Ụlọ Akwụkwọ nke Na-akwadebe Anyị Maka Ihe Ndị Kasị Mkpa
1 Ndị mmadụ na-aga ụlọ akwụkwọ iji mụta ihe ga-enyere ha aka iru ihe mgbaru ọsọ ha ná ndụ. Otú ọ dị, olee ihe mgbaru ọsọ pụrụ ịdị mkpa karịa ito Onye Na-enye ndụ na inyere ndị ọzọ aka ịmụta nzube ya na ụzọ ya? Ọ dịghị. Ebumnobi nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke bụ ịkwadebe anyị maka ịkụziri ndị ọzọ banyere okwukwe anyị. Ya mere, ka anyị na-aga ụlọ akwụkwọ ahụ kwa izu, anyị na-enweta nkà ndị na-akwadebe anyị maka ọrụ ndị kasị mkpa ná ndụ.
2 E wepụtara “Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2003” ná mbipụta Ozi Alaeze anyị nke ọnwa gara aga. Usoro ihe omume ahụ gụnyere nkọwa zuru ezu nke otú a ga-esi eduzi ụlọ akwụkwọ ahụ. Ị pụrụ ịchọpụta na ọ ga-abụ ihe bara uru itinye usoro ihe omume ahụ n’ime akwụkwọ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke gị, bụ́ nke i kwesịrị iji na-abịa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke kwa izu. Tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị a ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke maka 2003.
3 Nkà Okwu: Malite na January, nzukọ ọ bụla ga-eji okwu mmeghe ga-ewe minit ise banyere otu nkà okwu ma ọ bụ otu akụkụ nke ịgụ ihe, ịmụ ihe, ma ọ bụ izi ihe malite. Ọ bụ onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu okwu mmeghe ndị a, ma ọ bụ ọ pụrụ ikenye okenye ọzọ ruru eru ikwu okwu a. Ọkà okwu ahụ pụrụ ịtụle ihe nkà okwu ahụ pụtara na ihe mere o ji dị mkpa. Mgbe ahụ, ọ pụrụ inyekwu nkọwa site n’ịtụle ihe atụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ na igosi ụzọ isi jiri nkà okwu ahụ mee ihe, na-elekwasị anya karịsịa n’otú ime nke ahụ pụrụ isi mee ka ozi ubi anyị ka mma.
4 Ihe Omume nke 1: A na-adụ ụmụnna ndị e kenyere okwu izi ihe ahụ ọdụ ọzọ ka ha “lekwasị anya n’uru ihe ọmụma ahụ a na-atụle bara.” Nke a pụtara igosi ọgbakọ ụzọ isi jiri ihe ọmụma ahụ mee ihe. Ọ bụrụ na e kenye gị ihe omume a, tụlee peeji nke 48-49 nke akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi iji nweta aro n’ụzọ isi kwadebe ya, mụọkwa ebe ndị e zoro aka na ha bụ́ ndị e gosiri ná ndepụta ntụaka nke akwụkwọ ahụ, n’okpuru isiokwu bụ́ “Nkọwa bara uru.”
5 Usoro Ọgụgụ Bible: Ọ bụrụ na ị naghị agbasochi usoro ọgụgụ Bible kwa izu anya n’oge ndị gara aga, gịnị ma i kpebisie ike ịgbasochi usoro a anya n’afọ a? Ndị mere otú ahụ ga-agụcha Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ná ngwụsị afọ ahụ. A tụlere uru ndị dị n’iji akụkụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst malite usoro ọgụgụ Bible na peeji nke 10, paragraf nke 4, nke akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi.
6 Isi Ihe Ndị Sitere n’Ọgụgụ Bible: E mewo ka akụkụ a buo ibu ruo minit iri iji mee ka ndị na-ege ntị nwee ike ikwu okwu n’ebe ndị e kenyere ka a gụọ n’izu ahụ. Ndị e kenyere ya ekwesịghị ịgafe oge e nyere maka ya. A ga na-eme ya kwa izu, gụnyere izu a ga-enwe ntụleghachi. Ka ị na-agụ isiakwụkwọ ndị ahụ e kenyere, chọọ isi ihe ndị ga-abara gị uru n’ọmụmụ ihe ezinụlọ gị, n’ozi gị, ma ọ bụ n’ụzọ ndụ gị. Àgwà dịgasị aṅaa nke Jehova ka e gosipụtara n’ụzọ o si mesoo ndị mmadụ na mba dị iche iche? Olee ihe ị mụtara nke mere ka okwukwe gị sikwuo ike ma mee ka i nwekwuo ekele n’ebe Jehova nọ? I nweere onwe gị ikwu okwu n’isi ihe ọ bụla dị n’isiakwụkwọ ndị ahụ e kenyere, ọbụna site n’amaokwu ndị a ga-agụ mgbe a na-eme Ihe Omume nke 2, ebe ọ bụ na nwanna ga-agụ ya agaghị ekwu okwu n’amaokwu ndị ahụ.
