Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Jan. 15
“N’ihi ọbara nile a kwafuworo, ì chere na ihe ọjọọ emeriwo ezi ihe? [Nye ohere maka nzaghachi.] Rịba ama ihe Bible na-ekwu banyere Chineke. [Gụọ Abụ Ọma 83:18b.] Ebe Chineke bụ Onye Kasị Ihe Nile Elu n’ụwa, ihe ọjọọ ọ̀ pụrụ imeri n’ezie? [Nye ohere maka nzaghachi.] Mbipụta Ụlọ Nche a zara ajụjụ ahụ n’ụzọ na-eju afọ.”
Ụlọ Nche Feb. 1
“Ọtụtụ mmadụ taa na-echegbu onwe ha banyere enweghị ọrụ, ndị ọzọ na-enwekwa nrụgide dị ukwuu n’ebe ha na-arụ ọrụ. Ì chere na ọ ga-ekwe omume mmadụ inwe obi ụtọ na ahụ́ iru ala n’ebe ọ na-arụ ọrụ? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụọ Aịsaịa 65:21-23.] Mbipụta Ụlọ Nche a na-ekwu banyere mgbe mmadụ nile ga-enwe ọrụ na-enye afọ ojuju.”
Teta! Feb. 8
“Ịnọ ná nchebe anyị nọ n’ihe ize ndụ dị ka ọ na-anọtụbeghị. Otu ihe na-akpatara ndị mmadụ nchegbu nke na-arịwanye elu bụ ihe a na-akpọ ohi ihe e ji amata mmadụ. Ị̀ nụtụla banyere ya? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-ekwe nkwa na otu ụbọchị a ga-ewepụ n’ụwa a ihe nile na-eme ka anyị ghara ịnọ ná ntụkwasị obi. [Gụọ Aịsaịa 11:9.] Magazin a na-akọwa otú a ga-esi mezuo nke a.”
“Mbipụta Teta! a na-akọ banyere otu ihe dị oké njọ na-eme n’ezie n’oge anyị—ụmụaka ịgba akwụna. Ụdị mmetọ a jọgburu onwe ya a na-emetọ ụmụaka bụ ihe Bible na-ekwe nkwa na ọ ga-akwụsị n’isi nso. [Gụọ Ilu 2:21, 22.] Magazin a na-egosi ihe na-akpata iji ụmụaka eme ihe maka uru onwe onye dị otú ahụ nakwa otú a ga-esi kwụsị ya.”