Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Jan. 15
“N’ihi na nkwa ndị a na-emezughị emezu jupụtara ebe nile n’oge anyị a, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịtụkwasị onye ọ bụla obi. Ì chere na ọ dị onye anyị pụrụ ịtụkwasị nkwa ya obi? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụọ Joshua 23:14.] Magazin a na-egosi otú anyị pụrụ isi wulite obi ike anyị n’ebe nkwa dị iche iche nke Chineke dị, bụ́ ndị e dekọrọ na Bible.”
Teta! Feb. 8
“Otú a ka e si ede aha aka Chineke n’asụsụ Hibru. [Gosi ihu magazin ahụ.] Ụfọdụ mmadụ kwenyesiri ike na e kwesịghị ịnwa anwa kpọọ aha Chineke. Ndị ọzọ na-eji ya eme ihe n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla. Mbipụta Teta! a na-atụle arụmụka a. Ọ na-atụlekwa otú anyị pụrụ isi mara Chineke site n’aha ya.” Gụọ Abụ Ọma 83:18.
Ụlọ Nche Feb. 1
“Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-agbalị ilekọta mkpa anụ ahụ́ anyị. Otú ọ dị, nchọpụta ndị e mere na nso nso a na-egosi na ọnọdụ ime mmụọ anyị na-emetụtakwa ahụ́ ike anyị. Ì chere na nke a pụrụ ikwe omume? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ, gụọ Matiu 5:3.] Mbipụta Ụlọ Nche a na-atụle otú anyị pụrụ isi na-emeju mkpa ime mmụọ anyị.”
Teta! Feb. 8
“Ọtụtụ mmadụ taa na-ejikarị ọrụ n’aka, ezumike dịkwa ha mkpa. Eleghị anya, ị pụrụ ikwenye n’okwu ndị a e dere n’ihe karịrị afọ 3,000 gara aga. [Gụọ Eklisiastis 4:6. Mgbe ahụ, nye ohere maka nzaghachi.] Mbipụta Teta! a na-enye ihe ọmụma bara uru banyere otú a pụrụ isi mata ma nagide nsogbu nke iji ụra ụgwọ.”