Ihe Ndị A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Jan. 1
“Ì kweere ihe a e dere ebe a? [Gụọ Jems 3:2.] Isiokwu a tụụrụ anyị aro ụfọdụ sitere na Baịbụl bụ́ ndị ga-enyere anyị aka izere iji okwu ọnụ anyị kpasuo ndị ezinụlọ anyị iwe.” Gosi ya isiokwu nke malitere na peeji nke 10.
Ụlọ Nche Feb. 1
“N’ihi ọtụtụ nsogbu ndị anyị na-enwe taa, ì chere na mmadụ ga-enwe ike inwe udo nke obi? [Chere ka ọ zaa.] Ịmụ banyere olileanya sitere na Baịbụl maka ọdịnihu enyerela ọtụtụ ndị aka. [Gụọ otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị dị n’isiokwu nke ị chọrọ iji nyefee magazin ahụ.] Magazin a gosiri ihe Baịbụl kwuru banyere otú e si kee anyị, ihe mere anyị ji dịrị ndụ, na ihe anyị nwere ike ịtụ anya ya n’ọdịnihu.”
Teta! Jan.–Mar.
“Ọtụtụ mmadụ na-ebi ndụ n’ụzọ kasị mma ha pụrụ isi bie ya, ha chekwara na ọ dị mkpa ịbụ ezigbo mmadụ. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị? [Chere ka ọ zaa.] Ka m gosi gị ihe mere ọ ga-eji kpatara anyị ọdachi ma ọ bụrụ na ihe anyị weere na ọ bụ ezigbo ihe adị iche n’ihe Chineke weere na ọ bụ ezigbo ihe. [Gụọ Ilu 14:12.] Isiokwu a kwuru otú mmadụ ga-esi bụrụ ezigbo mmadụ n’anya Chineke.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 8.
“Alụmdi na nwunye ọ bụla nwere nsogbu nke ya. Olee ebe i chere di na nwunye nwere ike isi nweta ndụmọdụ ga-abara ha uru? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ntụziaka a magburu onwe ya. [Gụọ Ndị Efesọs 5:22, 25.] Isiokwu a kọwara ihe nwaanyị ịnọ n’okpuru di ya pụtara.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 16.