Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Jan. 15
“N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ mmadụ amalitela inwe oké mmasị n’ebe ndị mmụọ ozi nọ. Ò nwetụla mgbe i chere banyere ndị ha bụ na otú ha si emetụta ndụ anyị? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ Abụ Ọma 34:7.] Magazin a na-atụle ihe Bible na-ekwu banyere ọrụ ndị mmụọ ozi—n’oge ndị gara aga, n’oge a, nakwa n’ọdịnihu.”
Teta! Jan.–Mar.
“Taa, e nwere ndụmọdụ banyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla. Ole n’ime ha ka i chere anyị pụrụ ịtụkwasị obi? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ 2 Timoti 3:16.] Teta! a na-egosi ihe mere anyị ga-eji were Bible dị ka ebe bụ́ isi anyị ga-esi enweta ezi amamihe.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 22.
Ụlọ Nche Feb. 1
“Ego dị anyị nile mkpa ná ndụ. Ma, ì kwetara na ọ dị mkpa ịnọ na nche megide ihe ize ndụ e kwuru banyere ya ebe a? [Gụọ 1 Timoti 6:10, ị gụsịa ya, i chere ka ọ zaa.] Ụlọ Nche a na-enye aka ịmata ụfọdụ nsogbu ndị na-adịkarị n’ịchọ inwekwu ego, o kwukwara ụzọ a pụrụ isi zere ha.”