Nyere Ndị Ọzọ Aka Irite Uru n’Ihe Mgbapụta Ahụ
A Ga-eme Ihe Omume E Ji Echeta Ọnwụ Kraịst n’April 12
1. Olee otu ụzọ ndị Chineke si egosi obi ekele ha nwere maka ihe mgbapụta ahụ?
1 “Ekele dịrị Chineke maka onyinye ya a na-apụghị ịkọwa akọwa nke ọ na-enye n’efu.” (2 Kọr. 9:15) Okwu ndị ahụ na-egosi mmetụta anyị na-enwe banyere ịdị mma na obiọma sitere n’ịhụnanya nke Chineke na-egosi ndị nke ya site n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. Obi ekele dị otú ahụ ga-apụta ìhè karịsịa mgbe anyị ga-agbakọta ọnụ n’April 12 iji cheta ọnwụ Kraịst.
2. Olee ndị na-eso ndị ohu Jehova aga ihe omume ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs, oleekwa ihe ọ dị ha mkpa ime iji rite uru n’ihe mgbapụta ahụ?
2 Ihe dị ka nde mmadụ iri na-eso ndị ohu Jehova echeta ọnwụ Jizọs kwa afọ. Site n’ime otú ahụ, ha na-egosi na ha nwetụrụ ekele maka àjà Kraịst. Ma, ka ha wee rite uru n’ihe mgbapụta ahụ, ọ dị ha mkpa igosipụta okwukwe na ya. (Jọn 3:16, 36) Olee otú anyị pụrụ isi nyere ha aka inwe okwukwe dị otú ahụ? N’oge a a ga-echeta ọnwụ Jizọs, anyị pụrụ ịgba ha ume ịdị na-amụ Bible n’onwe ha na ịdị na-abịa nzukọ ọgbakọ ndị anyị na-enwe kwa izu. Tụlee aro ndị na-esonụ.
3. Olee otú anyị pụrụ isi malite ọmụmụ Bible mgbe anyị na-akpọ ndị mmadụ òkù iso anyị mee ihe omume ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs?
3 Ọmụmụ Bible: Mgbe ị kpọrọ mmadụ ka ọ bịa ihe omume a e ji echeta ọnwụ Jizọs, ọ́ gaghị adị mma ka i jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malite iduziri ya ọmụmụ Bible? Gbalịa ịkọwara ya banyere ihe omume ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs site n’ịsapeta peeji nke 206-208, ma soro ya tụlee isiokwu bụ́ “Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Ihe Omume nke Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ.” Unu nwere ike ịtụlecha isiokwu ahụ otu ugbo ma ọ bụ ugboro abụọ unu mụrụ ya. Ikekwe, ị pụrụ ịnọ n’ọnụ ụzọ ụlọ onye ahụ mụọrọ ya ya. Mgbe ị kụzichaara ya ihe dị n’isiokwu ahụ, onye ahụ nwere ike nwee mmasị ịmụ isi nke 5, nke isiokwu ya bụ “Ihe Mgbapụta Ahụ—Onyinye Kasịnụ Chineke Nyere.” Ozugbo unu malitere ịmụchi Bible anya, bidozienụ n’isi nke mbụ mụrụ ruo n’isi nke anọ nke akwụkwọ ahụ.
4. Olee ndị anyị nwere ike ịmalite iduziri ọmụmụ Bible n’oge a a na-eme ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs?
4 Olee ndị anyị nwere ike iji aro a a tụrụ n’elu malitere ọmụmụ Bible? Ikekwe ụfọdụ ndị ọrụ ibe gị, ụmụ akwụkwọ ibe gị, ma ọ bụ ndị agbata obi gị ga-ekwe ka gị na ha nwee ọmụmụ ihe dị otú ahụ. Ụmụnna nwoke nwere ike ịgakwuru ndị di na-ekweghị ekwe nke ụmụnna nwanyị nọ n’ọgbakọ ha. Echefukwala ịgakwuru ndị ikwu gị na-abụghị Ndịàmà. Tụkwasị na nke ahụ, anyị ga-achọ itinye mgbalị pụrụ iche iji kpọọ ndị na-abịachibu ọmụmụ ihe anya ka ha bịa ihe omume a e ji echeta ọnwụ Jizọs. (Luk 15:3-7) Ka anyị gbalịa inyere ndị nile dị otú ahụ aka irite uru n’ihe mgbapụta ahụ.
5. Olee otú anyị pụrụ isi gbaa ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible na ndị ọzọ nwere mmasị ume ịbịa nzukọ ọgbakọ ndị anyị na-enwe kwa izu?
5 Nzukọ Ọgbakọ: Ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs bụ nzukọ mbụ ọtụtụ ndị anyị na-amụrụ Bible na ndị ọzọ nwere mmasị na-abịa. Oleezi otú anyị pụrụ isi gbaa ha ume irite uru ná nzukọ ndị ọzọ anyị na-enwe n’ọgbakọ? Ozi Alaeze Anyị nke April 2005, peeji nke 8 tụrụ aro ndị na-esonụ: “Gwa ha isiokwu okwu ihu ọha ọzọ a ga-ekwu. Gosi ha ihe a ga-amụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nakwa n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Kọwaara ha ihe a na-amụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nakwa ná Nzukọ Ije Ozi. Mgbe i nwere ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ikekwe ị pụrụ ịmụgharị ya n’ihu ha. Kọọrọ ha isi ihe ndị e kwuru ná nzukọ ọgbakọ. Jiri foto ndị dị n’akwụkwọ anyị nyere ha aka ịhụ ihe a na-eme ná nzukọ anyị. Malite n’ụbọchị mbụ i duziiri ha ọmụmụ ihe gbawa ha ume ịbịa nzukọ.”
6. Olee ụzọ abụọ anyị pụrụ isi nyere ndị nwere obi eziokwu aka irite uru n’ihe mgbapụta ahụ?
6 Mgbe ndị nwere obi eziokwu na-amụchi Bible anya ma na-abịachi nzukọ ọgbakọ anya, ha na-enwekarị ọganihu ime mmụọ ngwa ngwa. N’ihi ya, ka anyị na-agba ndị ọzọ ume irite uru ná ndokwa ndị e mere iji mee ka anyị na Chineke dị ná mma nakwa n’ihe mgbapụta ahụ, nke bụ́ onyinye kasịnụ Chineke nyere.