa izu nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ebe a pụrụ ịchọta ebe ndị ahụ na broshuọ ahụ na otú anyị pụrụ isi rite uru site n’iji map ndị ahụ eme ihe. N’ụzọ dị mkpirikpi, mee ka isi ihe ndị dị n’ụfọdụ map dị na broshuọ a pụta ìhè, kwuokwa ogologo oge ihe ndị ahụ were. Map dị na peeji nke 18-19 na-egosi ọnụ ọgụgụ kasị ukwuu nke ebe ndị a kpọrọ aha na Bible. Gbaa mmadụ nile ume iji ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’ na-eme ihe nke ọma.
Abụ nke 63 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 22
Abụ nke 191
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara mmadụ nile ịgbaso usoro ọgụgụ Bible Ememe Ncheta maka March 30–April 4, dị ka e depụtara ya n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2004 nakwa na 2004 Calendar.
15 min: “Ịgachi Nzukọ Anya—Ihe A Ga-edebe n’Ọnọdụ Mbụ.”b Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ kwuo ihe ndị ha meworo iji na-aga nzukọ ọgbakọ nke ọ bụla.
20 min: “Ịzọ Ije nke Usuu Ndị Agha Ịnyịnya nke Metụtara Gị.”c Gụọ ma kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha dị ka oge nyere ohere ya.
Abụ nke 181 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 29
Abụ nke 129
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke March. Kwuo akwụkwọ ndị a ga-enyefe n’April. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke April 1 na Teta! nke April 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke April 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe.
15 min: “Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze Na-aga n’Ihu na Nigeria.”d (Paragraf nke 1-6) Mgbe a na-atụle paragraf nke 6, gwa ụfọdụ ndị ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwetara site n’ikere òkè n’owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mesie ike ibu ọrụ ọgbakọ nwere ime ihe nile ha nwere ike ime iji kere òkè n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ha na ịkwụ ụgwọ mmefu nile a na-eme mgbe a rụchara ya iji na-elekọta ya mgbe nile.
20 min: Eziokwu ahụ Na-ejikọta Ezinụlọ. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Mgbe ụfọdụ, ndị nwere mmasị na-ala azụ ijere Jehova ozi n’ihi mmegide sitere n’aka ndị òtù ezinụlọ ha. Kọọ ahụmahụ ụfọdụ ndị na-esonụ: Ụlọ Nche nke January 1, 2002, peeji nke 14-15; Ụlọ Nche nke December 1, 2000, peeji nke 8; Ụlọ Nche nke September 1, 1999, peeji nke 32; Ụlọ Nche nke January 1, 1999, peeji nke 4; na Teta! nke March 8, 1998, peeji nke 31. Mee ka ọ pụta ìhè na ndụ ezinụlọ na-akawanyekarị mma ọbụna mgbe otu onye òtù ezinụlọ na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ.
Abụ nke 130 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 5
Abụ nke 126
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
20 min: Ịdị Ọcha n’Ụzọ Anụ Ahụ́ Na-eme Ka A Mata Anyị. Okwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke June 1, 2002, peeji nke 19-21. Gbakwụnye ihe ngosi nke ebe otu okenye na-egosi onye ọsụ ụzọ otú ọ pụrụ isi jiri akọ nyere onye ọ na-amụrụ Bible aka ịhụ mkpa ọ dị idebe ụlọ ya na gburugburu ebe obibi ya ọcha, na-eji ihe ọmụmụ nke 9, paragraf nke 5, dị na broshuọ Na-achọ eme ihe.
15 min: “Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze Na-aga n’Ihu na Nigeria.”e (Paragraf nke 7-12) Gụpụta paragraf nke 7-10. Mgbe a na-atụle paragraf nke 8, mee ka ọgbakọ mara banyere onyinye ha nyeworo maka Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ga-ewu n’ọdịnihu ma ọ bụ maka nke ha na-eji eme ihe ugbu a. Gbaa ha ume ịdị na-akwado ndokwa ọchịchị Chineke n’ụzọ zuru ezu na ịnọ n’okpuru ndị na-edu ndú.—Hib. 13:17.
Abụ nke 25 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.