Otu Ụlọ Akwụkwọ Na-aga nke Ọma nke Zuru Ụwa Ọnụ
NKE a abụghị ụlọ akwụkwọ na-abụghị nke gọọmenti nke dị oké ọnụ ma ọ bụ mahadum nwere ùgwù nke ọ bụ nanị ole na ole a họọrọ pụrụ ije. Ee e, ụlọ akwụkwọ a na-enye mmụta n’anaghị ụmụ akwụkwọ ya ego. O yikarịrị ka a na-enwe oge ọmụmụ ya n’ebe dị gị nso. A na-akpọ ya Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, a na-eduzikwa ya n’ebe Ndịàmà Jehova na-ezukọ. Ihe dị ka nde mmadụ ise na-aga ụlọ akwụkwọ a n’ụwa nile.
Ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Gịnị bụgasị ihe ndị a chọrọ maka idebanye aha? Gịnị ka a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ ahụ? Olee otú e si eduzi ya? Oleekwa otú ndị mmadụ si erite uru site na ya?’
Ihe Ndị A Chọrọ
Ọ bụ ezie na a na-anabata mmadụ nile ịga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ndị na-edebanye aha ha aghaghị ikwenyere nkụzi nile nke akwụkwọ bụ isi nke ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ́ Bible. A na-achọ n’aka ha ịdị ndụ nke ruru ihe Bible chọrọ n’ụzọ omume. Ya mere ụmụ akwụkwọ apụghị ịdị na-ebi ndụ nke omume rụrụ arụ. Ha apụghị ịbụ ndị ohi, ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ndị na-akwa iko, ndị ji ụtaba eme ihe, na ihe ndị ọzọ.—1 Ndị Kọrint 6:9-11.
Ọtụtụ ụlọ akwụkwọ taa agbahapụwo ụkpụrụ ndị metụtara iyi ákwà, ma a na-atụ anya n’aka ụmụ akwụkwọ ndị e debanyere aha ha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ịbụ ndị ji uwe ndị dị ọcha wee jie ejiji dị mma n’anya. (1 Timoti 2:9, 10) E nweghị afọ ndụ a chọrọ maka ụlọ akwụkwọ a. A na-edebanye aha ụmụaka ndị gbara afọ anọ ma ọ bụ ise ndị pụrụ ịgụ ihe, ha na-emekwa ihe omume mgbe mgbe, dị ka ndị ikom na ndị inyom nọ n’afọ ndị 90 ha si eme.
Nhazi na Ihe Ndị A Na-akụzi
Iji mee ka ịbịa dị mfe, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a na-enwe mgbe nile oge ọmụmụ ihe ahụ nke na-ewe 45 minit nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’uhuruchi etiti izu. Ozugbo okwu nnabata dị mkpirikpi site n’ọnụ onye nduzi ụlọ akwụkwọ ahụ gasịrị, ọkà okwu mbụ n’uhuruchi ahụ na-ekwu okwu na-ewe minit 10 ruo 15 na-adabere n’otu n’ime akwụkwọ ọgụgụ ụlọ akwụkwọ ahụ. Mgbe ahụ, ọtụtụ mgbe ọ na-eduzi ntụleghachi ọnụ nke isiokwu ahụ ọ tụlezuworo, bụ́ nke na-ewe minit atọ ruo ise.
Ọzọ, otu onye nkụzi ruru eru na-atụlezu isi ihe nke ọgụgụ Bible dịịrị izu e kenyere, nke ihe na-emejupụta ya na-abụkarị malite n’isiakwụkwọ abụọ ruo anọ n’ime Bible. A na-enye minit isii maka ntụleghachi a. Ụmụ akwụkwọ ndị na-agụzu ebe e kenyere ka a gụọ n’ụlọ mgbe mgbe ga-agụzu Bible dum ka oge na-aga.
Mgbe isi ihe ndị sitere na Bible gasịrị, a na-enwe ihe omume atọ nke ụmụ akwụkwọ kwadebere, nke ọ bụla n’ime ha adịghịkwa agafe minit ise. Otu bụ ọgụgụ Bible sitere n’ebe ahụ e kenyere ka a gụọ n’ụlọ. Abụọ ndị ọzọ na-adabere n’ihe odide ụlọ akwụkwọ nke a na-agba ụmụ akwụkwọ nile ume ịgụ ná nkwadebe maka klas. Mgbe ihe omume nwa akwụkwọ nke ọ bụla gasịrị, onye nduzi ụlọ akwụkwọ ahụ na-enye ịja mma, ọtụtụ mgbekwa, tụọ aro maka imeziwanye ihe.
