Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Feb. 15
“A sị gị họpụta onye ga-achị ụwa, olee onye ị ga-ahọrọ? [Chere ka ọ zaa.] Ụlọ Nche a na-akọwa otú Mezaịa ahụ, bụ́ onye Chineke họpụtarala ịchị ụwa, si ruo eruo. Ọ na-akọwakwa ihe ọchịchị ya ga-emere ụmụ mmadụ.” Gụọ Aịsaịa 9:6, 7.
Ụlọ Nche Mar. 1
“Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ kweere na anyị kwesịrị ịdị na-ahụrịta ibe anyị n’anya, dị ka Jizọs nyere n’iwu n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a. [Gụọ Jọn 13:34, 35.] Ma, ebee ka anyị pụrụ ịchọta ndị na-etinye ihe Jizọs kụziri n’ọrụ, ná ndụ ha? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-atụle otú anyị pụrụ isi mata ezi Ndị Kraịst taa.”
Teta! Jan.–Mar.
“Ì chetụla echiche banyere ihe ọdịnihu ga-abụrụ ụmụ mmadụ? [Chere ka ọ zaa.] Bible na-agwa anyị ezigbo ihe mere anyị ga-eji kwere na ọdịnihu ga-aka mma. [Gụọ Daniel 2:44.] Magazin a na-egosi ihe Chineke ga-emere ndị na-erubere ya isi site n’Alaeze eluigwe ya.”
“Ị̀ ma na ọ dịla anya Bible kwuru okwu banyere ọrịa na-efe efe anyị na-ahụ n’oge anyị a? [Gụọ Luk 21:11. Ị gụsịa ya, i chere ka ọ zaa.] Mgbe Jizọs Kraịst kwuru banyere ọrịa na-efe efe a ga-enwe n’ụbọchị ikpeazụ, o gosiri n’ezie na e nwere ihe mere a ga-eji nwee nchegbu. Ma Bible na-agwakwa anyị ihe ga-eme ka anyị nwee olileanya.” Gosi ya isiokwu dị na peeji nke 10-11.