Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Feb. 15
“Ụfọdụ ndị na-eche ma Chineke ọ̀ bụ onye n’ezie. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ dị ma ha na-eche na ọ nọghị ha nso. Ị̀ chọpụtawo nke a? [Nye ohere maka nzaghachi.] Rịba ama ihe mmadụ ịmara Chineke ji dị oké mkpa. [Gụọ Jọn 17:3.] Banyere nke a, ị ga-enwe mmasị ịgụ isiokwu ndị bu ụzọ ná mbipụta a.”
Ụlọ Nche Mar. 1
“Anyị ga-achọ ịmata ihe bụ echiche gị banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-adọrọ mmasị. [Gụọ Matiu 5:10.] Olee otú mmadụ pụrụ isi na-enwe obi ụtọ mgbe a na-akpagbu ya? [Nye ohere maka nzaghachi.] Isiokwu abụọ mbụ dị na magazin a na-akọ banyere ụfọdụ ndị bụ́ ndị nọgidere na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ahụhụ ha na-ata. Ị ga-enwe mmasị ịgụ otú ha si mee nke ahụ.”
Teta! Mar. 8
“Ì chere na Chineke zubere ka ụmụ mmadụ, gụnyere ụmụaka, bụrụ ndị na-enweghị ezigbo ihe oriri zuuru ha? [Nye ohere maka nzaghachi.] Rịba nkwa a na-enye nkasi obi nke dị n’ime Bible ama. [Gụọ Abụ Ọma 72:16.] Mbipụta Teta! a tụlere ihe ndị na-akpata enweghị ezigbo ihe oriri nakwa, nke ka mkpa, nkwa Chineke kwere ịkwụsị ha n’isi nso.”
“Í kwetaghị na n’agbanyeghị nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ na anyị ka nwere ihe mere anyị ga-eji nwee ekele? [Nye ohere maka nzaghachi.] Otu ihe mere anyị ga-eji nwee ekele bụ ụzọ e si mee anyị. [Gụọ Abụ Ọma 139:14.] Lee ekele anyị kwesịrị inwe na anyị nwere ikike ịmata ihe dị iche iche bụ́ ndị dị mkpa iji jiri ndụ kpọrọ ihe, dị ka mbipụta Teta! a na-egosi!”