Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Eprel 18
IZU NA-AMALITE N’EPREL 18
Abụ nke 17 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 2 ¶16-23 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Job 28-32 (Nkeji 10)
Nke 1: Job 30:1-23 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Baptizim Bụ Ihe A Chọrọ n’Aka Onye Kraịst—td 6A (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Chee Echiche Tupu Anyị Ekwuo Okwu—Ilu 16:23 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Gwa mmadụ niile ka ha kwadebe ihe omume a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi n’izu ọzọ, nke isiokwu ya bụ: “Teta! Ọ̀ Na-abara Gị Uru?”
Nkeji 10: Mgbe Ndị Ọzọ Chọrọ Ka A Kọwaara Ha Ihe. Okwu ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 177, paragraf nke 3, ruo na paragraf ikpeazụ dị na peeji nke 178. Mee ihe ngosi ebe onye na-abụghị Onyeàmà na-ajụ onye ọrụ ibe ya bụ́ Onyeàmà ajụjụ gbasara ihe anyị kweere. Onye nkwusa ahụ ga-ebu ụzọ kwupụta ihe o bu n’obi ịza onye ahụ. Ya mechazie, ya azaa onye ahụ ajụjụ ọ jụrụ ya.
Nkeji 10: Igbe Ajụjụ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, bụ́ nke okenye ga-ekwu.
Nkeji 10: Ụzọ Ndị E Si Ekwusa Ozi Ọma Ahụ—Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke ga-esi n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 92, paragraf nke 3, ruo peeji nke 95, paragraf nke 2. Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ. Ha ga-abụ ndị na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’agbanyeghị nsogbu ndị ha nwere. Nsogbu ha nwere ike ịbụ ọrịa ma ọ bụ ime ihere. Olee uru ha riterela ná mbọ ha na-agba?
Abụ nke 26 na Ekpere