Ndụmọdụ onye nduzi ụlọ akwụkwọ ahụ na-adabere n’akwụkwọ bụ́ Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ Ije-ozi Ọchichi-Chineke, bụ́ nke a na-atụ anya n’aka nwa akwụkwọ ọ bụla iji nlezianya mụọ. Iji meziwanye ihe n’otu ọdịdị okwu maka ihe omume ya ọzọ, a pụrụ ịgwa nwa akwụkwọ ahụ ka ọ tụleghachi otu isiokwu site n’akwụkwọ nduzi ahụ, dị ka “Imetuta Ọra na Iji Ihe-odide Me Ihe,” “Ihe-atụ Kwesiri Ekwesi,” “Iji Nkwukwasi na Nmeghari-aru Kwu Okwu,” na “Imesi Echiche-okwu Ike na Nb̧anwe-olu.”
N’ebe ụfọdụ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nwere klas ọzọ nke ịgụ na ide ihe na klas imeziwanye ịgụ ihe. Ọtụtụ iri puku amụtawo ịgụ ihe ma ọ bụ meziwanye ọgụgụ ihe ha na klas ịgụ na ide ihe ndị dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, na Mexico n’agbata 1946 na 1994, e nyeere ihe karịrị 127,000 aka ịmata otú e si agụ na otú e si ede ihe.
Inyere Ọtụtụ Nde Aka
Gburugburu ụwa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-akwado mgbalị ndị mụrụ ụmụ inye ụmụ ha mmụta dị mma. Moriah dị afọ 16 sịrị: “Amụtara m igwupụta ihe ọmụma na ịmụgharị ihe omume m. Ugbu a ihe omume ọ bụla m na-enweta n’ụlọ akwụkwọ dị elu dị mfe.”
Matthew dị afọ 15, onye debanyere aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi mgbe ọ dị afọ asaa, rịbara ama, sị: “Enwere m abamuru dị ukwuu karị ndị ibe m mgbe a bịara n’ime nke ọma n’agụmakwụkwọ. Enwetawo m nkà ịmụ ihe na nke ịṅa ntị na ikike nke ikwu okwu n’ụzọ dị irè.” Nwanne ya nwoke dị afọ 17, bụ́ Phil, gbakwụnyere, sị: “Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke emewo ka m nwee anya ike karị. Amaara m na ọ bụrụ na e nye m ihe omume, m pụrụ ime ya.”
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke akụziworokwa ndị meworo okenye ihe. Michael, onye ruru ihe mgbaru ọsọ ndị dị ka ikwu okwu n’ihu ìgwè ndị ọrụ nlekọta, kọwara, sị: “Ana m asọ ihere gabiga ókè mgbe m sonyere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. Ihere adịghịzi eme m. Ụlọ akwụkwọ ahụ nyere ọnọdụ, ihe ọmụma, nkà, na agbamume onwe onye dị m mkpa iji merie ịsọ ihere m.” Otu nna rịbara ama, sị: “Echere m na mụ enwetawo ohere ịmụta ihe ndị funahụrụ m dị ka onye ntorobịa.”
N’otu obodo nta dị na Latin America, ndị òtù nke Ngalaba Mmụta bịara Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Mgbe ọ ṅasịrị ntị n’okwu otu onye nọ n’ọgbakọ ahụ, otu n’ime ndị ọbịa ahụ, bụ́ onye isi otu ụlọ akwụkwọ dị elu, tiri mkpu, sị: “O kweghị omume na nwoke a nke anyị maara mgbe nile dị ka onye na-agụghị akwụkwọ nwere ike ịkparịta ụka na Spanish [kama ịbụ n’olu asụsụ a mụrụ ya], ma ya fọdụzie ịgwa ndị na-ege ntị okwu, ma ọ na-eme ya.”
N’ezie, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke bụ otu n’ime ụlọ akwụkwọ ndị kasị mma n’ụwa! Ọ pụrụ inyere ma ndị na-eto eto ma ndị meworo agadi aka inweta mmụta dị mma. Dị ka otu onye ntorobịa kwuru, “Ana m atụ aro ka onye ọ bụla na-achọ isonyere ụlọ akwụkwọ ahụ sonye n’egbughị oge.”
[Foto dị na peeji nke 25]
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-enyere ọtụtụ nde aka inweta mmụta dị mma