Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/07 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite na March 12
  • Izu Na-amalite na March 19
  • Izu Na-amalite na March 26
  • Izu Na-amalite n’April 2
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 3/07 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite na March 12

Abụ nke 153

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa March. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche March 15 na Teta! January–March. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. Chetara ndị nkwusa na mgbe a ga-amalite mkpọsa ahụ pụrụ iche a ga-eji kpọọ ndị mmadụ ịbịa Ememe Ncheta bụ na March 17.

Minit 15: Mgbe Onye A Hụrụ n’Anya Kwụsịrị Ijere Jehova Ozi. Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche September 1, 2006, peeji nke 17-21.

Minit 20: “Nọgidenụ Na-eme nke A Iji Na-echeta M.”a Mgbe ị na-atụle paragraf nke 3, gụnye ihe e kwuru n’Ozi Alaeze Anyị nke March 2006, peeji nke 1, paragraf nke 3, banyere otú anyị pụrụ isi jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi kọwaara onye nwere mmasị anyị kpọrọ ka ọ bịa Ememe Ncheta ahụ banyere ihe omume a e ji echeta ọnwụ Jizọs.

Abụ nke 168 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na March 19

Abụ nke 45

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Tụlee isi ihe ndị dị n’igbe bụ́ “Ihe Ndị A Ga-echeta Banyere Ihe Omume E Ji Echeta Ọnwụ Jizọs,” bụ́ nke dị na peeji nke 3.

Minit 20: Ụzọ Ndị Ị Pụrụ Isi Mụbaa Ozi Gị. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’isi 10 nke akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova.

Minit 15: “Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?”b Mee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi na-eji isiokwu a eme ihe site n’oge ruo n’oge mgbe a na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ.

Abụ nke 216 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na March 26

Abụ nke 115

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa March. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche April 1 na Teta! January–March, nakwa akwụkwọ ịkpọ oku pụrụ iche maka Ememe Ncheta. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe.

Minit 15: Mkpa ọgbakọ.

Minit 20: Gịnị Ka M Kwesịrị Iji Ndụ M Mee? Okwu ga-adabere na Teta! July–September 2006, peeji nke 16-18. Gbaa otu ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ bụ́ ndị malitere ozi oge nile mgbe ha gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Gịnị mere ha ji họrọ ije ozi oge nile? Olee ngọzi ndị ha nwetarala?

Abụ nke 148 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite n’April 2

Abụ nke 177

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee ihe dị n’azụ Ụlọ Nche April 1, 2007 bụ́ nke e ji na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa gere okwu ihu ọha pụrụ iche, ma gbaa ndị nkwusa ume ịkpọ ndị nwere mmasị ka ha bịa gere okwu ihu ọha ahụ a ga-ekwu n’April 15.

Minit 20: Nọgide Na-enyere Ndị Bịara Ememe Ncheta Aka. Okwu okenye ga-ekwu. Kwuo mmadụ ole bịara Ememe Ncheta n’ọgbakọ unu, nakwa mmadụ ole n’ime ha e weere dị ka ndị nwere mmasị. Kọọ otu n’ime ahụmahụ ndị bụ́ ịgba e nwetara banyere ndị natara akwụkwọ ịkpọ oku pụrụ iche maka Ememe Ncheta, ma ọ bụkwanụ banyere ndị nyere ndị atendantị aha ha mgbe e mesịrị ihe omume ahụ ma rịọ ka a bịa duziwere ha ọmụmụ Bible. Kwuo otú a pụrụ isi nyekwuoro ndị bịaranụ aka n’ụzọ ime mmụọ. (Lee km-IB 3/06, p. 1, para. 5; km-IB 2/05, p. 4, para. 9; km-IB 2/04, p. 5, para. 16.) Gbaa ndị nkwusa ume ịmalite inyere ndị a aka ozugbo.

Minit 15: Jiri Akwụkwọ Yearbook 2007 Mee Ihe nke Ọma. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Tụleghachi isi ihe ndị dị ‘n’Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Òtù Na-achị Isi.’ Kọọ ihe ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ merenụ n’afọ gara aga, bụ́ ndị e dekọrọ n’akwụkwọ Yearbook 2007, n’okpuru isiokwu bụ́ “Worldwide Report.” Mee ndokwa tupu oge eruo ka ndị nkwusa ole na ole kọọ banyere ahụmahụ ndị ha gụtara bụ́ ndị gbara ha ume ma wusie okwukwe ha ike. Gbaa ezinụlọ nile ume iji nwayọọ nwayọọ gụchapụ akwụkwọ ahụ n’afọ a. Tụọ aro otú a pụrụ isi jiri akwụkwọ ahụ nyere ndị ọhụrụ aka ịmata nzukọ Jehova, nakwa iji ya gbaa ha ume ịdị na-abịa ọmụmụ ihe.

Abụ nke 179 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya