Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1998
Ịbụ onye e zijere akwụkwọ pụtara ịbụ “onye e ziri ihe ma ọ bụ mụgosi ihe n’otu ihe ọmụma ma ọ bụ nkà kpọmkwem.” Site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, a na-azụ anyị mgbe nile n’ihe ọmụma Chineke. Ọzọ, nkere òkè anyị n’ụlọ akwụkwọ a na-enye anyị ohere ịzụlite nkà ikwu okwu na izi ihe anyị. Usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ maka 1998 ga-enye anyị ohere dị ukwuu inwekwu ọganihu ime mmụọ.
Ka ị na-atụle usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ nke afọ na-abịa, ị ga-ahụ na mgbe ụfọdụ Ihe Omume nke 3 ga-adabere n’akwụkwọ nta bụ́ Isi-Okwu Di Iche Iche nke Bible Maka Nkwurita-Okwu. Ọzọ, e webatawo akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ n’ihe a ga-amụ na 1998, Ihe Omume nke 3 na nke 4 ga-atụlezukwa ya nwayọọ nwayọọ. Mgbe ọ bụla akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ bụ ebe ndabere maka Ihe Omume nke 4, nwanna nwoke kwesịrị ime ya dị ka okwu a ga-agwa ọgbakọ. Ọzọ, dị ka ihe ncheta, ọ dịghị onye so n’usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ ahụ kwesịrị ịgabiga oge.
Ihe Ọhụrụ: Maka abamuru onwe anyị, e setịpụrụ “Usoro Ọgụgụ Bible Ntụkwasị” n’ime braketị ozugbo e depụtasịrị nọmba abụ maka izu ọ bụla. Ọ bụ ezie na ọ dịghị akụkụ usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ kwa izu ga-adabere na ya, mee ya nzube gị ịgbaso ya. Nke a ga-enyere gị aka ịzụlite àgwà nke ịgụ Bible kwa ụbọchị ma ọ bụrụ na ị malitebeghịrịị ime otú ahụ.
Iji nwetakwuo ihe ọmụma maka ihe omume, ndụmọdụ, na ntụleghachi odide, biko gụọ nke ọma ntụziaka a na-ahụ ‘n’Usoro Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1998,’ nakwa na peji nke 3 nke Ozi Alaeze Anyị nke October 1996.
Ọ bụrụ na i debanyebeghị aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, anyị na-akpọ gị òkù ka i debanye aha ugbu a. Ụlọ akwụkwọ a pụrụ iche na-anọgide na-ekere òkè dị mkpa n’ịzụ ndị ohu dị obi umeala, ndị rarakwaara onwe ha nye Jehova ịghọ ndị ruru eru karị dị ka ndị ọzọ.—1 Tim. 4:13-16.