Ịkwadebe Okwu Onye Mmụta Maka Ụlọ Akwụkwọ
IHE omume ọ bụla n’ụlọ akwụkwọ na-enye ohere maka ito eto. Tinyesie mgbalị ike, ọganihu gị ga-ejikwa nwayọọ nwayọọ pụta ìhè, nye ma gị onwe gị ma ndị ọzọ. (1 Tim. 4:15) Ụlọ akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịzụlite ikike gị n’ụzọ zuru ezu karị.
Ahụ́ ọ̀ na-ama gị jijiji maka na ị na-atụ anya ikwu okwu n’ihu ọgbakọ? Nke a dị otú o kwesịrị, ọ bụrụgodị na ọ dịtụla anya i denyere aha gị n’ụlọ akwụkwọ. Otú ọ dị, ihe ụfọdụ pụrụ inye aka ibelata nchegbu ị na-enwe. N’ụlọ, mee ka ọ mara gị ahụ́ ịdị na-agụpụta ihe agụpụta mgbe mgbe. Ná nzukọ ọgbakọ, na-aza ajụjụ mgbe mgbe, ọ bụrụkwa na ị bụ onye nkwusa, na-ekerechi òkè anya n’ozi ubi. Nke a ga-eme ka i nwee ahụmahụ n’ikwu okwu n’ihu ndị ọzọ. Ọzọkwa, malite nnọọ n’oge na-akwadebe okwu gị dị ka onye mmụta, mụọkwa ikwupụta ha ekwupụta. Cheta na ndị ị ga-ekwu okwu n’ihu ha bụ ndị enyi gị. Tupu i kwuo okwu ọ bụla, kpegara Jehova ekpere. Ọ na-eji obi ụtọ enye ndị ohu ya, bụ́ ndị na-arịọ ya, mmụọ nsọ.—Luk 11:13; Fil. 4:6, 7.
Tụọ anya ihe ezi uche dị na ya. Ọ na-ewe oge iji nwee ahụmahụ dị ka ọkà okwu nakwa ịghọ onye ozizi dị irè. (Maị. 6:8) Ọ bụrụ na ọ dịbeghị anya i denyere aha gị n’ụlọ akwụkwọ, atụla anya ime ihe omume magburu onwe ya ozugbo ahụ. Kama nke ahụ, rụọ ọrụ n’otu isi ihe a ga-enye ndụmọdụ na ya n’otu oge. Mụọ nkebi nke tụlere ya n’akwụkwọ a. Ọ bụrụ na o kwe mee, mee ihe omume a tụrụ aro n’ebe ahụ ka e mee. Nke a ga-eme ka i nwee ahụmahụ n’okwu ndị metụtara ihe a ga-enye gị ndụmọdụ na ya tupu i mee ihe omume gị n’ọgbakọ. Ọganihu ga-abịa.
Ụzọ Isi Kwadebe Ihe Omume Ịgụ Ihe
Ịkwadebe maka ịgụ ihe n’ihu ọha na-emetụta ihe karịrị nanị inwe ike ịkpọpụta okwu ndị dị n’ihe ọgụgụ ahụ e kenyere gị. Gbalịa ịghọta nke ọma ihe ihe ọgụgụ ahụ pụtara. Ozugbo ị natara ihe omume gị, buru nzube ahụ n’obi gụọ ya. Gbalịa ịghọta isi ihe dị n’ahịrịokwu nke ọ bụla nakwa echiche a na-akọwapụta na paragraf nke ọ bụla, ka i wee nwee ike iwepụta echiche ahụ n’ụzọ ziri ezi ma jiri mmetụta kwesịrị ekwesị gụọ ya. N’ebe o kwere omume, lee akwụkwọ ọkọwa okwu maka ụzọ ziri ezi e si akpọ okwu ndị ị na-amachaghị. Ghọta ihe ọgụgụ ahụ nke ọma. Ọ pụrụ ịdị ndị mụrụ ụmụ mkpa inyere ụmụaka ha aka ime nke a.
È kenyewo gị ịgụ otu ebe na Bible ma ọ bụ ma eleghị anya ịgụpụta paragraf ndị dị n’otu isiokwu dị n’Ụlọ Nche? Ọ bụrụ na e nwere kaseti a na-ege ege nke ihe ọgụgụ ahụ dị na ya n’asụsụ gị, ọ pụrụ ịbụ nnọọ ihe na-enye aka igere ọgụgụ ya ma rịba ihe ndị dị ka ịkpọ okwu, nkebi okwu, imesi okwu ike, na mgbanwe olu ama. Mgbe ahụ gbalịa iji nkà ndị a mee ihe n’ọgụgụ ihe nke gị.