7 Ihe Omume nke 2: Ihe omume mbụ ọ bụ onye mmụta ga-eme n’izu ọ bụla ga-abụ ịgụ ihe n’ihu ọha. Ihe nile a ga-agụ ga-esite n’ọgụgụ Bible dịịrị izu ahụ e wezụga ihe a ga-agụ n’izu ikpeazụ nke ọnwa ọ bụla. A ga-esi n’Ụlọ Nche were ihe a ga-agụ n’izu ikpeazụ n’ọnwa. Onye mmụta ahụ kwesịrị ịgụ ihe ahụ e kenyere ya n’ekwughị okwu mmeghe ma ọ bụ okwu mmechi. N’ụzọ dị otú a, ọ pụrụ ilekwasị anya n’ụzọ bụ́ isi na nkà ịgụ ihe ya.—1 Tim. 4:13.
8 Ihe Omume nke 3 na nke 4: Ụfọdụ n’ime ihe omume ndị a sitere n’ụzọ ka ukwuu n’akwụkwọ Ihe Ọmụma; ụfọdụ nwere nanị isiokwu. Ndị e kenyere ihe omume ndị ebe ihe omume ha sitere dị ntakịrị ma ọ bụ ndị nwere nanị isiokwu nwere ohere iwulite ihe omume ha site n’ime nnyocha ná mbipụta Ndị Kraịst anyị. Nke a pụrụ ime ka ọ dịtụrụ ụmụnna nwanyị mfe karị ime ka okwu ha kwekọọ n’ọnọdụ nke ndị inyeaka ha.
9 Ọnọdụ Okwu: Dị ka e kwuru na peeji nke 45 nke akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ pụrụ ikenye ọnọdụ okwu. Ọ bụrụ na o kenyeghị ọnọdụ okwu, mgbe ahụ ụmụnna nwanyị pụrụ ịhọrọ ọnọdụ okwu site n’ihe ndepụta dị na peeji nke 82. Ọ bụrụ na nwanna nwanyị na-eme ihe omume otu ugboro n’ime ọnwa abụọ ọ bụla, ọnọdụ okwu 30 ahụ e depụtara ga-ezu iji mee ka a na-enwe ụdị ọnọdụ okwu dịgasị iche iche ruo afọ ise. Ụmụnna nwanyị ndị họọrọ iji nke 30, nke bụ́, “Ọnọdụ okwu ọzọ nke kwesịrị ekwesị n’ógbè unu” eme ihe kwesịrị ide ọnọdụ okwu n’ala ala ma ọ bụ n’azụ mpempe akwụkwọ ihe omume ha (S-89). Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ede akara ụbọchị onye mmụta ahụ kwuru okwu na peeji nke 82 n’akwụkwọ ya, n’akụkụ ọnọdụ okwu o ji mee ihe. Ọ pụrụ ime nke a mgbe ọ na-akanye akara na fọm ndụmọdụ nke onye mmụta ahụ.
10 Fọm Ndụmọdụ: E jikọtara fọm ndụmọdụ gị na akwụkwọ gị. Ọ dị na peeji nke 79-81. Ya mere, ọ ga-adị mkpa ka i nye onye nlekọta ụlọ akwụkwọ akwụkwọ gị mgbe i mechara ihe omume ọ bụla. Ọ ga-adị mkpa ka onye nlekọta ụlọ akwụkwọ nwee ihe ndekọ nke isi ihe ndị a ga-enye ndụmọdụ na ha ndị ndị mmụta na-arụ ọrụ na ha.
11 Ntụleghachi: A ga-eji ọnụ mee ntụleghachi nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. A ga na-eme ya otu ugboro n’ọnwa abụọ ọ bụla, ọ ga-ewekwa minit 30. Ajụjụ ndị a ga-atụle n’oge ntụleghachi ahụ ga-anọgide na-apụta n’Ozi Alaeze Anyị. Ọ bụrụ na izu e mere ndokwa ka e mee ntụleghachi adaba n’izu a ga-enwe mgbakọ sekit ma ọ bụ n’izu onye nlekọta sekit ga-eleta ọgbakọ, mgbe ahụ, e kwesịrị ime ihe omume nke izu na-esonụ n’izu bu ya ụzọ ma mezie ndokwa ime ntụleghachi n’izu na-eso ya.
12 Klas Ndị Ọzọ: N’ọgbakọ ebe e nwere ihe karịrị mmadụ 50 debanyere aha ha n’ụlọ akwụkwọ, ndị okenye pụrụ iche echiche inwe klas ndị ọzọ. “A pụrụ iji ndokwa a mee ihe maka ihe omume nile nke ndị mmụta ma ọ bụ nanị maka abụọ ndị ikpeazụ.” (Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, p. 285) A tụrụ aro nke ikpeazụ ahụ n’ihi ọgbakọ ebe ndị e nwere ọtụtụ ụmụnna nwanyị ma nwee ụmụnna nwoke ole na ole ndị ga-eme ihe omume ịgụ ihe. Ndị okenye kwesịrị ịhọrọ ụmụnna nwoke ruru eru maka iduzi klas ndị a.
