“Nọgidenụ Na-eme nke A Iji Na-echeta M”
A Ga-eme Ihe Omume E Ji Echeta Ọnwụ Jizọs n’April 2
1. Gịnị mere April 2, 2007 ji bụrụ ụbọchị dị mkpa?
1 N’April 2, 2007, ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa ga-agbakọta iji cheta àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. Jizọs nwụrụ n’ihi ịgbachitere Nna ya nke eluigwe dị ka onye ọ bụ ya ka o ruuru ịbụ eze eluigwe na ala, si otú ahụ gosipụta na Setan bụ́ Ekwensu ghara ụgha mgbe o kwuru na ụmụ mmadụ bu nanị ọdịmma onwe ha n’uche na-ejere Chineke ozi. (Job 2:1-5) Nri Anyasị nke Onyenwe anyị na-echetakwara anyị na site n’ọnwụ Jizọs nwụrụ dị ka mmadụ zuru okè, nke na-enweghịkwa mmehie, o ‘nyere mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Mat. 20:28) N’ihi ya, Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.” (Luk 22:19) Ekele i nwere maka onyinye a dị oké ọnụ ahịa Chineke nyere ọ̀ kpaliwo gị ịmalite kwadebewe maka icheta ụzọ a na-enweghị atụ e si gosi anyị ịhụnanya?—Jọn 3:16.
2. Olee otú anyị pụrụ isi dozie obi anyị maka Ememe Ncheta?
2 Dozie Obi Gị: Anyị pụrụ idozi obi anyị maka Ememe Ncheta a site n’ịtụle ihe ndị mere n’ụbọchị ndị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ dị ka mmadụ. (Ezra 7:10) Iji nyere anyị aka ime nke a, e nwere usoro ọgụgụ Bible pụrụ iche dị n’akwụkwọ nta bụ́ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2007 nakwa na Kalenda nke 2007. E jiri kalenda anyị ji eme ihe taa tụlewe ya, ebe ndị a ga-agụ n’ụbọchị nke ọ bụla kwekọrọ n’ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ banyere ọnwụ Jizọs. Akara ụbọchị ndị e zoro aka na ha n’ebe ndị ahụ a ga-agụ na Bible dabeere na kalenda ndị Juu, bụ́ nke ụbọchị ha na-amalite mgbe anyanwụ dasịrị ma na-agwụ mgbe anyanwụ nke echi ya dasịrị. A rịbawo ọdịiche a dị n’otú e si agụ ụbọchị ama, a gbasokwara ya n’usoro ọgụgụ Bible Ememe Ncheta ahụ. Ịtụleghachi ihe ọmụma dị otú a na iji ekpere na-atụgharị uche n’otú Jehova hụruru anyị n’anya ga-enyere anyị aka irite uru zuru ezu n’Ememe Ncheta ahụ.
3. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị nwere mmasị na ndị na-adịghị ejekwa ozi aka irite uru n’Ememe Ncheta ahụ?
3 Kpọọ Ndị Ọzọ Ka Ha Bịa: N’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke February, a mara ọkwa banyere mkpọsa pụrụ iche a ga-eme iji kpọọ ndị mmadụ maka ihe omume a dị mkpa. Ì meela ndokwa iso mee mkpọsa a n’ụzọ zuru ezu? Ì detuola aha ndị nile ị na-eme atụmatụ ịkpọ? Ị̀ malitela ịkpọ ha? Mee ndokwa ịbịa nnọọ n’oge n’anyasị nke ụbọchị Ememe Ncheta ahụ iji nabata ndị ị kpọrọ nakwa ndị ọzọ nwere mmasị. I nwere ike iso ha nọrọ n’oche, hụkwa na ha ji Bible na akwụkwọ abụ. Mee ka ndị ọzọ n’ọgbakọ mata ndị ha bụ. Mgbe ihe omume ahụ gasịrị, wepụta oge zaa ha ajụjụ ndị ha nwere. Kpọọ ha ka ha bịa gere okwu ihu ọha pụrụ iche a ga-ekwu n’April 15. Ndị okenye karịsịa kwesịrị ịhụ na a kpọrọ ụmụnna ndị na-adịghị ejekwa ozi ka ha bịa Ememe Ncheta nakwa ka ha bịa gere okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche.
4. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị mmadụ aka inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ mgbe e mesịrị Ememe Ncheta ahụ?
4 Nyere Ndị Ọhụrụ Nwere Mmasị na Ndị Na-adịghị Ejekwa Ozi Aka Inwe Ọganihu: Onye ga-ekwu okwu Ememe Ncheta ahụ ga-akọwa, n’ụzọ dị nkenke, na anyị na-eduzi ọmụmụ Bible n’efu, ọ ga-agbakwa ndị ọhụrụ nwere mmasị ume ịga n’ihu n’ịmụ banyere Jehova. Ị pụrụ ịdabere n’ihe ndị o kwuru nyekwuoro ndị ị kpọrọ oku aka n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụrụ na a malitebeghị ịmụrụ ha Bible, hụ na ị gara leta ha ngwa ngwa Ememe Ncheta ahụ gasịrị, gosikwa ha otú anyị si eduzi ọmụmụ Bible n’efu. Ka ha wee nwee ike inwetakwu ihe ọmụma banyere Chineke ma nwekwuo okwukwe n’ebe ọ nọ, ọ dịkwa ha mkpa ịdị na-abịa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. (Hib. 10:24, 25) Iji mezuo nke a, gbaa ha ume ịmalite na-abịachi nzukọ anya. Ndị okenye kwesịrị ịga leta ụmụnna ndị na-adịghị ejekwa ozi bụ́ ndị bịara Ememe Ncheta ma nyere ha aka ichebakwuru ihe ndị e kwuru n’Ememe Ncheta ahụ echiche. Nke a pụrụ ịgba ha ume ịmaliteghachi jewe ozi ma bịawa ọmụmụ ihe.
5. Olee mmetụta Ememe Ncheta pụrụ inwe ná ndụ anyị?
5 Oge Ememe Ncheta bụ oge anyị kwesịrị iji tụgharịa nnọọ uche n’ihe Jehova na Jizọs meere anyị. Ntụgharị uche dị otú ahụ na-eme ka anyị hụkwuo ha n’anya ma na-emetụta ụzọ anyị si akpa àgwà. (2 Kọr. 5:14, 15; 1 Jọn 4:11) Ugbu a bụ oge anyị kwesịrị ịmalite kwedebewe maka ihe omume a dị mkpa bụ́ nke anyị nọ na ya ‘akpọsa ọnwụ Onyenwe anyị.’ Ugbu a bụkwa oge anyị kwesịrị iji gbaa ndị nwere mmasị ume ịmalite kwadebewe maka ihe omume a.—1 Kọr. 11:26.