Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite na March 13
Abụ nke 41
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa March. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke March 15 na Teta! nke January-March. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. Ná ngwụsị nke ihe ngosi nke mbụ, mee ka onye nkwusa jiri ihe dị na peeji ikpeazụ nke Ụlọ Nche ahụ kpọọ onye nwe ụlọ òkù ịbịa ihe omume ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs.
Minit 20: Ọkwá Ọrụ Kraịst ná Ndokwa Chineke. Okwu nke ga-adabere n’akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 10-13. Mgbe a na-atụle paragraf abụọ mbụ dị n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Ihe Bụ́ Ọkwá Ọrụ Kraịst,” jiri minit atọ ma ọ bụ anọ tụọ aro ma meekwa ihe ngosi nke ụzọ ndị a pụrụ isi jiri akwụkwọ ịkpọ òkù maka ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs mee ihe. Tụleghachi aro ndị a tụrụ n’Ozi Alaeze Anyị nke February 2006, peeji nke 3, paragraf nke 3.
Minit 15: “Ụzọ Isi Jiri Akwụkwọ Bible Na-akụzi Malite Iduzi Ọmụmụ Bible.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke ga-adabere na peeji nke atọ nke ihe ntinye. A ga-emekwa ihe ngosi na ya. Anyị pụrụ ịmalite ozugbo iji akwụkwọ Bible Na-akụzi duziwere ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible. Mee ndokwa ka e mee ihe ngosi atọ a kwadebere nke ọma bụ́ ndị a ga-egosi (1) ụzọ a pụrụ isi jiri peeji nke 4-5 malite ọmụmụ Bible mgbe a gara nletaghachi, (2) ụzọ a pụrụ isi jiri peeji nke 6 mee ya, na (3) ụzọ a pụrụ isi jiri paragraf nke mbụ nke peeji nke 7 mee ya. Buru ụzọ kwuo otú a ga-esi mee ihe ngosi nke ọ bụla tupu e mewe ya. E mesịa ya, tụleghachi isi ihe ndị e mere na ya. A pụrụ ịmụ paragraf ndị ahụ dị n’akwụkwọ Bible Na-akụzi, bụ́ ndị a ga-eji mee ihe ngosi ndị a, n’ụzọ dị nkenke dị ka mkpa si dị. Ihe a ga-eji mechie ihe ngosi nke ọ bụla bụ onye nkwusa ime ndokwa maka ịbịaghachi ọzọ.
Abụ nke 125 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na March 20
Abụ nke 18
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụleghachi isi ihe ndị sitere n’igbe bụ́ “Ihe Ndị A Ga-echeta Banyere Ihe Omume E Ji Echeta Ọnwụ Jizọs.”
Minit 15: “Nyere Ndị Ọzọ Aka Irite Uru n’Ihe Mgbapụta Ahụ.”a N’ihe omume na-eso nke a, a ga-atụlekwu ụzọ anyị pụrụ isi jiri peeji nke 206-208 nke akwụkwọ Bible Na-akụzi mee ihe mgbe anyị na-akpọ ndị mmadụ òkù ịbịa ihe omume ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs.