Mgbe ị malitere ịkwadebe ihe omume gị, hụ na i ji nlezianya mụọ ihe ọmụmụ nke tụlere nkà okwu ahụ e kenyere gị. Ọ bụrụ na o kwe mee, tụleghachi ya mgbe ị mụgharịsịworo ịgụpụta ihe ahụ e kenyere gị ọtụtụ ugboro. Gbalịa itinye ndụmọdụ ahụ e dere ede n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu ruo n’ókè o kwere mee.
Ọzụzụ a ga-abara gị uru n’ozi gị. Ka ị na-eje ozi ubi, i nwere ọtụtụ ohere iji gụpụtara ndị ọzọ ihe. Ebe ọ bụ na Okwu Chineke nwere ikike ịgbanwe ndụ ndị mmadụ, ọ dị mkpa ka ị gụzie ya agụzi. (Hib. 4:12) Atụla anya ịmụtacha akụkụ nile nke ịgụ ihe n’ụzọ dị irè n’otu ihe omume ma ọ bụ abụọ. Pọl degaara otu Onye Kraịst bụ́ okenye nke nweworo ahụmahụ ruo ọtụtụ afọ akwụkwọ, sị: “Nọgide na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha.”—1 Tim. 4:13.
Iji Isiokwu na Ọnọdụ Okwu Na-eme Ihe
Mgbe ị natara ihe omume n’ụlọ akwụkwọ bụ́ nke chọrọ ka e nwee ọnọdụ okwu, olee otú i kwesịrị isi malite?
Ọ dị mkpa ka e chebara ihe atọ bụ́ isi echiche: (1) isiokwu e kenyere gị, (2) ọnọdụ okwu gị na onye gị na ya ga-ekwurịta okwu, na (3) isi ihe a ga-enye gị ndụmọdụ na ya bụ́ nke e kenyeworo gị ka ị rụọ ọrụ na ya.
Ọ dị gị mkpa iwekọta ihe ọmụma ndị metụtara isiokwu e kenyere gị. Ma tupu ị gamie na nke ahụ, chesie echiche ike banyere ọnọdụ okwu gị nakwa onye gị na ya ga-ekwurịta okwu, ebe ọ bụ na ihe ndị a ga-emetụta ụdị ihe ndị ị ga-ekwu na otú ị ga-esi kwuo ha. Olee ọnọdụ okwu ị gaje iji mee ihe? Ị̀ gaje ime ihe ngosi n’otú ị ga-esi zie onye ị maara ozi ọma? Ka ị̀ ga-egosi ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na i zute mmadụ na nke mbụ ya? Ònye ahụ ọ̀ tọrọ gị ka ị̀ tọrọ ya? Gịnị ka o nwere ike iche banyere isiokwu ị na-eme atụmatụ ịtụle? Ihe hà aṅaa ka o yiri ka ọ mabụ banyere ya? Ebumnobi dị aṅaa ka ị na-atụ anya imezu site ná mkparịta ụka unu? Azịza nye ajụjụ ndị ahụ ga-abụ ụkpụrụ nduzi dị mkpa ndị a ga-eji mee ihe.
Olee ebe ị ga-achọta ihe ọmụma metụtara isiokwu ahụ e kenyere gị? Na peeji nke 33 ruo nke 38 nke akwụkwọ a, a tụlere “Ụzọ Isi Mee Nnyocha.” Gụọ ya, ma jirizie ihe ndị e ji eme nnyocha ị pụrụ inweta mee ihe. Ọtụtụ mgbe, ị ga-achọta, n’egbughị oge ọ bụla, ihe ọmụma karịrị ókè ị pụrụ iji mee ihe. Gụọ ihe buru ibu ka i wee mara ihe ndị ọzọ ị ga-enwe ike ime. Otú ọ dị, ka ị na-eme nke ahụ, buru n’obi ihe ga-abụ ọnọdụ okwu nke ihe omume gị nakwa onye gị na ya gaje ikwurịta okwu. Kanye akara n’isi ihe ndị dabara adaba iji mee ihe.
Tupu ị hazie okwu gị ma họrọ ihe nile ị ga-emesịa jiri mee ihe, jiri nwayọọ gụọ ebe a tụlere ihe a ga-enye gị ndụmọdụ na ya bụ́ nke e kenyere gị. Itinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ bụ otu n’ime isi ihe mere e ji nye gị ihe omume.
Site n’imecha ihe omume gị n’oge e nyere maka ya, ị ga-enwe afọ ojuju nke ikwu okwu mmechi gị, ebe ọ bụ na a ga-agbara gị àmà mgbe oge ahụ e nyere zuru. Otú ọ dị, n’ozi ubi anyị, idebe oge anaghị abụkebe nsogbu. Ya mere, ka ị na-akwadebe, buru oge i nwere n’uche, ma na-elekwasị anya karịsịa n’izi ihe dị irè.