13 Onye Ndụmọdụ Inyeaka: Dị ka e kwuru n’usoro ihe omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, òtù ndị okenye kwesịrị ịhọpụta onye ndụmọdụ inyeaka nke ga na-enye ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi bụ́ ndị ga-eme nchịkọta nke isi ihe ndị sitere na Bible na ndị ga-ekwu okwu izi ihe ndụmọdụ nke na-agaghị abụ n’ihu ọha. Nwanna nwoke e kenyere ọrụ ime nke a kwesịrị ịbụ onye nwere ahụmahụ, onye ndị okenye ndị ọzọ ga-eji ndụmọdụ ya kpọrọ ihe. Ndụmọdụ ya kwesịrị ịbụ nke na-ewuli elu, ọ ga na-aja ụmụnna mma maka nkà ikwu okwu na izi ihe dị mma ma na-atụ aro otu isi ihe ma ọ bụ abụọ a ga-emeziwanye. Ọ dịghị mkpa inye nwanna nwoke nke na-ekwu okwu ọtụtụ ugboro ndụmọdụ mgbe o mesịrị ihe omume ọ bụla. Otú ọ dị, nwanna nwoke e kenyere inye ndụmọdụ a kwesịrị iji akọ mee ihe ma ghọta na a pụrụ inyere ọbụna ụmụnna ndị na-ekwu okwu ihu ọha ugbu a aka inwekwu ọganihu.—1 Tim. 4:15.
14 Ihe A Ga-ege Ntị Maka Ha: Gịnị pụrụ inyere onye ndụmọdụ aka n’ịtụle otú e si mee ihe omume? Igbe nke atọ nke dị n’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’isiakwụkwọ 53 dị n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, bụ́ ndị nwere nọmba, nwere ntụle dị mkpirikpi nke ihe ndị a ga-ege ntị maka ha. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ kwesịkwara ịrịba ihe ncheta na aro ndị ọzọ dị n’akwụkwọ ahụ ama, bụ́ ndị ga-enyere ya aka ikpebi ngwa ngwa otú e si hazie ihe omume ahụ n’ụzọ nwere njikọ na otú ụzọ e si mee ya dịruru irè. Dị ka ihe atụ, rịba ama ajụjụ ndị dị n’elu na peeji nke 55 na echiche ndị dị paragraf ikpeazụ na peeji nke 163.
15 Dejupụta Ebe Ndị A Na-edeghị Ihe na Ha: Tụkwasị n’ohere buru ibu ndị dị n’akụkụ peeji ya dị iche iche, akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi nwere ọtụtụ ohere ndị a na-edeghị ihe na ha, ndị e tinyere ka ị na-edenye ihe na ha n’oge ị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye na mgbe ị gara Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. (Lee peeji nke 77, 92, 165, 243, 246, nakwa 250.) Hụ na ị na-eji akwụkwọ gị aga kwa izu. Sonye mgbe a na-ekwu okwu mmeghe. Meghee akwụkwọ gị emeghee n’oge nile ụlọ akwụkwọ ahụ na-aga n’ihu. Rịba ama aro ndị onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ahụ na-atụ. Rịba ama ụzọ izi ihe, ajụjụ, ihe nlereanya, atụmatụ okwu, ihe atụ, ihe ndị a na-ahụ anya, na ihe ndị na-egosi ọdịiche, bụ́ ndị ndị ọkà okwu na-eji eme ihe. Site n’idetu ihe ndị bara uru, ị ga-enwe ike icheta ọtụtụ isi ihe ndị magburu onwe ha ị mụtara n’ụlọ akwụkwọ ahụ ma jiri ha na-eme ihe.
16 Jizọs Kraịst maara na ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke bụ ihe ùgwù kasịnụ mmadụ ọ bụla pụrụ inwe. Ọ bụ ọrụ bụ́ isi e nyere ya. (Mak 1:38) Ọ sịrị: “Aghaghịkwa m ịkpọsara obodo ndị ọzọ ozi ọma banyere alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:43) Dị ka ndị narawooro òkù ahụ ọ kpọrọ iso ya, anyị onwe anyị kwa ga na-arụsi ọrụ ike n’ikwusa ozi ọma ahụ, anyị na-agbalịsikwa ike mgbe nile ime ka “àjà otuto” anyị na-aka mma. (Hib. 13:15) Iji mezuo nke ahụ, ka anyị kpebisie ike ịdị na-ekerechi òkè anya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, bụ́ ụlọ akwụkwọ nke ga-enye aka kwadebe anyị maka ihe ndị kasị mkpa ná ndụ.