Minit 20: Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Ihe Omume nke Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ. Ntụle ajụjụ na azịza nke ga-adabere na peeji nke 206-208 nke akwụkwọ Bible Na-akụzi. N’okwu mmeghe nke na-agaghị eru otu minit, gosi otú a pụrụ isi malite ịgwa onye nwe ụlọ banyere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, site n’ịgụpụta paragraf nke mbụ. I gosichaa ya, gwa ndị na-ege ntị ka ha zaa ajụjụ ndị na-esonụ. A gaghị agụpụta paragraf ndị ahụ agụpụta: (para. 2) Olee mgbe Jizọs guzobere ihe omume ahụ e ji echeta ọnwụ ya? (para. 3) Ugboro ole ka e kwesịrị ịdị na-eme ya? (para. 4) Olee otú Bible kọrọ e si mee ihe omume a e ji echeta ọnwụ Jizọs? (para. 5) Olee otú anyị si mara na Jizọs emeghị ka achịcha ahụ ghọọ anụ ahụ́ ya nakwa na o meghị ka mmanya ahụ ghọọ ọbara ya? (para. 6) Gịnị ka achịcha ahụ na-ekoghị eko na-anọchi anya ya? (para. 7) Gịnị ka mmanya ahụ na-acha ọbara ọbara na-anọchi anya ya? (para. 8) Nanị ole ndị kwesịrị ịta achịcha ma ṅụọ mmanya ahụ? (para. 9) Ole mgbe n’afọ ka a na-eme ihe omume a e ji echeta ọnwụ Jizọs, gịnịkwa mere anyị ji kwesị ịdị na-aga ya? Mee ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị bụ́ isi pụta ìhè dị ka oge kwere mee. Gbaa mmadụ nile ume iso ndị ha na-eduziri ọmụmụ Bible na ndị ọzọ ha kpọrọ òkù ịbịa ihe omume a e ji echeta ọnwụ Jizọs tụlee isiokwu a site n’ịgụ paragraf ndị dị na ya, ikwurịta isi ihe ndị dị n’ime ya, na iji ajụjụ ndị dị mfe, dị ka ndị ahụ e depụtara n’isiokwu a, mee ihe.
Abụ nke 134 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na March 27
Abụ nke 44
Minit 15: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa March. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke April 1 na Teta! nke January-March. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. Gosikwa otú a pụrụ isi jiri akwụkwọ ịkpọ òkù e biri ebi kpọọ ndị nwere mmasị òkù ịbịa ihe omume ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs.
Minit 15: Ahụmahụ ndị e nwere n’ókèala unu. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwetara mgbe ha na-enyefe akwụkwọ Bible Na-akụzi n’ọnwa March. Mee ka ọmụmụ Bible ndị e ji akwụkwọ ahụ malite pụta ìhè. A pụrụ iji otu ma ọ bụ abụọ n’ime ahụmahụ ndị bụ́ ịgba a kọrọ mee ihe ngosi.
Minit 15: “Kụziere Ndị Dị Umeala n’Obi Ije Ije n’Ụzọ Chineke.”b Gụnye ihe ndị e kwuru n’Ụlọ Nche nke July 1, 2004, peeji nke 16, paragraf nke 9.
Abụ nke 170 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite n’April 3
Abụ nke 199
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụleghachi n’ụzọ dị mkpirikpi isiokwu bụ́ “Nweta Obi Aṅụrị n’Ịmụ Akwụkwọ Bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?” bụ́ nke gbara na peeji nke 6, n’Ozi Alaeze Anyị nke February 2006. Dọrọ uche gaa n’usoro ọmụmụ ihe maka akwụkwọ Bible Na-akụzi. Gosikwa otú a pụrụ isi jiri akwụkwọ ịkpọ òkù e biri ebi kpọọ ndị nwere mmasị òkù ịbịa ihe omume ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs.
Minit 15: Kụziere Ndị Ị Na-eduziri Ọmụmụ Bible Ime Nkwadebe. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke ga-adabere n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke November 2005, peeji nke 4, akụkụ nke 4. A pụkwara ihota ihe e kwuru n’Ozi Alaeze Anyị nke December 2004, peeji nke 1. Jiri ihe atụ ndị dị n’isi nke 1 nke akwụkwọ Bible Na-akụzi mee ka ihe a na-ekwu doo anya.
Minit 20: Ndị Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị Mere Ka Ha Gbasie Ike. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke ga-adabere n’okwu mmalite nke Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2006. Mee ndokwa ka e mee ihe ngosi nke ebe otu ezinụlọ na-eme ihe mmụta dịịrị ụbọchị nke ụbọchị taa.
Abụ nke 93 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.