Okwu Ndụmọdụ Banyere Ọnọdụ Okwu. Nyochaa aro ndị dị na peeji nke 82, họrọkwa nke ga-adị irè n’ozi gị nakwa nke ga-enye gị ohere iji ihe omume e kenyere gị mee ihe n’ụzọ ezi uche dị na ya. Ọ bụrụ na ọ dịtụwo anya i debara aha n’ụlọ akwụkwọ, were nke a dị ka ohere iji tinye mgbalị na iji zụlite nkà ndị ọzọ maka ozi gị.
Ọ bụrụ na ọ bụ onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-ekenye ọnọdụ okwu, nakwere ihe ịma aka ahụ. Ọnọdụ okwu ka ukwuu na-emetụta ịgba àmà. Ọ bụrụ na ị gbatụbeghị àmà n’ọnọdụ ndị ahụ a kọwara, mụta otú e si eme ya site n’iso ndị nkwusa meworo otú ahụ nwee nkwurịta okwu. Ọ bụrụ na o kwe mee, gbalịa itụle isiokwu e kenyere gị n’ọnọdụ okwu yiri nke ị ga-eji mee ihe n’ụlọ akwụkwọ. Nke a ga-enyere gị aka imezu otu nzube dị mkpa e ji enye gị ọzụzụ.
Mgbe A Ga-eme Ihe Omume n’Ụdị Okwu
Ọ bụrụ na ị bụ nwoke, a pụrụ ikenye gị ịgwa ọgbakọ okwu dị mkpirikpi. N’ịkwadebe okwu ndị a, ihe ndị bụ́ isi ndị dị mkpa ka a tụlee yiri ndị ahụ e buworo ụzọ depụta maka okwu onye mmụta ndị dị n’ụdị ihe ngosi. Ọdịiche bụ́ isi a na-enwe bụ ndị a na-agwa okwu na otú e si ekwu ya.
Ọ na-adịkarị mma ịkwadebe ihe omume gị n’ụzọ ga-eme ka onye ọ bụla na-ege ntị rite uru na ya. Ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ ya amaraworị eziokwu Bible ndị bụ́ isi. Ha pụrụ nnọọ ịma isiokwu e kenyeworo gị ikwu okwu na ya nke ọma. Buru n’uche ihe ha mabu ama banyere isiokwu gị. Gbalịa ime ka ha rite uru n’ihe omume gị n’ụzọ ụfọdụ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m pụrụ isi jiri isiokwu m mee ka nghọta mụ na ndị na-ege m ntị nwere banyere Jehova dị ka onye mikwuo emi? Olee ihe dị n’ihe ọmụma a nke ga-enyere anyị aka ịmata uche Chineke? Olee otú ihe ọmụma a ga-esi nyere anyị aka ime ezi mkpebi n’ime ụwa nke ọchịchọ anụ ahụ́ na-achị?’ (Efe. 2:3) Inweta azịza ndị na-eju afọ nye ajụjụ ndị ahụ chọrọ ime nnyocha. Mgbe i ji Bible na-eme ihe, gbalịa ka ọ ghara ịbụ nanị ịgụpụta ihe e dere ka ị na-eme. Tụgharịa uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị i ji na-eme ihe, gosikwa otú ha si bụrụ ihe ndabere maka iji ruo ná nkwubi okwu. (Ọrụ 17:2, 3) Anwala ikwuzu ihe buru ibu gabiga ókè. Mee ihe omume gị n’ụzọ ọ ga-adị mfe icheta.
Nkwadebe kwesịkwara ịgụnye ichebara ihe ị ga-ekwu echiche. Eledala nke a anya. Mụgharịa otú ị ga-esi kwuo okwu gị site n’ikwupụta ya ekwupụta. Mgbalị ị na-etinye n’ịmụ na itinye ndụmọdụ ndị metụtara nkà okwu dị iche iche n’ọrụ ga-atụnye ụtụ dị ukwuu n’ọganihu gị. Ma ị̀ bụ onye ọkà okwu ọhụrụ ma ị̀ bụ onye nweworo ahụmahụ, kwadebe nke ọma ka i wee jiri nkwenye na mmetụta kwesịrị ihe omume gị kwuo okwu. Ka ị na-eme ihe omume nke ọ bụla n’ụlọ akwụkwọ, buru n’uche ebumnobi nke iji onyinye ikwu okwu nke Chineke nyere gị nye Jehova otuto.—Ọma 150:6.