Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2000
1 Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke abụrụwo nnukwu ngọzi nye ndị Jehova. Eri afọ 50 gara aga, o nyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka ịzulite ikike ha nwere dị ka ndị ọkà okwu n’ihu ọha na ndị nkụzi nke eziokwu Bible. (Abụ Ọma 145:10-12; Mat. 28:19, 20) Ị̀ pụrụ ịhụ otú ụlọ akwụkwọ ahụ siworo nyere gị aka? Ọ pụrụ ịnọgide na-eme otú ahụ n’afọ 2000 ma ọ bụrụ na i kere òkè na ya n’ụzọ zuru ezu ma tinye ndụmọdụ a na-enye n’ọrụ.
2 E depụtara ntụziaka banyere ihe omume na akwụkwọ ndị a ga-eji mee ihe na peji nke mbụ n’usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ maka 2000. A tụlere ogologo oge e nyere maka ihe omume nke ọ bụla, ebe ihe omume si, otú a pụrụ isi mee ihe omume, na ihe ọmụma ndị ọzọ. Biko wepụta oge jiri nlezianya gụọ ntụziaka ahụ, tinyekwa ha n’ọrụ.
3 Ọgụgụ Bible Kwa Izu: E nwere usoro abụọ dịgasị iche maka ịgụ Bible kwa izu n’usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ ahụ. Otu bụ usoro nlereanya maka ịgụ ihe, bụ́ nke gụnyere ịgụ ihe dị ka peji Bible ise. Isi ihe ndị sitere n’ọgụgu Bible dabeere na nke a. Usoro ọgụgụ ihe nke ọzọ bụ nke ntụkwasị, bụ́ nke na-agụnye ịgụ okpukpu abụọ nke ọgụgụ ihe nke mbu ahụ. Site n’ịgbaso usoro a, ị ga-enwe ike ịgụcha Bible dum n’afọ atọ. Anyị maara na ụfọdụ ndị pụrụ ịchọ ịdị na-agụ ihe karịrị ihe e mere ndokwa ya n’usoro ọgụgụ ihe ntụkwasị ahụ, ndị ọzọ nwekwara ike ghara ịdị na-agụzu ya. Kama iji onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ, nwee ọṅụ n’ihe ị pụrụ ime. (Gal. 6:4) Ihe dị mkpa bụ ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị.—Abụ Ọma 1:1-3.
4 Iji denye aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, i kwesịrị iso onye nlekọta ụlọ akwụkwọ kwurịta okwu. Biko jiri ihe omume gị kpọrọ ihe, ahapụkwala ime ya n’ihi ihe ndị na-enweghị isi. Jiri ụlọ akwụkwọ ahụ kpọrọ ihe dị ka ndokwa sitere n’aka Jehova. Kwadebe nke ọma, mụọ ihe omume ahụ nke ọma, kwuokwa okwu site n’obi gị, si otú a na-erite uru zuru ezu n’ụlọ akwụkwọ a pụrụ iche.